Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Isi-Okwu Na Nsogbu-Gasị Nke NdụIhe Nhụchatụ

The Issues of Life

ỤBỌCHỊ 2 NKE 8

Ihe Atọ

Ilu 4:23 “Jìrí ịdị uchu nile dèbé obi gị, n’ihi na site na ya ka okwu nile nke ndụ si a pụta.” (NKJV)

Ihe kachasị mkpa na ndụ mmadụ bụ óbị. Mana mgbe ụfọdụ anyị adịghị elebara obi anyị anya. Ibi ndụ ofuma nwerè ihe ọ n'arụ n'óbị mana ndị mmadụ anaghị eleba ya anya nke ọma. Ihe atọ pụtarà ìhè site na Ilu 4:23-27. Ihe atọ anyị kwesịrị ilebanye ányá màkà óbị anyị.

Nke mbụ, óbị na-achi ókwú anyị. Ilu 4:24 "Zèré okwu rụrụ arụ niile; zèré ikwu okwu rụrụ arụ.." Ịchọọ ịmata ihe dị n'obi gị, gee ntị n'ihe ndị sị n'ọnụ gị apụta. Matiu 12:34 "... Kedụ kà okwu gị gà-esi dị mma ma ọ bụrụ na ire ure dị n'ime gị? N’ihi na ihe i kpakọbarà n’obi gị ka a ga-anụ n’okwu ndị si gị n'ọnụ awụpụtasi!" (TPT). O nwere onye kwụrụ sị, ihe dị n'olulu mmiri na-abanye na bọketị. Ọ buru na mmiri ya rụrụ arụ, ọ gaghị adị ọcha. Olulu dị ọcha ga-enwe mmịrị dị ọcha. Kama i n'eme onyeọma onyeọma, gaa n'iru Chineke yọọ Ya mgbaghara.

Nke abụọ, óbị gị na-achi anya gị. Ilu 4:25 "Legide anya n'iru, lekwasi kwa anya-gị n'ihe dị n'iru gị." Chèkwábá óbị gị ofụma màkà ihe dum gá-achọ́ iwepu ụdọ gị, ma dèbé anya gị n'iru gị.

Nke atọ, óbị gị n'edu ije-gị. Ilu 4:26-27 " Kaa akarà kwụ ọtọ maka nzọụkwụ gị; nọrọ n'ụzọ dị mma. Adịla n'akụkụ; chèbé ụkwụ gị ka ị ghara iso ihe ọjọọ." Michael Hyatt kwuru, "Ọ bụghị amụmá-akwụkwọ gị ma ọ bụ ihe iji àkà gị eme, ọ bụ óbị gị bụ́ ihe kachasị mkpa éjị edú ndị ọzọ." A n'alụso obi anyị ọgụ nke ukwuu. Ọgụ niile ị nwetarà na ndụ gị abụghị maka azụmahịa gị, ụmụ gị, alụmdi na nwunye, nkwalite, ma ọ bụ ahụike gị. Ọ bụ naanị maka okwukwe gị, okwukwe nke dị n'obi gị. Ndị Rom 10:10 "Ọ bụ̀ n'ihi okwukwe dị n'ime obi gị ka gị na Chineke gà-eji abụ oyi...". Ekpere m N'Aha Jizọs Kraịst bụ̀ kà ịhapụ itufu okwukwe gị.

Ntụgharị-Uche-Gasị
1. Kedụ ihe ịchọrọ ịgwa Chineke site n'ọgụgụ nke taa?

2. Depụta otu ihe ịga-eme site n'ọgụgụ nke taa.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Issues of Life

Obi, nke mmụọ ma nke anụ ahụ, kwesịrị ka elebara ha anya. Chineke kwuru na ị kwesịrị ichebé obi gị karịa ihe niile n'ihi na nsogbụ niile nke ndụ na-esi n'obi apụta n'oge ndụ gị. Malite njem nke obi a dị ụbọchị asatọ nke Femi Monehin derè.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele God's Favorite House maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.gfhlive.tv