Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Isi-Okwu Na Nsogbu-Gasị Nke NdụIhe Nhụchatụ

The Issues of Life

ỤBỌCHỊ 3 NKE 8

Ọgụ Nke Óbị

Ihe niile nke ina-agabiga ma ihe niile n'enye gị echiche bụ̀ ọgụ nke óbị gị. Ịmà ihe kpatara ha? Ọ bụ màkà na óbị gị bụ̀ ụlọ ézè. Ụlọ ézè gị daa, alaeze gị adaala. Yá merè na ụlọ ézè kwesịrị ịnwe nnukwute nchebe ka ọ hapụ ịda. Óbị gị bụ̀ ụlọ ézè gị nke n'ekwesighi ịda, ma ekpere m bụ̀ ka ọ hapụ ịda N'Aha Jizọs Kraịst Onye-nwe-anyị!

Ọgụ Nke Óbị #1: Ihe atọ ndị a — Mmechu Ihu, Nkụda Mmụọ, na Ndakpọ Olileanya. Ọ na-ebido na mmechu-ihu, mgbe ihe adịghị aga etụ ịsị wee chee ya, kwágaá na nkụda mmụọ, wee ruzie na ndakpọ olileanya. Ụfọdụ ndị mmadụ ná-agabigá ọgụ nke óbị enwéghị onye enyemaka. Ọ dị mkpa ka ha nweta nkwado. Ọ bụrụ na ọ bụ ụdị ọgụ obi a ka ịna agabiga, chọta nkwado n'aka ndị otù Kraịst ébé ịnọ. Inata nkwado n'etiti ndị otù Kraịst gà-akwalite ndụ gị ma nye gị olileanya. N'Aha Jizọs Dị́ Ike, mmechu ihu, nkụda mmụọ na ndakpọ olileanya ebìela na ndụ gị!

Ọgụ Nke Óbị #2: Ịkpọasị . Oge ọbụla ịkpọ asị batara gị n'obi, ọ bụ ọgụ, ọgụ nke obi. Ịkpọasị ekwesighị inwe ọnọdụ n'ime gị. Ịkpọasị ekwesighị inwe ike n'ahụ gị. Ka obi gị jụpụta n'ịhụnanya nke Chineke.

Ọgụ Nke Óbị #3: Égwù. Égwù na-egbochi ọganihu ndị mmadụ.

Ọgụ Nke Óbị #4: Ekworo. Nke a bụ̀ etụ ónyé iro gị si awakpo gị. Ekworo n'eju óbị n'ihi ihe ịchọrọ mana inwetaghị ya ma ọ bụ ihe ndị ị nwerè nke n'ejughị gị afọ. Ekworo na-ebute ahụ ezughị oke na adịghị uru ime ihe ọbụla.

Ọgụ Nke Óbị #5: Óbị Ilu. Mgbe ụfọdụ anyị n'eji izi ezi anyị ekpuchi óbị ilu. Nà ihe anyị n'eme dị mma ekwesighị itinye óbị ịlụ na ndụ anyị. Perry Noble derè "Ekpere m bụ̀ ka inweta ọgwụgwọ óbị n'ihe ọbụla mmadụ merè gị". Ndị mejọrọ anyị rịọ anyị mgbaghara, ọ n'eme ka anyị nwee ọgwụgwọ óbị. Mà ị mà? Ọ dịghị mkpa inata arịrịọ mgbaghara ka ị mee mgbaghara. Ọ dịghị ebe e derè ya na ị gà-anatarírí arịrịọ mgbaghara tupu gị mee mgbaghara. Ị pụrụ ịgbaghara ndị mmadụ mà ha si gị ndo ma ọ bụ na ha asịghị gị.

Ọ bụrụ ná ịchọrọ ịgbanwe ihe dị na ndụ gị, gbado ányá màkà ihe n'abata n'obi gị. Gbadokwá ányá màkà ihe ndị n'eto na ndụ gị. Óbị gị kwesịrị ịbụ ihe mbụ i n'eleba anya na ndụ gị. Mee nke a ka ụdọ bírí n'ime gị.

Ntughari-Uche-Gasị
1. Kedụ ihe ịchọrọ ịgwa Chineke site n'ọgụgụ nke taa?

2. Depụta otu ihe ịga-eme site n'ọgụgụ nke taa.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Issues of Life

Obi, nke mmụọ ma nke anụ ahụ, kwesịrị ka elebara ha anya. Chineke kwuru na ị kwesịrị ichebé obi gị karịa ihe niile n'ihi na nsogbụ niile nke ndụ na-esi n'obi apụta n'oge ndụ gị. Malite njem nke obi a dị ụbọchị asatọ nke Femi Monehin derè.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele God's Favorite House maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.gfhlive.tv