Isi-Okwu Na Nsogbu-Gasị Nke NdụIhe Nhụchatụ

Ahụike Obi - Ezumike
Karịsịa ego gị, azụmahịa gị niile na ihe niile dị na ndụ gị ị hụrụ n'anya, chèbé obi gị. Ndị dọkịta na-agwa anyị na ime ka obi anụ ahụ dị mma ma gbochie ọrịa ndogbu obi, e nwerè ọtụtụ ihe anyị ga-eme, dabere na ọnọdụ ahụike nke anụ ahụ anyị. Agbanyeghị, ihe abụọ anyị ga-emeriri bụ iri ihe dị mma na imega ahụ. Mmege-ahụ Kardio bụ mmega-ahụ nke obi, ha na-ahụ maka ahụike nke obi. Kardio na-arụ ọrụ n'akụkụ niile nke ahụ dị ka obi si emetụta akụkụ niile nke ahụ. E nwerè ihe omume ime mmụọ ise nke na-eme ka obi gị sie ike. Ọzụzụ ise mụ na gị kwesịrị ime oge niile iji debe ahụ ike nke obi anyị.
Ihe Omume Nke Izu Ike dị mkpa maka ahụike obi. Mgbe ị n'ezubeghị ike, a pụrụ iluso obi gị ọgụ̀ ma gị enwee nnukwu nkụda mmụọ. Na 1 Ndị Eze 19: 1-8 , Elaijah nwerè mwakpo-obi nke ime mmụọ. Ihe Chineke merè bụ naanị ime ka Elaijah zuo ike—ọ fọrọ obere ya adị ka oriri, ọṅụṅụ na ehim ụra n'adịghị agwụ agwụ bụ ihe ọ nọ n'eme. Ha bụ naanị ihe ndị kwesịịrị ya oge ahụ. Oge ahụ abụghị oge iji sụọ n'ire nke ime mmụọ, ma ọ bụ buó ọnụ ma ọ bụ kpee ekpere. Oge ahụ bụ oge iji nwee ezumike! Ihe niile dị mkpa ka ị mee mgbe ụfọdụ iji weghachi ọnọdụ ahụike nke obi gị bụ izu ike.
Mwakpo-obi gasị nà-ánwà iwepụ anyị n'ebe gasị Chineke debere anyị ka anyị rụọ ọrụ, mgbe ihe dị anyị mkpa ọtụtụ oge bụ ka anyị zuo ike. N'ụzọ dị mwute, dị ka Elaijah, ọtụtụ ndị mmadụ esiwo na ebe Chineke deberè ha maka ịrụrụ Ya ọrụ pụọ. Ọtụtụ ekwela ka egwù na obi nkụda chụpụ ha n'ebe Chineke kenyerè ha ọrụ. Ugboro abụọ Chineke gwara Elaijah okwu, Chineke jụrụ ya otu ajụjụ, "Gịnị ka ị na-eme ebe a?" Ekpere m ugbu a maka gị, bụ ka otu amara ahụ búrúlá Elaijah n'ebe dị njọ kwagaá ya n'ebe ọma zute gị ugbu a N'aha Jizọs!
Ị̀ maarà na e kerè anyị ka anyị nwee ezumike n'otu n'ime atọ nke nkewa ebim ndụ anyị niile? Nke ahụ pụtara na ọ bụrụ na ị dị afọ iri anọ na ise, ị hielarì ụra n'otu n'ime nkewa atọ nke ndụ gị, pụtara afọ iri na ise. Ọ bụrụ na ị dị afọ iri atọ, i jirila afọ iri nke ndụ gị hie ụra. Ekwere m na Chineke ji ihe ndị a n'ezitere anyị nnukwu ozi. Ozi ahụ bụ na, ọ bụrụ na izughị ike, i pụghị inwe ezumike na ndụ gị, ma uche gị ga-anọ na ọgba aghara. Ya merè, kwụsịlatú ma zuo nnọọ ike.
Ntụgharị-Uche-Gasị
1. Kedụ ihe ọ dị mkpa ka ị gwa Chineke daberé na ihe ọgụgụ nke ụbọchị taa?
2. Depụta otu ihe ọ dị mkpa ka ị mee daberé na ihe ọgụgụ nke ụbọchị taa.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Obi, nke mmụọ ma nke anụ ahụ, kwesịrị ka elebara ha anya. Chineke kwuru na ị kwesịrị ichebé obi gị karịa ihe niile n'ihi na nsogbụ niile nke ndụ na-esi n'obi apụta n'oge ndụ gị. Malite njem nke obi a dị ụbọchị asatọ nke Femi Monehin derè.
More