Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Isi-Okwu Na Nsogbu-Gasị Nke NdụIhe Nhụchatụ

The Issues of Life

ỤBỌCHỊ 8 NKE 8

Ahụike Obi - Mmekọrịta Gasị

Ngosipụta Na Omume Nke Mmekọrịta Gasị. Mmekọrịta ziri ezi na-emepe ndụ gị maka mmụta, agbamume na nchekwa ziri ezi. Ọ dị mkpa ka inwe ndị gị na ha n'emekọrịta na ndụ. Nkwado siri ike siteré n'aka ndị ezinụlọ na ndị enyi dị mkpa maka ime ka obi gị sie ike n'etiti ihe niile dịgasị ná ndụ. Ọ bụ ezie na ndị mmadụ nwerè ọkwá mmetụta-uche dị iche iche, mànà ka m gwa gị na ónyé ọbụla kpebiri ikpọchigide onwe ya n'ime ụlọ ya wee ghara inwe mmekọrịta ọbụla, obi onye ahụ aghaghị ịgba ọchịchịrị. Ee, ndị mmadụ emejọwo gị ma ọ dịghịzi onye ị pụrụ ịtụkwasị obi ọzọ. Mana nke bụ eziokwu bụ na, e kerè anyị ka anyị na ndị mmadụ wee na-akpakọrịta. E kerè anyị ka anyị na ndị mmadụ wee n'emekọrịta. Ma inwe mmadụ puku iri ise dịka ndị enyi na ebe gasị mgbasa-ozi ọha apụtaghị na ị nwerè ndị na ọbụbụenyi bara uru ma ọbụ ndị ga-enye gị ihe ndị dị mkpa ị kwesịrị inwe n'ime ndụ gị. Anyị kwesịrị ịdị mkpachapụ-anya maka iwulite ezigbo mmekọrịta na ọgbakọ gasị ziri ezi.

Devid chọrọ ka ya na Chineke jee ije, ka ya na Chineke n'enwe mmekọrịta. Ebumnobi Devid na Abụ Ọma 51 bụ Nchegharị. Ịnụ Chineke ikwu, 'Agbagharala M gị mmehie gị niile, agaghị M ata gị ahụhụ maka ha', bụ ihe magburu onwe ya, mana Devid kà chọrọ ọtụtụ ihe n'aka Chineke. Ma nke ahụ bụ otu n’ime ndịịche dị n’etiti Sọl na Devid. Sọl chọrọ ka ndị mmadụ hụta ya ka ezigbo mmadụ, mana ihe ká Devid mkpa bụ kà ọnọdụ obi ya si dị. Abụ Ọma 51:11 "Achụpụla m n’iru Gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ Gị." Ọ bụ ọnụnọ nke Chineke, mmekọrịta ya na Chineke bụ ihe bú ụzọ na ndụ Devid.

Cheta, na nchegharị na-enye anyị ohere ịnweta obi ebere gasị nke Chineke - ebere nke mweghachi mmekọrịta anyị na Chineke. Ọnụnọ Chineke bụ ezigbo agụụ nke obi Devid. Na n’ihi na mmekọrịta ya na Chineke dị Devid oké mkpa, o kwuru na Abụ Ọma 51:10: “Mepụta obi dị ọcha n'ime m, Chineke m. Mee ka mmụọ nke iguzosi ike n'ihe Gị dị ọzọ n'ime m." Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Devid nọ na-asị, ‘Onye-nwe-m, ka mụ na Gị bụrụ enyi ọzọ. Mee m ka m nwe ọzọ ọñụ nke nzọpụta Gị, ọñụ nke ịbụ enyi Gị'.

Ilu 4:23 “Jìrí ịdị uchu nile debe obi gị, n’ihi na site na ya ka okwu nile nke ndụ si apụta.” (NKJV). Karịsịa ihe niile, debe obi gị site na ezumike, ntụgharị uche, ntụrụndụ, nchegharị, na ngbatị-ahụ nke mmekọrịta gasị. Ọ bụrụ na gị adị uchu n'eme ihe ise ndị a, ahụike obi gị ga-akwụ chịm. Obi gị àgbaalá ọchịchịrị na jụọ oyi? Ekpere m bụ̀ ka Chineke nye gị obi ọhụrụ na mmụọ ziri ezi, n'aha Jizọs. Kedụ otu ma ọ bụ karịa n'ime ihe ise ndị m kpọrọ aha ọ dị mkpa ka ị bido mewa? Asịla na ịga eme ha ma ị mechaa. Malite mewa ha ugbu a.

Ntụgharị-Uche Gasị
1. Kedụ ihe ọ dị mkpa ka ị gwa Chineke site n'ihe ọgụgụ nke taa?

2. Depụta otu ihe ịga emeriri site n'ihe ọgụgụ nke taa.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Issues of Life

Obi, nke mmụọ ma nke anụ ahụ, kwesịrị ka elebara ha anya. Chineke kwuru na ị kwesịrị ichebé obi gị karịa ihe niile n'ihi na nsogbụ niile nke ndụ na-esi n'obi apụta n'oge ndụ gị. Malite njem nke obi a dị ụbọchị asatọ nke Femi Monehin derè.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele God's Favorite House maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.gfhlive.tv