Bie Ndụ Sité Na Mmụọ Nsọ: Ihe Òfùfè Gasị Siteré Na John PiperIhe Nhụchatụ

Mmụọ Nsọ Na-emeri Ụjọ
N'ihi na M ga-awụkwàsá mmiri n'elu ala akpịrị kpọrọ nkụ, na mee ka miri-iyi ju n'elu ala-akọrọ; M ga-awụkwasị Mmụọ M n'elu ụmụ gị, na mee ka ngọzi M dakwasị ndị si nà gị. — Aịzaya 44:3
Ịmà ihe mere oji dịkarịa mfe iché ndị mmadụ ihu na obi ọma na ụbọchị Fraịdee karịa ụbọchị Monde? Ọ́ bụghị́ n'ihi na olileanya dị ka osimiri nke na-esi n'ọdịnihu dị mma na-asọba n'ime anyị, n'emejupụtakwa udu-mmiri nke ọñụ anyị, nke n'eme ka obiọma na-asonye n'ebe ndị ọzọ nọ?
N'ụbọchị Fraịdee, izu ike na ntụrụndụ dị nnọọ nsọ, ezigbo nso nke na anyị pụrụ idetu ya ọnụ. Site na olileanya, anyị na-edétú ire anyị n'ike nke ezumike ngwụcha izu na-abịa. Udu-mmiri nke ọñụ anyị ahụ na-amalite ijupụta. Ma ọ bụrụ na o nwere ihe ga-eme anyị ezigbo obi ụtọ na ngwụcha izu, udu-mmiri nke ọñụ anyị ahụ ga-ejupụta n'ọnụ wee malite ịwụpụtasì.
Mwụpụtasí nke ọñụ a n'ebe ndị ọzọ nọ ka a n'akpọ ịhụnanya. Ya pụtara na ị n'akpaso mmadụ ibe gị àgwà ofuma mgbe ị na-enwe obi ụtọ maka ọdịnihu gị. Olileanya n'eme ka ijupụta n'oñu, ọñụ ahụ ewee n'asopụta ka ọnụ-ọchị, na okwu ọma, na omume enyemaka. Ụdị ihe a n'eme mgbe oge ezumike nọ n'akụkụ, mgbe ihe ememe ụbọchị ọmụmụ nọ nso, kà ikuku Ekeresimesi bidoro kùwé, na n'ụbọchị Fraịdee gasị nye ọtụtụ ndị mmadụ.
Mgbe Mmụọ Nsọ dakwasịrị wee n'asupụta anyị n'ahụ, anyị n'asupụta na nkwenye nke bụ́ na emere ụbọchị Monde n'eluigwe dịka etù esi mee ụbọchị Fraịdee. Ihe ọ bụla yiri ka ọ ga-ebute egwù echi apụghị ịkpali ụjọ n'ime gị ma ọ bụrụ na ị jupụtarà na Mmụọ Nsọ. Mmekọrita nke ezi n’ụlọ gị nwere ike ọ dịghị mma, ahụike gị nwerè ike na-akawanye njọ, onye isi n'ọrụ gị nwerè ike n'eme atụmatụ ịchụpụ gị, echi nwerè ike iweta esemokwu na-eyi egwù—ihe ọ bụla n'eme ka ị n'echegbu onwe gị maka echi, meghee obi gị maka mwụkwasị nke Mmụọ Nsọ; legide anya n'okwu-ọnụ nke nkwa Ya, Ọ ga-eji olileanya mejupụta gị, gị ewee merie egwù gị.
Mgbe Mmụọ Nsọ dakwasịrị anyị n'ahụ, ọ bụghị naanị na Ọ na-ewepụ egwù anyị, Ọ n'emekwa ka agụụ obi anyị ndị ahụ na akpịrị-ikpọ-nkụ gasị anyị nwerè nwee afọ ojuju. Akpịrị ịkpọ nkụ nke mkpụrụ obi anyị maka Chineke ka Ọ n'eme ka afọ ju—ma ọ bụ ọ dịkarịa ala, anyị na-añụta afọ ojuju zuru ezu n’ime Ya iji mara ebe anyị ga-eji ndụ anyị nile na-añụta ihe.
Ihe abụọ ndị a n'eme ka ọ dịghị olileanya ihe ụtọ dị n'ọdịnihu anyị; Otu bụ nkwesị-ike na nhụsianya na-abịa n'ihu; nke ọzọ bụ̀ atụmanya na añụrị enwekataghị bịa. Ọ̀ bụghị́ ihe abụọ ndị a n'akpata ike ọgwụgwụ nke ọrụ nile nke obi mmadụ dum: ịtụ egwù nhụsianya n'abịa n'ihu na inwe akpịrị-ịkpọ-nkụ maka añụrị n’ọdịnihu? Ọ bụrụ otù ahụ, nkwa Aịzaya bụ nnọọ ihe dị anyị mkpa: mgbe awụkwasarà Mmụọ Nsọ n’ime obi anyị, egwù na-apụ ma anyị enwee afọ ojuju na akpịrị ịkpọ nkụ ọbụla anyị nwerè. Ana m arịọ gị, nwanne m, ọ bụrụ na mmetụ-aka nke Mmụọ Chineke na ndụ gị n'agụsi gị agụụ ike, fùó obi n'agụ Okwu Chineke ehihie na abalị.
Mụtakwụọ Ihe: //www.desiringgod.org/messages/a-precious-promise-the-outpouring-of-gods-spirit
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ihe Ọgụgụ Asaa Nke Òfùfè Siteré N'aka John Piper Gbasara Mmụọ Nsọ
More