Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Bie Ndụ Sité Na Mmụọ Nsọ: Ihe Òfùfè Gasị Siteré Na John PiperIhe Nhụchatụ

Live By The Spirit: Devotions With John Piper

ỤBỌCHỊ 2 NKE 7

Mmụọ Nsọ Na-edu Anyị

Oge kwuru oge Akwụkwọ Nsọ na-enyere anyị aka ịghọta mgbagwoju anya nke ndụ: alụmdi na nwunye na-adà adà, ụmụaka na-enupụ isi, ọgwụ ọjọọ n'eri ahụ, mbà ndị na-alụ ọgụ, nlọghachi nke akwụkwọ-osisi n’oge ihe ubi n'eto eto, agụụ n'enweghị afọ ojuju nke obi anyị, egwù nke ọnwụ, òtútó nke ụmụntakịrị, otuto na ikwa ụta zuru ụwa ọnụ, nganga juru ebe niile, na mmasị a n'enye ngọnarị nke onwe onye.

Akwụkwọ Nsọ na-egosipụta osinachi Ya oge kwa oge ka Ọ n'enyere anyị aka ịghọta ahụmahụ anyị n'ụwa anyị n'ele anya wee n'atụziri anyị aka ụzọ anyị ga-esi chọta ịdị n'otu. Ya merè, ọ bụ olileanya m, na otu n’ime mgbọrọgwụ nke Oziọma anyị ga-eji kpọrọ ihe nke na anyị pụrụ ịnwụ maka ya (na bie ndụ maka ya!) bụ̀ na Mmụọ Nsọ bụ̀ Chi dere Akwụkwọ Nsọ niile.

O, ọ dị m ka chi ejila ka anyị kpaa ụka ime banyere ihe gasị magburu onwe ya nke mgbọrọgwụ nke Oziọma a pụtara! Mmụọ Nsọ ebighi ebi, Mmụọ nke ịhụnanya na obi ụtọ dị n’etiti Nna na Ọkpara, bụ̀ Onye dere Akwụkwọ Nsọ.

  • Ya merè, Akwụkwọ Nsọ bụ̀ eziokwu (Abụ Ọma 119:142) ma kwesi ntụkwasị obi kpam kpam (Ndị Hibru 6:18).
  • Ọ dị ike n'arụ ọrụ ebumnuche Ya na ndụ anyị (1 Ndị Tesalonaịka 2:13) Ọ dịghị aloghachí kwurú Onye zipụrụ Ya arughị ihe eji zipụ Ya (Aịzaya 55:10-11).
  • Ọ dị ocha, dịka ọla-ọcha anụcharà n’oké ọkụ ugboro asaa (Abụ Ọma 12:6).
  • Ọ n'eme nsachapụ ma n'edebe nsọ (Jọn 17:17).
  • Ọ n'enye ndụ (Abụ Ọma 119:37, 50, 93, 107; Jon 6:63; Matiu 4:4).
  • Ọ na-eme ka mmadụ mara ihe (Abụ Ọma 19:7; 119:99–100).
  • Ọ na-enye ọñụ (Abụ Ọma 19:8; 119:16, 92, 111, 143, 174) ma n'ekwe nkwa nnukwu ụgwọ ọrụ (Abụ Ọma 19:11).
  • Ọ na-enye ndị n'adịghị ike, ike (Abụ Ọma 119:28) na n'enye ndị na-enwe nkụda mmụọ nkasi obi (Abụ Ọma 119:76) n'enye ndị nwere mgbagwoju anya nduzi (Abụ Ọma 119:105) na nzọpụta nye ndị furu efu (Abụ Ọma 119:155; 2 Timoti 3:15).

Amamihe nke Chineke n'ime Akwụkwọ Nsọ dị agwụghị agwụ. Ọ bụrụ na mgbọrọgwụ nke Oziọma a bụ̀ eziokwu, ihe ọ pụtara gà-esiwanye ike na bawanye nke na o kwesịrị imetụta akụkụ niile nke ndụ anyị.

Mụtakwụọ Ihe: http://www.desiringgod.org/messages/the-holy-spirit-author-of-scripture

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Live By The Spirit: Devotions With John Piper

Ihe Ọgụgụ Asaa Nke Òfùfè Siteré N'aka John Piper Gbasara Mmụọ Nsọ

More

Ọ ga-amasị anyị ikele John Piper na ndị Desiring God maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http//www.desiringgod.org/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara