Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa: Kraịst Nà Abịa!Ihe Nhụchatụ

Advent: Christ Is Coming!

ỤBỌCHỊ 1 NKE 91

Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa bụ ihe mmemme izu anọ nke nchéré eji atumanya eme gburugburu ụwa. Ọ bụ oge iji kwadebe obi anyị maka ịhụ Onye-Nzọpụta anyị, Mezaya ahụ e burù n'amụma. Ọ bụ oge anyị ji eme ntụgharị uche na ịkụziri ụmụ anyị banyere ọmụmụ Jizọs sité na ahụ nwa agbọghọ n'amaghị nwoke, ndụ Ya, ọnwụ Ya, na mbilite n'ọnwụ Ya. Ka oge a dọghachi obi anyị ná ntụgharị-uche ihe e meworò na duru anyị gaa n'ihu ná mbanye n'ime afọ ọhụrụ nke atumanya na ịdị njikere maka ọbịbịa Ya ọzọ dị ebube!

MUNYE KANDUL

Anyị na-echere Mezaya ahụ!
Kọwaara ezinụlọ gị gbasara Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa ma mepụta ohere kwa ụbọchị ịdị n'eme nke a. Weta otu kandul toro nnọọ ogologo wee kaa ya akarà iri abụọ na ise na ahụ ya, dee nọmba otu ruo iri abụọ na ise (were ihe odide na-apụghị ihicha ehicha mee nke a) n'akụkụ akarà ọ bụla i merè. Mụnye kandụl a kwa mgbede kà ịna agụ Okwu Chineke n'onwe gị ma ọ bụ gị na ezinụlọ gị, ma kwee ka o nwuo rú akarà ọbụla kwa abalị.

GỤỌ AKWỤKWỌ NSỌ

Ọgbụgba Ndụ Dị N'etiti Chineke Na Ihe O Kerè Ekè Na Mmadụ
Jenesis 1: 27-28, 2: 16-17 na Jeremaya 33: 19-22

ZAGHACHI NA ÒFÙFÈ

Jìrí Ndụ Gị Fee Òfùfè
Ọ̀ dịghị mgbe Chineke n'adịghị edobe ma n'emezu nkwa gasị O kwerè na ọgbụgba ndụ ndị O merè. Okwu Ya na-adịgide adịgide. Ị̀ tụkwasịrị Ya obi?
Gee ntị na lezie anya n'okwu ndị si gị n'onu apụta. Ị̀ nà edebe nkwa ndị ị kwerè?
Ị̀ nà-ekwu ihe ịma na iga-eme na ịgà-emezù ihe si gị n'ọnụ pụta?

Jìrí Ekpere Fee Òfùfè
Jìrí Okwu Chineke nye nsọpụrụ, kwupụta ịdị nma, too, na kelee Chineke.

Jìrí Abụ Fee Òfùfè
Bụọ Abụ A, "Ihe Niile Nke E Kerè Ekè Nke Chi Anyị Na Eze Anyị."

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Advent: Christ Is Coming!

Ihe òfùfè a nke amụma-ọkwa-ọbịbịa siteré na Thistlebend Ministries bụ̀ maka ezinụlọ ma ọ bụ ndị mmadụ gasị iji kwadebe obi anyị ime ememe Mezaya. E nyerè ihe ọbịbịa Kraịst pụtarà nye ndụ anyị ụbọchị taa nrutu-aka pụrụ iche. Ezuberè ka ebido ịgụ ya na Disemba 1. Ka ezinụlọ gị mee na nwee ihe ncheta-gasị na-adịgide adịgide ka ị n'eji ihe ntụziaka a ịhụ ịhụnanya ọgbụgba-ndụ nke Nna gị kwụ chịm maka onye ọbụla n’ime unu.

More

Anyị ga-achọ ịkele ndị Thistlebend Ministries maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.thistlebendministries.org