ABÙ ỌMA 127
127
Abù Nrigo; nke Solomon.
1Ọ buru na Jehova ewughi ulo,
N'efu ka ha dọb͕uworo onwe-ha n'ọlu nime ya, bú ndi nēwu ya:
Ọ buru na Jehova echeghi obodo,
N'efu ka onye-nche muruworo anya.
2Ọ buru unu ihe-efu, unu ndi nēbili n'isi-ututu, ndi nāla azu n'inọdu ala,
Ndi nēri nri nke ihe-nb͕u di iche iche:
Otú a ka Ọ nēnye ndi Ọ huru n'anya ura.
3Le, ihe-nketa nke nēsi n'aka Jehova bia ka umu bu:
Ugwọ-ọlu Ọ nākwu ka nkpuru nke afọ bu.
4Dika àkú n'aka dike,
Otú a ka umu amuru na mb͕e okorọbia di.
5Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke chiriworo àkú ahu kpojue àkpà-àkú-ya:
Ihere agaghi-eme ha,
Mb͕e ha na ndi-iro-ha nēkwurita okwu n'ọnu-uzọ-ama.
Currently Selected:
ABÙ ỌMA 127: IGBOB
Highlight
Copy
Compare
Share
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.