Isi-Okwu Na Nsogbu-Gasị Nke NdụIhe Nhụchatụ

Ahụike Obi - Mee Ntụgharị Uche
Omume Nke Ntụgharị-Uche . Anyị bi n'ụwa n'akwagharí ma n'achigharí ma n'eme oké mkpọtụ. Mgbe ụfọdụ, n'agbanyeghị na anyị ezuwo ike, a n'eji mkpọtụ, ihe gasị a n'eme eme na nkwagharí enye anyị nsogbu. Ya merè, anyị gà agarírí n'ebe dị jụụ iji kwụsịtụ na mee ntụgharị uche. N'ụzọ na-akpali mmasị, ọtụtụ ndị mmadụ n'atụ egwù nke ha na uche ha gasị ịnọkọ. Ụjọ n'atụ ha ịnọ jii nụ echiche ha gasị. Ya merè ha ji achọ iji ọtụtụ ihe mejupụta ndụ ha, dịka ịna elele ọtụtụ ihe nkiri na t.v, na ihe nkiri niile ha pụrụ inweta. Gbanyuó t.v gị na debe ngwaọrụ iji eme nkiri n'ebe anya gị agaghị ahụ ya, nye uche gị ezumike na mee ntụgharị uche.
Ime ihe omume nke ntụgharị uche dị̀ ukwuu ma ọ bụ otu n'ime ihe ndị Jizọs na-akụziri anyị akwụsịghị akwụsị site na kà O si eme ihe. Iji maa atụ, na Mak 1:35 "N'ụtụtụ echi ya, Jizọs biliterè ogologo oge tupu chi abọọ, si n'ụlọ pụọ mgbe ọ ka dị ọchịchịrị, wee gaa n'ebe mmadụ na-anọghị iji nye Onwe Ya n'ekpere." (TPT, akarà ike bụ nke m). Jizọs bilirì mgbe ụbọchị dị ezigbote jụụ -ọ bụrụ na ị ga-ahụta ya otù ahụ-, wee hapụ ụlọ ebe Ọ nọ ehi ụra. Nke a bụ ihe m na-amasị ime ọtụtụ mgbe; n'etiti abalị ma ọ bụ n'isi isi ụtụtụ, m na-apụ n'ụlọ m ka m wepụta oge kpee ekpere na mee ntụgharị uche. Ị kwesịrị ime ntụgharị uche.
Ekpere bụ akụkụ nke ime ntụgharị uche. Ịma? Ọ bụrụ na ị ga-ewepụta oge mee ntụgharị uche, ị ga-achọpụta na gị na onwe gị ga-amalite inwewe mkparịta ụka. Ọ nweghị ihe ọjọọ dị n'ime otù a. Ọ bụrụ na ị bụ onye okwukwe, ọ bụrụ na gị na Chineke nwerè mmekọrịta, ị nwere ike ịkpọ Chineke òkù ka Ọ bịa sonyere gị ná mkparịta ụka gị na onwe gị n'enwe. N'eme omume nke ịnọ jụụ ogologo oge. Kedụ ka ị ga-esi eme nke a? Chọọ otu ebe mmadụ na anọghị, nọrọ ọdụ wee dị jụụ - mmụọ gị, mkpụrụ obi gị, uche gị, na ahụ gị. Nye ọtụtụ ndị, idetu ihe n'akwụkwọ n'enyere ha aka ime ntụgharị uche.
Ka ị si hụ, ihe omume gasị maka obi ime mmụọ anaghị eme ka anyị suo ahịrị. Ikwu eziokwu, ha adịghịdị ka ihe ana eme eme dị́ ike. Mana ha dị ezigbo mkpa maka ahụike nke obi ime mmụọ.
Ntụgharị-Uche-Gasị
1. Kedụ ihe ọ dị mkpa ka ị gwa Chineke daberé na ihe ọgụgụ nke ụbọchị taa?
2. Depụta otu ihe ọ dị mkpa ka ị mee daberé na ihe ọgụgụ nke ụbọchị taa.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Obi, nke mmụọ ma nke anụ ahụ, kwesịrị ka elebara ha anya. Chineke kwuru na ị kwesịrị ichebé obi gị karịa ihe niile n'ihi na nsogbụ niile nke ndụ na-esi n'obi apụta n'oge ndụ gị. Malite njem nke obi a dị ụbọchị asatọ nke Femi Monehin derè.
More