Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa: Kraịst Nà Abịa!Ihe Nhụchatụ

Advent: Christ Is Coming!

ỤBỌCHỊ 6 NKE 91

MUNYE KANDUL

Anyị na-echere Mezaya ahụ!
Kedụ ka ị si kwere na Chineke wee rubeere Ya isi ụnyaahụ?

GỤỌ AKWỤKWỌ NSỌ

Ọgbụgba Ndụ Chineke Na Ebraham Gụnyerè Nkwa Ndị Eze
Jenesis 17:1-8

ZAGHACHI NA ÒFÙFÈ

Jìrí Ndụ Gị Fee Òfùfè
Chineke kwụrụ na ndị eze ga-esi na Ebraham pụta.
Ị̀ nwerè ike ịkpọ aha otu n'ime ndị eze Izrel?
Ị̀ mà onye a na-akpọ Eze Ndị Eze Niile? Ị̀ werela ndụ gị nyefee n'aka Eze Jizọs?

Jìrí Ekpere Fee Òfùfè
Jìrí Okwu Chineke nye nsọpụrụ, kwupụta ịdị nma, too, na kelee Chineke.

Jìrí Abụ Fee Òfùfè
Bụọ Abụ A, "Geenụ Ntị! Ndị Mmụọ Ozi N'ekwúsà Ozi N'agụ Egwú."

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Advent: Christ Is Coming!

Ihe òfùfè a nke amụma-ọkwa-ọbịbịa siteré na Thistlebend Ministries bụ̀ maka ezinụlọ ma ọ bụ ndị mmadụ gasị iji kwadebe obi anyị ime ememe Mezaya. E nyerè ihe ọbịbịa Kraịst pụtarà nye ndụ anyị ụbọchị taa nrutu-aka pụrụ iche. Ezuberè ka ebido ịgụ ya na Disemba 1. Ka ezinụlọ gị mee na nwee ihe ncheta-gasị na-adịgide adịgide ka ị n'eji ihe ntụziaka a ịhụ ịhụnanya ọgbụgba-ndụ nke Nna gị kwụ chịm maka onye ọbụla n’ime unu.

More

Anyị ga-achọ ịkele ndị Thistlebend Ministries maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.thistlebendministries.org