Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Isi-Okwu Na Nsogbu-Gasị Nke NdụIhe Nhụchatụ

The Issues of Life

ỤBỌCHỊ 7 NKE 8

Ahụike Obi - Nchegharị

Omúmé Nke Nchegharị . Ihe omúmé nke anọ a na-eme ka obi gị dị nnọọ ezigbote ike. Gịnị bụ nchegharị? Nchegharị n'ikọ ya n'ụzọ dị mfe bụ ime U-turn, ntụgharị 180 digri. Ichegharị pụtara mgbanwe nke uche nke ga-emerịrị ka a gbanwee ka esi eme ihe ma ọ na-amalitekarị na nkwupụta. Nchegharị bụ mgbanwe n'ụzọ e cheerè ihu. Matiu 3: 8 "Ị gà egosirírí nchegharị gị site na ndụ gbanwere agbanwe" (TPT). A bịa na nchegharị, enwere ụdị ndị mmadụ gasị.

Ụdị mmadụ mbụ bụ ndị kwenyere na ha dị nma, ya merè, o nweghị ihe dịnụ ha kwesịrị ime nchegharị gbasara ya. Mana, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na ọ bụrụ na Chineke amalite inyochà na inye akarà dabere na ezi omume, ònyé pụrụ iguzo? Enweghị onye ọbụla dịnụ ziri ezi. Otù nke abụọ bụ ndị kwenyere na e nweghị mgbapụta maka ha. Ndị dị otú ahụ na-eche na Chineke enweghị ike ịgbaghara ha. Ajụjụ dịnụ abụghị ma Chineke Ọ pụrụ ịgbagharà gị? Ajụjụ dịnụ bụ, ị pụrụ ime nchegharị? Chineke kwuru na ịbịakwute Ya ná nchegharị, Ọ gaghị achụpụ gị.

À pụrụ inwe mgbaghara ma é nweghị́ nchegharị? Anụla m echiche dị iche iche banyere nke a. Mana, m ga-ekwu nke a, Chineke agaghị así gị mee ihe Ọ na agaghị emelí. Chineke na-atụ anya ka anyị gbaghara ọbụna ndị mejọrọ anyị n'arịọghị́ anyị mgbaghara. Gịnị merè Ọ ga-eji sị anyị mee ya? Ọ bụ n'ihi na otu ihe ahụ bụ ihe O merè. Akwụkwọ Nsọ n'ekwu na mgbe anyị kà bụ ndị mmehie, Ọ nwụrụ maka anyị. Jizọs gbaghaara ma kpee ekpere maka mgbaghara ndị nọ na akpọgide Ya n'elu obe. Mmehie anyị niile, n'oge gara aga, ugbu a, na ọdịnihu, ka Ọ gbaghaara n'elu obe. Aghọtahielà nke a, mgbaghara na mmekọrịta abụghị otu ihe. Anyị kwesịrị ịgbaghara mà ndị mmadụ hà rịọrọ anyị mgbaghara mà ọ bụ̀ na ha arịọghị. Ma, ọ bụghị iwu na anyị na onye ahụ ga-adịkwa na mma ọzọ ma ọ bụ banye ná mmekọrịta.

Ya merè, gịnị kpatara ọ jiri dị mkpa ka anyị mee nchegharị? Ọ dị mkpa ka anyị chegharịa ka anyị nwee ike ibata na inata ebere gasị nke Chineke - ebere nke mweghachi mmekọrịta anyị na Chineke. Nchegharị bụ ọnụ ụzọ eji erute ebere ma ọ bụ ebere na-enye anyị ohere ịnweta ihe gasị nke Chineke. Nke ahụ pụtara na ọ bụrụ na anyị echegharịghị, anyị enweghị ike iso Chineke jee ije n'ezie. Ma ọ bụrụ na anyị esoghị Chineke jee ije, anyị apụghị ịbanye na njú nke Chineke. Ọ bụrụ na gị a n'eme ihe omume nke nchegharị kwa ụbọchị, ahụike obi gị ga-akwụ chịm.

Ntụgharị-Uche-Gasị
1. Gịnị ka ọ dị mkpa ka ị gwa Chineke daberé na ihe ọgụgụ nke ụbọchị taa?

2. Depụta otu ihe ị ga-eme daberé na ihe ọgụgụ nke ụbọchị taa.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Issues of Life

Obi, nke mmụọ ma nke anụ ahụ, kwesịrị ka elebara ha anya. Chineke kwuru na ị kwesịrị ichebé obi gị karịa ihe niile n'ihi na nsogbụ niile nke ndụ na-esi n'obi apụta n'oge ndụ gị. Malite njem nke obi a dị ụbọchị asatọ nke Femi Monehin derè.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele God's Favorite House maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.gfhlive.tv