Igba Mbọ Nsọ: Nabata Ndụ Nke Ịrụsi Ọrụ Ike, Na Izukwà Ike Ka Ị KwesịrịIhe Nhụchatụ

E nwerè ihe ndị ana akpọ Legos jupụtara n'ụlọ anyị. Anyị maliterè kpokotawa ha n'otu Ekeresimesi afọ gara aga, na ugbu a enwerè igbe kwa igbe nke ihe ndị a agba ha dị iche iche. Ka nwa m nwaanyị n'àkpụ́ ihe ọ nà-akpụ́, ọ n'eji mpempe Legos ndị buru ibu bú ụzọ. Ha bụ̀ ndị eji eme mgbọrọgwụ, ndị èjím ha na uru ha kachasị mpempe na ibéribé legos ndị ọzọ, ndị dịkwa mkpa ma dịkwa uru ka esi mee ha.
Ọtụtụ mgbe ana m achọ ịdị ka legos ndị ukwu ahụ, ndị mkpa ha bụ nke ahụrụ anya, a pụrụ iji mee nnukwute ihe gasị. Mana adịghị ahụkarị legos ndị ahụ buru ibu ma ọ bụ mkpa ha dị́ ogo ozugbo arụcharà ihe ana arụ, dịka ịga echè. Ka m nà-atụtụgá ịnyịnya, mpempe mmadụ, anụmanụ, na snò gasị eji legos mee, aghọtarà m na mgbe ụfọdụ, ọ bụ̀ mpempe na ibéribé legos ndị ahụ eleferè anya n'eme ka ezigbo mma nke ihe a rụrụ pụta ìhè.
Mpempe na ibéribé legos gasị ahụrụ ka uru ha ọ dị obere ka ejirì wee rụọ mpio gasị mara mma.
Legos ndị ahụ dị oké ntakịrị ma n'achake achake ka ejirì wee chọọ elu ụlọ na elu tebụl gasị mma.
Ana ejikwa ha achọ imi nwoke snò ahụ mma, ma jiri ha mezuo ngwa eji egwùritá egwú na snò.
Ọtụtụ mgbe, a bụ̀ m legos ntakịrị ahụ n'arụ nwa ọrụ nkwado, n'enye aka ka m si nwee ike. Onye ahụ dị jụụ n'adịghị eme mkpọtụ ndị mmadụ jí ọnụ ha eje ije adịghị ekwe ka anya hụ. Onye ahụ n'eche na a pụrụ idochi ya mgbe ọbụla a chọrọ, n'adịghị mkpa maka mmezù ọrụ eji n'aka—dị́ mma inwe na idobe n'akụkụ, ma a dịghị mkpa “inwerírí.” Mana leenụ ka Chineke si dị oké mmesapụ-aka na O kerè ahụ nke Kraịst kà ma ndị dị ukwuu na ndị dị ntakịrị nwee ọrụ mara mma na zuo okè nke naanị ha pụrụ ịrụ–n'agbanyeghị ka ha si dị oké mkpa ma ọ bụ̀ bụrụ ndị ana ahụtaghị uru ha pụrụ inye.
Ọ̀ dị̀ gị ka ị̀bụ̀ mpempe na ibéribé legos ndị ahụ, elepụrụ anya? Obi gị ọ kà n'eme gị na ihe dị nkịtị na yie ka ihe abaghị uru apụghị iso rụọra Chineke ọrụ dị nsọ maka alaeze Ya gazuo ụwa? Ịnà enwe obi abụọ banyere ịnọ ebe Chineke kpọrọ gị ka ị rụọ ọrụ n'ihi na ọ n'adị gị ka ọrụ enyerè gị adịghị mma ka isi chọọ?
Ọnịnọ gị ebe ahụ na ihe a kpọrọ gị ka imee dị ezigbo mkpa. Ma ị̀bụ̀ akụkụ nke a kachasị ahụ anya (n'ényeré ndị mmadụ aka ikwugidesi ma dị ike!) ma ọ bụ akụkụ nke dị mpempe na ibéribé (n'egbuke egbuke ma n'acha ọma ọma!), anyị n'eweteré Chineke otuto mgbe anyị n'ejikọ ọnụ maka alaeze Ya. Apụghị iwepụ ma ọ bụ dochie gị, akwadorò gị ofuma maka ọrụ e kenyerè gị, ma gị adị ezigbote oké mkpa maka ọrụ Chineke tụrụ ka ị rụọ. N'ime Kraịst, anyị pụrụ ịrụ ọrụ na mee karịa ka anyị pụrụ ichetù n'echiche.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nha zuru ezù. Bụ̀ ihe n'agụ́si anyị agụụ ike maka ndụ anyị ka anyị na-anụ mkpú gasị nke "rusie ọrụ ike!" n'otu ntị, na "zùtúkwuó ike" na ntị nke ọzọ. Gịnị ka ọ gà-apụta ma ọ bụrụ na atụmatụ Chineke maka anyị abụghị naanị otu ụzọ ma ọ bụ nke ọzọ? Ebe a ka ịgba mbọ nsọ na-abata—ụzọ obibi ndị nke irusi ọrụ ike na izu ike n'ụzọ gasị n'enye Chineke otuto.
More