Igba Mbọ Nsọ: Nabata Ndụ Nke Ịrụsi Ọrụ Ike, Na Izukwà Ike Ka Ị KwesịrịIhe Nhụchatụ

Ọ̀ dịtụlá mgbe i cherè n'ime obi gị ma ịnà èmé ihe ziri ezi? Mà ọ̀ bụ̀ ị̀nọ̀ n'ezie ebe Chineke chọrọ ka ị nọrọ? Mà ọ̀ bụ̀ na ọdị ihe ka ukwuu mà ọ̀ bụ̀ dị iche mà ọ̀ bụ̀ ka mma dị ebe ọzọ na mpụga maka gị? Mà ọ̀ bụ̀ gị ana eche na ihe o rìrì gị iza òkù Chineke ò rurù oge gasị ọ dị gị ka ọ dị ihe na efunahụ gị.
Ọtụtụ oge na ndụ n'adị anyị ka anyị nọ n'ime ọnụ-ụlọ ebe ọkụ niile nyụcharà ma anyị ana adaghari n'achọ ebe anyị gà-akpa aka ka ọkụ bịa, ma ọ bụ nwété kandul, ma ọ bụ nwa obere tọrchị ka anyị nwe ike hụ ebe anyị na-azọ ụkwụ. N'oge ndị ahụ, tụkwasị Chineke obi. Jigidesie aka Ya O setịpụrụ aka ma kwe na Ọ gà-edufe gị jeje gaa n'ụzọ nke ọzọ Ọ kwadeberè ka isi na ya gafee. Ọchịchịrị ekwesịghị ịbụ ihe anyị na-atụ ụjọ mgbe anyị na Ìhè Nke Ụwa pụrụ ijekọ́ ije.
Mana ajụjụ gasị ndị ahụ ịna ajụ onwe gị adịghị njọ. Egwù na nchegbu gị gasị ekwesịghị ime gị ihere. Ọ bụrụ na anyị niile gà-anọkọ wee kọọ akụkọ gbasara ọrụ anyị n'arụ, ihe ndị n'anụ anyị ọkụ n'obi, na okwukwe anyị, ọ gà-atụ m ezigbo anya ma ọ dịrị otu onye n'ime anyị si na ndụ ya pụtara kpọmkwem ka o si tụọ. Gịnị ka ịgà agwa enyi gị nọ na nnọkọ ahụ bụ́ onye nwere ụdị ajụjụ ndị ahụ? Ị̀gà àgwá ya na ihe o kwuru na chee bụ eziokwu, ka ọ kwakọrọ kwụsị ihe ndị niile ọ n'eme wee chuso ebumnobi nke ya?
Ana m atụ anya na ị gaghị ekwu ụdị okwu ahụ.
Anyị gà-ahụ enyi gị ahụ n'anya wee kpeere ya ekpere. Anyị gà-agba ya ume ma chọọ ụzọ gasị iji gwa ya na ọrụ ọ n'arụ dị mma, dị uru, ma dị ùgwù, na ọ bụrụ na ọ ma n'ime mmụọ ya na ọ bụ̀ ebe ọ nọ, na ọrụ ọ n'arụ, ka Chineke chọrọ ka ọ nọrọ na rụọ n'oge a, ọ dịghị njehie dị na ya.
Aga m agwa gị ka m si kwesie ike na Chineke nọ n'ọrụ nke iwèrè ihe dị ala wee mee ka ọ dị nsọ, nakwa na nrubeisi (abụghị nha, ọhaneze ịma onye ahụ, ma ọbụ ịkụ aka nke ndị mmadụ) bụ̀ ya bụ ihe bụ́ isi na mmetụta-ike anyị n'eme site n'ọrụ anyị n'arụ maka alaeze Chineke.
Chineke dị ikwesị ntụkwasị obi n'ihe niile Ọ n'eme. Ebe ị nọ, ihe ị n'eme, na ndị mmadụ dị gị n'ihu kpọmkwem ndị Chineke si gị jee ozi maka ha, abụghị ọrụ ana akpachaghị anya kenyere gị. Ihe ịma aka gasị, ndakpo olileanya gasị, na ọdịda gasị i cherè ihu abụghị ihe ndị n'ekwesịghị ịbịara gị.
Chineke gà-eji akụkụ ọbụla nke akụkọ ndụ anyị gosipụta ìhè nke ebube Ya.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nha zuru ezù. Bụ̀ ihe n'agụ́si anyị agụụ ike maka ndụ anyị ka anyị na-anụ mkpú gasị nke "rusie ọrụ ike!" n'otu ntị, na "zùtúkwuó ike" na ntị nke ọzọ. Gịnị ka ọ gà-apụta ma ọ bụrụ na atụmatụ Chineke maka anyị abụghị naanị otu ụzọ ma ọ bụ nke ọzọ? Ebe a ka ịgba mbọ nsọ na-abata—ụzọ obibi ndị nke irusi ọrụ ike na izu ike n'ụzọ gasị n'enye Chineke otuto.
More