Igba Mbọ Nsọ: Nabata Ndụ Nke Ịrụsi Ọrụ Ike, Na Izukwà Ike Ka Ị KwesịrịIhe Nhụchatụ

N'ụlọ anyị, ịgba mbọ abụghị okwu n'atụ ụjọ. Ọ bụ̀ ihe m n'eme.
Mgbe anyị n'ele anya na kà akwụkwọ nkọwa-okwu sirì kọwaa ịgba mbọ, ihe niile ọ pụtara bụ "ịrụ ọrụ ọsọ ọsọ ma ọ bụ jirí ike n'arụ ọrụ." Ọ̀ bụ̀ nke a adịghị echetara gị maka Ndị Kọlọsi 3:23? "Ihe ọbụla unu nà-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ̀ Onye-nwe-anyị ka unu nà-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu nà-arụrụ ya mmadụ." (NIV). Mgbe obi m n'ama m ikpe maka irụsi ọrụ ike ma mụ ana agbali iso usoro nke izu ike na nlekọta-mkpụrụ-obi juru ebe niile ugbu a, ana m ahụ onwe m ka mụ na ume ngwu n'èkwé aka. Mgbe m n'èché ihu n'akụkụ nke ọzọ wee n'arụ ọrụ akwụsịghị akwụsị, na-agbaso ka ndị ụwa siri kọwaa ịgba mbọ, ana m ahụ onwe m n'ébí ndụ ka m n'alụ ogu ma ezigbote ike ana agwụ m.
Ụzọ ọbụla m cheré ihu, ọñụ n'efunahú m.
Anyị n'efe Chineke n'ejighị ihe ọbụla kee eluigwe na ụwa dum n'ime ụbọchị isii. Chineke gosirí anyị ụzọ esi arụ ọrụ—ịrụsi ọrụ ike jiri nkà na ume ma mechaa zuo ike. Dịka m kperè ekpere banyere usoro ọrụ a na kà apụrụ isi ji ya wee mee ihe n'igba mbọ nke ụbọchị ugbu a, Chineke ekpùghewó ụfọdụ ihe:
- Ịgba mbọ abụghị ihe dị njọ mgbe anyị n'arụsi ọrụ ike maka ihe n'eto Chineke ma n'eje ozi maka alaeze Ya.
- Akwụkwọ Nsọ n'ènyé ọmụmaatụ gasị nke ngọzi sitere n'ịrụsi ọrụ ike.
- Anyị apụghị ibi ndụ anyị niile n'arụsi ọrụ ike dịka ụbọchị isii eji kee ihe niile dị n'ụwa ma gbahapụ́ ụbọchị nke asaa.
Ịgba mbọ ekwesịghị ịbụ ịna ákwà onwe anyị aka ka anyị nọrọ n'ihu oge niile, izọgbùsì ndị anyị na ha n'arụkọ ọrụ, ma ọ bụ icha onwe anyị ọkụ ka ana ahụ naanị ihe anyị nà-arụpụta hapụ nke ndị ọzọ. Ịgba mbọ nsọ bụ̀ ịrụsi ọrụ ike n'ụzọ Ndị Kọlọsi 3:23 n'agwa anyị ka anyị mee, n'ebi ndụ n'uju ebe Chineke deberè anyị ma n'achọpụta mweghachitá ịdị mma nke mkpụrụ-obi nke ezi nha ịrụ ọrụ na izu ike n'enye.
Ụbọchị taa, wepụta oge kpee ekpere banyere nha ugbu a nke arụm ọrụ gị na izu ike gị. Rịọ Chineke ka O kpughee ebe niile n'adịghị nkwekọ na atụmatụ Ya maka ndụ gị, ebe gasị ịnà arụfè ọrụ ma n'ezu ike obere, ma ọ bụ ebe gasị ịna ezu nnukwu ike ma n'arụ ọrụ obere. Wepụta oge detuo ihe mgbaru-ọsọ gị niile n'akwụkwọ, ihe niile i chọrọ imezù elee anya afọ n'abịa, wee jiri nwayọọ nyefee Chineke ihe ndị ahụ niile.
Kagbuo ihe ọbụla O n'etinye gị n'obi ka i wepụ ma tinye ihe ọhụrụ ọbụla Ọ si gị gbakwunye. Rịọ Chineke ka O gosi gị ka ịgà esi wee bulie aha Ya nnukwute elu site n'ọrụ gị na ihe ndị ahụ ịchọrọ ime, ma rịọ mgbaghara Ya maka oge gasị mgbe anyaukwu, akpịrị kà a mara gị ama, na obi asọmpi megide mmadụ ibe gị, kpàlirì gị ime ihe.
* * *
E wepụtarà ihe òfùfè ndị a site na Ịgba Mbọ Nsọ: Inakwere Ndụ Nke Ịrụsi Ọrụ Ike, Na Izukwà Ike Ka Ị Kwesịrị nke Crystal Stine derè. Iji mụtakwuo ka ịgà esi arụ ọrụ n'enweghị ihere ma zuo ike lepụ́ amamikpe anya, gaa na https://amzn.to/2I3ow1d.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nha zuru ezù. Bụ̀ ihe n'agụ́si anyị agụụ ike maka ndụ anyị ka anyị na-anụ mkpú gasị nke "rusie ọrụ ike!" n'otu ntị, na "zùtúkwuó ike" na ntị nke ọzọ. Gịnị ka ọ gà-apụta ma ọ bụrụ na atụmatụ Chineke maka anyị abụghị naanị otu ụzọ ma ọ bụ nke ọzọ? Ebe a ka ịgba mbọ nsọ na-abata—ụzọ obibi ndị nke irusi ọrụ ike na izu ike n'ụzọ gasị n'enye Chineke otuto.
More