Bie Ndụ Sité Na Mmụọ Nsọ: Ihe Òfùfè Gasị Siteré Na John PiperIhe Nhụchatụ

Mmụọ Nsọ Na-enyere Anyị Aka Ịnwụ
Ọ bụrụ na ana-akọcha gị n’ihi aha Kraịst, onye agọziri agọzi ka ị bụ̀, n’ihi na Mmụọ nke Ebube na nke Chineke dị ndakwasị n’ahụ́ gị. — 1 Pita 4:14
Corrie ten Boom kwuru otú o si nọrọ n'echegbu onwe ya dị ka nwa agbọghọ mà ọ gà-enwe ike iguzogide ndị German ma ọ bụrụ na ha yie ya egwù. Ike gwụrụ ya nke ukwuu mgbe o cherè ihe nwere ike ime. Nna ya, ee ọ ga-abụ ya, nyerè ya nnukwu ihe nkọwa-atụ sí, "Mgbe ị ga-aga njem n'ụgbọ okporo-ígwè, m̀ na-enye gị tiketi gị izu atọ n'oge ka ọ bụ̀ m n'enye gị ya ozugbo ị banyerè n'ụgbọ okporo-ígwè?" Ọ zara, "Ozugbo m banyerè n'ụgbọ okporo-ígwè." Nna ya ewee si ya, "Ya merè, Chineke ga-enye gị ike pụrụ iche dị gị mkpa iji dị ike n'ihu ọnwụ ozugbo mgbe ọ dị gị mkpa, n'oge ahụ, abụghị tupu ihe ọjọọ abịa."
Ekwenyerè m na 1 Pita 4:14 na-ekwe nkwa na n’oge awa nke ọnwụnwa kachasị ukwuu, Chineke na-abịakwute ụmụ Ya iji nye ha obi ike na okwukwe nke ha na-amaghị na ha nwerè ike inwe. Mmụọ Nsọ ga-enyere gị aka ịnwụ.
Ezi omenala na-agwa anyị na ọ bụ Nero gbupụrụ Pọl isi. Akwụkwọ ozi ikpeazụ Pọl dere bụ̀ ma eleghị anya, 2 Timoti. Ikpe ya amalitelarị̀. Weregodị anya nke uche gị hụ onye agha ochie ahụ, bụ́ onye agha tara ahụhụ n’ihi Ọchịagha ya, nọ n’ụlọ mkpọrọ na Rom. Akpọrọ ya ka ọ bịa guzoro n’ụlọikpe. Onye ọbụla mà na ụbọchị ndị o ji adị ndụ agwụla. Ọ bụ nwoke nwere akarà ọnwụ n'ahụ ya. Ya merè na ọ dịghị onye ọbụla n'ime ndị enyi ya kwụ ya n'akụkụ. Ọ zaarà ọnụ onwe ya. E merè mkpebi ka a nụ́ ihe ikpeazụ ọ ga-ekwu ọzọ—mgbe o mecharà nke ahụ, ọgwụgwụ ya bịara. Ọ laghachirì n’ebe asi ya nọdụ wee degaara Timoti okwu ndị a (2 Timoti 4:16–17), “Mgbe izizi m gara izara ọnụ m ọ dịghị onye ọ bụla bịara guzo n’akụkụ m, ma ha nile gbahapụrụ m. Ka a ghara ịgụ nke a megide ha! Mana Onye-nwe-anyị guzoro n’akụkụ m wee mee ka m dị ike.”
Ana m ekpe ekpere ka ị cheta okwu ndị a: Mmụọ Nsọ gà-enyere gị aka ịnwụ. Ọ gà-eguzo n'akụkụ gị mgbe ọ na-adịghị onye ọzọ dị́. Ọ ga-eme ka okwukwe gị kwugidesie ike. Ọ ga-enye gị ihe onyinyo-gasị nke ebube. Ọ ga-eme ka ị bulie Kraịst elu na ọnwụ gị. Obi ike nke ị na-echetụbeghị na ọ ga-ekwe omume gà-abụ nke gị. Mmụọ nke Ebube na nke Chineke gà-adakwasị gị wee búrú gị laa Eluigwe.
Mụtakwụọ Ihe: http://www.desiringgod.org/messages/the-holy-spirit-will-help-you-die
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ihe Ọgụgụ Asaa Nke Òfùfè Siteré N'aka John Piper Gbasara Mmụọ Nsọ
More