Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Isi-Okwu Na Nsogbu-Gasị Nke NdụIhe Nhụchatụ

The Issues of Life

ỤBỌCHỊ 1 NKE 8

Obi

Ilu 4:23 “Jìrí ịdị uchu nile dèbé obi gị: n’ihi na site na ya ka ihe nile nke ndụ si apụta.” (NKJV)

Ndị ọkà ihe ọmụma na-ekwu na obi bụ ihe mbụ n'adị ndụ na ihe ikpeazụ na-anwụ. Ihe a ha kwuru na ọmụmụ sayensị kwekọrọ nke ọma. Ọ bụ nà otiti obi nke mbụ ka nwa ọhụrụ na-amalite ịdị ndụ. Mmadụ nwerè ike ifunahụ ọtụtụ akụkụ ahụ ya ma ká dị ndụ. Ma ozugbo obi ya kwụsịrị iti, ọ ga-anwụ pii; otú ahụ ka ọ dịkwa na nke ime mmụọ. Ọnọdụ obi gị nà ekpebi ụzọ ndụ gị ga-eche ihu. Ya merè, iji chịkwaa na mee ka ndụ gị baara gị uru, ọ dị mkpa ka i jisie obi gị ike.

Chineke sị na ị ga-eji ịdị uchu chekwaa obi gị n'ihi na ihe niile nke ndụ, gụnyeré ụzọ ndụ gị, si n'obi gị apụta. Ọ bụrụ na ụzọ ndụ gị ma ọ bụ ihe ndị si ná ndụ gị apụta adịghị amasị gị, ọ dị mkpa ka ị lelee obi gị. Iji debe uche gị ka ihe ndị na-abaghị uru ghara ịbata na ya, iji debe nghọta gị ka njehie na mperi ghara ịbata na ya, iji debe akọ-na-uche-gị ka ọmụma ikpe na unyi ghara imerụ ya, iji debe ịhụnanya nke ime obi gị ka ọ ghara igbanwe bụrụ ihe ruru arụ na iji debe ndụ gị ka ọ ghara ịbụ nke ana ebizụghị n'uju, ọ dị mkpa ka ị chekwaa obi gị. Otu onye kwuru okwu sị, "Kụọ echiche, rìté omume. Kụọ omume, rìté òtù na ụzọ esi eme ihe. Kụọ otù na ụzọ esi eme ihe, rìté akparama-àgwà. Kụọ akparama-àgwà, rìté akarà-aka."

Akarà-aka n'enwu ọtụtụ mmadụ ọkụ n'obi - etú ha ga-esi nwe na bizuo ndụ ha n'uju. Ma ọ bụ echiche gị na-ekpebi omume gị. Omume gị na-ekpebi etú na ụzọ gasị isi eme ihe. Etú na ụzọ gasị isi eme ihe na-ekpebi akparama-àgwà gị. Ma akparama-àgwà gị na-ekpebi etú ụzọ na obibi ndụ gị ga-esi dapụta ma ọ bụ gaa n'ihu. Kama ịdị na-echegbu onwe gị ma ọ bụ n'etikasí ahụ gị gbasara otú ndụ gị ga-esi adapụta, ị kwesịrị itinyekwụ uchu n'ichekwa ihe ndị si n'uche gị apụta, n'ihi na ọ bụ ha ga-ekpebi kà ụzọ ndụ gị ga-esi dapụta ma ọ bụ gaa n'ihu. Kedụ ụdị echiche gasị dị n'ime obi gị?

Nna m n'edu m n'ihe gbasara ime mmụọ, Pastọ Eskor Mfon, bụ onye lara izu ike n'ime Kraịst, kwụrụ si, "Ihe ndị a niile anyị n'eme na na-agabiga bụ ihe gbasara obi. Ije okwukwe a anyị n'eje bụ ije nke obi'" Ọnọdụ nke obi dị ezigbo mkpa nke merenụ na Chineke bibiri obodo dum n'ihi na ha nwerè nsogbu nke obi. Gụọ Jenesis 6:5. Ajụjụ dịnụ bụ, kedụ ka ọnọdụ obi gị dị na elee etụ ịsị echekwa ya?

Ntụgharị-Uche Gasị
1. Site na ihe ọgụgụ nke taa, kedụ ihe ọ dị gị mkpa ikọsara na ịgwa Chineke?

2. Depụta otu ihe ịga emeriri site n'ihe ọgụgụ nke taa.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Issues of Life

Obi, nke mmụọ ma nke anụ ahụ, kwesịrị ka elebara ha anya. Chineke kwuru na ị kwesịrị ichebé obi gị karịa ihe niile n'ihi na nsogbụ niile nke ndụ na-esi n'obi apụta n'oge ndụ gị. Malite njem nke obi a dị ụbọchị asatọ nke Femi Monehin derè.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele God's Favorite House maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.gfhlive.tv