Bie Ndụ Sité Na Mmụọ Nsọ: Ihe Òfùfè Gasị Siteré Na John PiperIhe Nhụchatụ

Mmụọ Nsọ N'eme Ka Anyị Jupụta N'ọñụ
Ya merè, lezienụ̀ anya ka unu si-eje ije, a bụghị ka ndị na-amaghị ihe kama dịka ndị maara ihe, n'eji oge a eme ihe nke ọma, n'ihi na ụbọchị ndị a dị njọ. Ya merè, unu abụla ndị nzuzu, kama ghọta nụ̀ ihe uche Onye-nwe-anyị bụ̀. Unu añụbigalà mmanya ókè: n'ihi na nke ahu bụ mmerụ na ibèribè, kama dị nụ njupụta na Mmụọ Nsọ. —Ndị Efesọs 5:15-18
Gịnị merè ndị mmadụ ji añụ mmanya n'aba n'anya? Ọ bụ ka obi ha kpalie na aṅụrị. Anyị niile chọrọ inwe obi ụtọ, mana e nwerè nsogbu dị: “Oge ugbu a dị njọ” (amaokwu 16).
Olee ebe ị ga-eche ihu wee gbabà mgbe ụbọchị ọjọọ bịara, mgbe ụjọ na-atụ gị ma ọ bụ i nwere nkụda mmụọ ma ọ bụ ịda mbà n'obi ma ọ bụ nechegbu? Pọl rịọrọ anyị, sị: “Unu echelá mmanya ihu maka nkasi obi; chee nụ̀ ihu n'ebe Mmụọ Nsọ nọ. Ihe ọbụla unu che bụ́ uru nke mmanya pụrụ inye unu, Mmụọ Nsọ Bụ́ Chineke pụrụ inye unu karịa ya bụ́ ihe."
Enwere ndị na-enweghị ike ịmalite igbu opi ọnụ ma ọ bụ gụọ egwú obi ọma n'ebe ha n'arụ ọrụ n'ihi na nsogbu nke ụwa dị ha n'obi. Mana n'uhuruchi, n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ, mgbe ha ṅụchara ihe ọṅụṅụ ole na ole, ha pụrụ imakù ibe ha wee malite ịchị ọchị na ịgụ egwú.
Anyị nile n'enwe olileanya ịdị enweghị nsogbu, ibi ndụ n'obi ụtọ, na inwe aṅụrị. Mana ọdachi na-arị elu nke oge anyị, dị ka ọ dị na oge Pọl, bụ na ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ (ọbụna ndị Kraịst) kwenyerè na nanị otu ụzọ ha pụrụ isi nweta nnwere-onwe a yiri nke ụmụaka bụ site n’iji mmanya na-aba n'anya wee mejue onwe ha. Omume dị otú ahụ adịghị ewetara Chineke otuto, ya merè Pọl na-ekwu, sị: “E nwere ụzọ ka mma isi nagide ụbọchị ọjọọ—jupụtanụ̀ na Mmụọ Nsọ, unu ga-amarakwa ọṅụ n'enweghị atụ nke ịbụ abụ na inwe abụ olu ụtọ nye Onye-nwe-anyị.
Ya merè, gịnị ka ijupụta na Mmụọ Nsọ pụtara?
Mmụọ nke na-emejupụta anyị bụ̀ Mmụọ nke ọṅụ nke dị n’etiti Chineke-Nna na Chineke-Ọkpara n’ihi obi ụtọ ha nwerè n’ebe ime Onwe Ha nọ. Ya merè, ịdị njupụta na Mmụọ Nsọ pụtara ijupụta onwe anyị n'ọṅụ nke dị n'etiti Atọ n'Ime Otu dị Nsọ na ịhụ Chineke-Nna na Chineke-Ọkpara n'anya jírí otu ịhụnanya ahụ Ha ji hụrita Onwe Ha n'anya.
Awara-ụzọ nke Mmụọ Nsọ na-esi awabata n'ime ọhịa nke nchegbu anyị wee banye n'ime awara-ụzọ nke ọṅụ anyị, bụ site na awara-ụzọ nke okwukwe. Dị ka Pọl si kwuo, ụzọ e si ejupụta na Mmụọ Nsọ bụ site n’ịtụkwasị obi na Chineke nke olileanya na-achị n’ezie—na ọ dịghị nwa nza n'ada n’ala ma ọ bụghị uche Ya ka o mee (Matiu 10:29)—na ikwenye na Ọ n'eme ka ihe niile dị n'ụwa kwekọọ ma n'aga nke ọma maka gị na ndị niile n'atụkwasị obi na Okwu Ya. N'ikwere nke ahụ, i ga-ejupụta na Mmụọ Nsọ na ọṅụ.
Mụtakwụọ Ihe: http://www.desiringgod.org/messages/be-filled-with-the-spirit
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ihe Ọgụgụ Asaa Nke Òfùfè Siteré N'aka John Piper Gbasara Mmụọ Nsọ
More