Igba Mbọ Nsọ: Nabata Ndụ Nke Ịrụsi Ọrụ Ike, Na Izukwà Ike Ka Ị KwesịrịIhe Nhụchatụ

Izu ike nà-esiri m ike n'ihi na ka m dị bụ̀ ịrụsi ọrụ ike na ịgba mbọ. Mụ na adịghị-ike m gasị ebikọọlá ọtụtụ oge nke nà aghọtarà m na, n'ime ime obi m, ọ bụrụ na m adịghị arụ ọrụ, ọ nà-adị m ka m n'áda àda na ndụ. Na ọ bụrụ na m n'áda àda na ndụ, yabụ́ na abaghị m uru. Mana n'otu ụzọ ahụ anyị si ejere Chineke ozi site n'ọrụ anyị, ka anyị sikwà enye Ya nsọpụrụ site na izu ike anyị.
Ọ dị mkpa ka anyị jiri ya nwaayọ, wepụta oge gụọ Okwu Chineke, na dị jụụ ka anyị wee nụ olu Chineke ka anyị wee dịkwuo nkwadebe ịrụ ọrụ Ọ nà-akpọ anyị ka anyị rụọ. Mgbe m chọrọ ịrụ ọrụ site na mbido izu ruo na ọgwụgwụ ya, ọ bụghị naanị na ike na-agwụ́sisí m, m túpù uche n'ebe ezinụlọ m nọ, adịghị m elekọta ahụ-ike m, kama ọ bụkwa na m n'ebido n'eme mkpebi ọsịịsọ daberé na ka m si kwadoo ihe m chọrọ ime na ebumnuche m gasị kama ige ntị ná nduzi Chineke dị nrọ̀.
Charles Swindoll derè sì, “Ọ dịghị mgbe Chineke si anyị chee nrụgide na nsogbu gasị nke ndụ ihu n'onwe anyị ma ọ bụ site n'idaberè n'ike nke onwe anyị. Ọ dịghịkwanu mgbe Ọ si anyị nàtá ihu ọma Ya site n'igwakọtá ọrụ ọma gasị n'akpali mmasị wee debe ha n'ihu Ya. Kama, Ọ nà-akpọ anyị òkù ka anyị bịa baa n'ime izu ike Ya.”
Chineke rụrụ ọrụ wee kpọọ ya ihe mma, ma Ya ezuo ike wee kpọọ ya ihe dị nsọ.
Ana akpọ anyị òkù ka anyị bịa soro Ya n'ime izu ike ahụ, n'ihi na n'ime oge ndị ahu ka anyị nà-atọgbọ ibu arọ anyị gasị, anyị na Ya anọkọọ, ma mee ihe O kerè anyị ka anyị mee iji weghachite mkpụrụ obi anyị maka ụbọchị ndị na-abịa abịa.
Izu ike, nye m, n'adịbú m ka ịnọ ọdụ n'oche úkwú wee n'ata ihe ọtitá ka m n'èkiri tv ka onye n'enweghị uche. Echèbù m na izu ike ahụ kwesịịrị m, na “emeghị ihe ọbụla” bụ ụzọ m kwesịrị isi zuo ike. Mana ọ nà-adị m ka ike ọ gwụrụ m karịa, onwe m ana asọ m oyi n'ihi shugà niile m racharà, ma ume ime ihe ọbụla efepụ n'ahụ m kpamkpam.
Ị̀ chọrọ ka m gwa gị ihe ga ekopụ́ gị ụbụrụ? Izu ike dị iche nye onye ọbụla. Enwerè m ndị enyi ndị ume na ike ha nà-alaghachitá site n'ogologo ọsọ ha n'agba n'ụtụtụ oge ha nọ naanị ha, ha na uche ha, ekpere ha, na ala ha n'azọ ụkwụ ka ha n'agba ọsọ. Enwerè m ndị enyi ndị ọzọ n'eweghachite ume na ike ha site n'ikpokọta ndị mmadụ n'ụlọ ha maka oriri na mkparịta-ụka dị mma. Ma ị pụrụ ịchọpụta na izu ike kachasị dị gị mma bụ ịgụ akwụkwọ, isè ihe, ịkpọ egwú, ma ọ bụ ịlelè na imezi nwa ihe ubi.
Chineke kerè anyị jiri nnukwute nlezianya nke nà ekwesịghị inwe ihe iju anya na izu ike anyị pụrụ ịdị ọpụrụiche dịka ọrụ anyị n'arụ.
* * *
Ọ bụrụ na ọ tọrọ gị ụtọ ịgụ ihe òfùfè ndị sitere na Ịgba Mbọ Dị Nsọ: Inakweré Ndụ Nke Ịrụsi Ọrụ Ike, Izu Ike Ka Ị Kwesịrị nke Crystal Stine derè, ma gị achọọ ịchọpụtakwụ ihe banyere ịchụso nzube Chineke maka ndụ gị, gaa na https://amzn.to/2I3ow1d.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nha zuru ezù. Bụ̀ ihe n'agụ́si anyị agụụ ike maka ndụ anyị ka anyị na-anụ mkpú gasị nke "rusie ọrụ ike!" n'otu ntị, na "zùtúkwuó ike" na ntị nke ọzọ. Gịnị ka ọ gà-apụta ma ọ bụrụ na atụmatụ Chineke maka anyị abụghị naanị otu ụzọ ma ọ bụ nke ọzọ? Ebe a ka ịgba mbọ nsọ na-abata—ụzọ obibi ndị nke irusi ọrụ ike na izu ike n'ụzọ gasị n'enye Chineke otuto.
More