Isi-Okwu Na Nsogbu-Gasị Nke NdụIhe Nhụchatụ

Ahụike Óbị - Ihe Egwuregwu
Omume Nke Ihe Egwuregwu. E nwerè nnukwu ọdịiche dị n'etiti ntọ ọchị na ihe egwuregwu. Ije ébé ndị ntọ ọchị nọ mgbe ụfọdụ n'ebute ike ọgwụgwụ. Ihe ntọ ọchị n'eme ka ike gwụ kwuo gị karịa mgbe ị malitere. Mana ihe egwuregwu n'eme ka áhụ anyị dị ọhụrụ na dị ike. Nke a gosiri na igwu egwuregwu dị ezigbo mkpa.
Ebe ọ bụ na itọ ọchị bụ ihe ana eme iji kpalie mmasị anyị, igwu egwuregwu bụ ihe mmepụta nke onwe anyị. Ihe egwuregwu na-ewete ohere anyị jị egosipụta ike okike Chineke nyerè na tinye n'ime anyị. Ka ị na-eke ihe, ka ị na-adịkwu ka Chineke. Mmadụ niile Chineke kere nwerè ike okike n'ime ha. Ekwela ka ónyé ọbụla gwa gị etụ ọzọ.
Ọ bụrụgodi na i bụ̀ ónyé na anọkarị n'ímé úlọ, íhe okike Chineke dị gị n'ime. Ị́ maarà na isi nri bụ̀ ihe okike? Ndị mmadụ ụfọdụ na-enweta ahụ ike dị ha mkpa site n'isi nri. Eserese, ide ihe, ịkpọ ngwá egwú, bụ̀ ihe okike. Ịgba bọọlụ, ịgwụ mmiri, ikụ golfụ, ihe ndị a bụ̀ ihe okike n'eme ka anyị nwee ahụ ezumike. Ndị nwere mmasị ime ihe egwuregwu n'ezi, n'enweta kwa ezumike ha site n'ụzọ ndị ahụ.
Mgbe ị na-emega ahụ gị, ị na-eme ihe egwuregwu n'ezie. Obi gị ga-adịkwu mma. Ime ihe egwuregwu bụ mmega ahụ obi. Ihe ọ bụla dị n'ụwa niile nke na-enye gị nsogbụ nkè óbị, ime ụfọdụ ihe ndị a niile anyị kwụrụ ga-eme ka óbị gị daa jụụ, nyekwa gị ezigbo ndụ. Nsogbụ ahu nwerè ike iká dị mana igá-enwe mgbanwe echiche banyere ya. Mmega ahụ nke ihe egwuregwu dị ezigbote mkpa.
Ntụgharị-Uche-Gasị
1. Kedụ ihe ọ dị mkpa ka ịgwa Chineke site n'ọgụgụ nke taa?
2. Depụta otu ihe ịga-eme site n'ọgụgụ nke taa.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Obi, nke mmụọ ma nke anụ ahụ, kwesịrị ka elebara ha anya. Chineke kwuru na ị kwesịrị ichebé obi gị karịa ihe niile n'ihi na nsogbụ niile nke ndụ na-esi n'obi apụta n'oge ndụ gị. Malite njem nke obi a dị ụbọchị asatọ nke Femi Monehin derè.
More