Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Bie Ndụ Sité Na Mmụọ Nsọ: Ihe Òfùfè Gasị Siteré Na John PiperIhe Nhụchatụ

Live By The Spirit: Devotions With John Piper

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

Mmụọ Nsọ Bụ̀ Ọdị N'obi Chineke

Mmụọ Nsọ bụ̀ Chineke. Onye bi n’ime anyị, na-edu anyị, na-emekwa ka anyị dị ọcha abụghị onye ọzọ n'abụghị Chineke, Mmụọ Nsọ. Ihe àmà dị mfe maka nke a bụ aha a na-akpọkarị Ya, nke bụ “Mmụọ nke Chineke.” Mmụọ Nsọ “siterè na Chineke” abụghị n’ihi na Chineke kerè Ya, kama ọ bụ n’ihi na Ọ na-ekerịta ọdịdị nke Chineke ma n'esi na Chineke apụta ruo ebighị ebi (lee 1 Ndị Kọrint 2:10–12).

Ọ bụrụ na Ọkpara nke Chineke na Chineke-Nna bụ̀ otu kemgbe ebighị ebi dịka Jon 1:1-3 merè ka o doo anya, otú ahụ ka Mmụọ Nsọ na Chineke-Nna na Ọkpara bụkwa otu kemgbe ebighị ebi, dịka Ndị Rom 8:9-11 na-akọwa, Mmụọ nke Kraịst na Mmụọ nke Chineke bụ̀ otu. Ọ bụrụ na ọ dịghị otù ahụ, anyị gà n'echè na e nwerè mgbe Ọkpara Chineke enweghị Mmụọ ma ọ bụ Chineke-Nna enweghị Mmụọ. Ma Mmụọ Nsọ dị mkpa maka mmekọrịta dị n’etiti Nna na Ọkpara. Ọ bụ, iji okwu nke Handley C.G. Moule, “Ihe mpụta, Njikọ, Ụgbọ, nke obi ụtọ na ịhụnanya dị n'etiti ha na-adịgide adịgide” (Onye na Ọrụ nke Mmụọ Nsọ, p. 28).

Dịka Chineke-Nna si hụ Nwa Ya n'anya site na mgbe ebighị ebi, otú ahụ ka esi nwee Mmụọ Nsọ nke ịhụnanya na ịdị ụtọ n'adịgide adịgide n'etiti ha, Onye Bụ́ Chineke n'Onwe Ya. Ya merè, ka Jizọs na-ekpere ndị ga-eso ụzọ Ya ekpere na Jọn 17:26, Ọ dịghị ihe ọzọ Ọ rịọrọ Nna Ya na abụghị Mmụọ Nsọ mgbe Ọ na-ekwu sị, "E mewo M ka ha mara aha Gị, M ga-agakwa n'ihu n'eme kà á mará Ya, ka ịhụnanya iji wee hụ M n'anya dị n'ime ha, ka M wee dịkwa n'ime ha."

Ihe ebube kachasịnu nke eziokwu niile nke anyị ga-achọpụta na ihe òfùfè a dị ụbọchị asaa bụ̀ na mgbe Mmụọ Nsọ batarà n'ime ndụ anyị, Ọ dịghị abịa naanị ka Mmụọ nke Ọkpara, ma ọ bụ naanị ka Mmụọ nke Nna, kama dị ka Mmụọ nke ịhụnanya dị ebighị ebi n'etiti Nna na Ọkpara, ka anyị wee nwee ike ihu Nna n'anya ka anyị si hụ Ọkpara n'anya, wee hụ Ọkpara n'anya ka anyị si hụ Nna n'anya.

Mụtakwụọ Ihe: http://www.desiringgod.org/messages/the-holy-spirit-he-is-god

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Live By The Spirit: Devotions With John Piper

Ihe Ọgụgụ Asaa Nke Òfùfè Siteré N'aka John Piper Gbasara Mmụọ Nsọ

More

Ọ ga-amasị anyị ikele John Piper na ndị Desiring God maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http//www.desiringgod.org/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara