Igba Mbọ Nsọ: Nabata Ndụ Nke Ịrụsi Ọrụ Ike, Na Izukwà Ike Ka Ị KwesịrịIhe Nhụchatụ

Esi m n'ogologo agbụrụ ụmụ nwaanyị n'arụ ọrụ, ma site n'iru ọrụ m hụrụ n'anya, ana m ekpe ekpere na nwa m nwaanyị gà-amụta ichuso nrọ ya gasị, rusie ọrụ ike, ma rubere Chineke isi, mgbe ọbụla Ọ kpọrọ ya. Ọ bụ ekpere m na ọ gà-amụta n'aka m na nrusi ọrụ ike dí nsọ pụtara imakù ọrụ enyerè anyị, na ịchọta uru anyị bụ̀ ka mmadụ n'ime Onye kere anyị ka anyị rụọ yabụ ọrụ. Ọrụ anyị nwerè uru ma ihe anyị n'eme iji jeere Chineke ozi, ndị agbata obi anyị, na ezinụlọ anyị gasị dị mkpa—mana nke ahụ abụghị ihe na-akọwa ndị anyị bụ̀.
Akwụkwọ Nsọ nwerè ọtụtụ ihe ikwu banyere uru dị n'ọrụ:
Pọl degaarà Ndị Efesọs akwụkwọ jiri ncheta na Chineke akwadebela ọrụ ọma gasị maka ụmụ Ya ma è kerè anyị ka anyị rụọ ha (Ndị Efesọs 2:10).
Na akwụkwọ ozi ndị ọzọ Pọl derè, ọ gbarà Ndị Kọrịnt ume ka ha kwugidesie ike, n'eji ogo kasị ịdị mma arụ ọrụ, mara na ọrụ ọbụla arụụrà Chineke abụghị ihe efu (1 Ndị Kọrịnt 15:58).
Nwaanyị Akwụkwọ Ilu Isi Nke 31 jìrì aka ya abụọ rụọ ọrụ; gote na ree ala site n'ego ọ kpatara; kepụta ihe; kụọ ihe; jikwaa ihe (Ilu 31:10-31).
Debora rụrụ ọrụ ka onye ikpe wee bụrụ ọchị agha (Ndị Ikpe 4-5).
Tụlee echiche gị gasị, nke ọma na nke ọjọọ, banyere ọrụ gị. Gịnị ka ihe n'aga n'ime uche gị nà-agwa gị banyere ọrụ gasị i n'arụ kwa ụbọchị? Ọ̀ dị̀ gị ka ọrụ gị nwerè uru, ma ọ bụ ịna ahụ ya ka “ọ dịghị oké uru” nye ọrụ gasị, ihe ndị ekenyerè ka emee, na ọnọdụ ọrụ gasị nke ndị ọzọ? Ọ̀ nà-adị gị ka ịna egbu oge n'ele anya zii n'ihuenyo kọmputa mana ọ dị ihe dị mkpa ezinụlọ gị chọrọ ka i meere ha, ma ọ bụ ịna enwe nchegbu na ịna efunahụ oge gị na ezinụlọ kwesịrị iji nọkọọ? Ị̀, ikwu eziokwu gburugburu, n'ènwé mmetụta dị mma, njọ, ikpe ọmụma, ma ọ bụ nke ọ̀ gbasaghị gị, banyere ọrụ ịna arụ?
Ọrụ anyị n'arụ nwerè uru mgbe anyị n'eme ya jiri obi ọṅụ na iji wèteré Chineke otuto. Mgbe Chineke kpọrọ anyị ka anyị rụọ ọrụ, ihe ọbụla ọ bụ, ebe ọbụla ọbụ na ihe ọbụla o yirì ka, ọ bụ̀ n'ihi na ọ bụ akụkụ nke atụmatụ Ya maka anyị, akụkụ otú O si kee anyị ka anyị jeere Ya ozi na hụ ndị agbata obi anyị n'anya.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nha zuru ezù. Bụ̀ ihe n'agụ́si anyị agụụ ike maka ndụ anyị ka anyị na-anụ mkpú gasị nke "rusie ọrụ ike!" n'otu ntị, na "zùtúkwuó ike" na ntị nke ọzọ. Gịnị ka ọ gà-apụta ma ọ bụrụ na atụmatụ Chineke maka anyị abụghị naanị otu ụzọ ma ọ bụ nke ọzọ? Ebe a ka ịgba mbọ nsọ na-abata—ụzọ obibi ndị nke irusi ọrụ ike na izu ike n'ụzọ gasị n'enye Chineke otuto.
More