YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 126

126
Abú Nrigo.
1Mb͕e Jehova mere ka ndi nālata na Zaion lata,
Ayi di ka ndi nārọ nrọ.
2Mb͕e ahu ọchì nēju ayi ọnu,
Iti-nkpu-ọṅù nēju kwa ayi ire:
Mb͕e ahu ha nāsi n'etiti mba nile,
Jehova emeworo ndia ihe uku.
3Jehova emeworo ayi ihe uku;
Ayi nāṅuri ọṅu.
4Jehova, me ka ndi-ayi adọtara n'agha lata,
Dika miri-iyi di iche iche nime Negeb.
5Ndi ji anya-miri agha nkpuru gēji iti-nkpu-ọṅù we ihe-ubi.
6Onye nēbu nju-aka nkpuru-ọghigha, ọ bu ezie na ọ nēje ije nākwa ákwá;
Ma ọ ghaghi iwere iti-nkpu-ọṅù biaghachi, nēbu ùkwù-ọka-ya nile.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 126: IGBOB

Highlight

Copy

Compare

Share

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in