Bie Ndụ Sité Na Mmụọ Nsọ: Ihe Òfùfè Gasị Siteré Na John PiperIhe Nhụchatụ

Mmụọ Nsọ Na-eme Ka Ahụ Anyị Si N’ọnwụ Bilie
Ọ bụrụ na Mmụọ nke Onye ahụ kpọliteré Jizọs n’ọnwụ bi n’ime unu, Onye ahụ nke mere ka Kraịst Jizọs si n’ọnwụ bilie ga-emekwa ka ahụ unu nke na-anwụ anwụ dị ndụ ọzọ site na Mmụọ-Ya nke bi n'ime unu. —Ndị Rom 8:11
Ahụ gị dị Chineke oké mkpa. Ọ bụrụ na nke a abụghị eziokwu, Ọ gaarà ahapụ ahụ gị ya eree n'ime ili wee chefuo gị ebe ahụ kpam kpam. Ma ọ dịghị mgbe Chineke n'akpa àgwà otù ahụ. Mbà nụ̀, Chineke kerè gị ka i nwee ahụ, ma kee gị ka ị gosipụta ebube Ya.
Ya merè na Ọ ga-akpọlite na nye ahụ gị nke pụrụ ịnwụ anwụ ndụ site na Mmụọ Ya, n’agbanyeghị otú ahụ gị sìrì gwọpịa, dị nkwarụ, mịa amị, ma ọ bụ taa ahụhụ n'aka ọrịa, Ọ ga-emekwa ka o sie ezigbo ike, dị ahụike kara aka, na maa nnukwute mma nke nà mgbe m ga-ahụ ahụ gị, m gà etí, “Ị dị ka mbara-igwe sara asa n'ụbọchị anyanwụ ji ike ya n'eti. Ị dị ka ịma mma nke nde kpakpando jupụtara wee n'egbuke na mbara-igwe abalị. Ìhè gị dị ka anyanwụ-ụtụtụ; ee, n’ime gị ka m na-ahụ njupụta ebube nke ebube Jizọs Kraịst Onye mere gị, gbapụta gị, kpọlitekwa gị, wee jiri ebube Ya mee ka ibawanye n'ebube ebighị ebi ruo ebighị ebi.”
Kedụ ebe mmadụ pụrụ ịchọta ike iji n'akawanye anya n'ebi ndụ nke ịhụnanya n'ụwa nke ụgwọ ọrụ ihe dị otù ahụ adịghị ọtụtụ? Kedụ ebe di ma ọ bụ nwunye pụrụ isi nweta ike nke mmụọ, obi na uche iji ka n'enye ihe, n'ahụ n'anya ma n'emesapụ aka obiọma ọbụna mgbe ọ n'adịghị enweta uru mbọ ya niile? Kedụ ebe nwoke ma ọ bụ nwaanyị nwéré agụụ nke ilu di ma ọ bụ nwunye pụrụ isi nweta ike nke mmụọ na obi iji nọgidesie ike akwaghị ikó ma ọ bụ imerụ ahụ ya ogologo oge ruo afọ iri asaa? Kedụ ebe Jizọs sìrì nweta ike iji dìé obe na wèré ihere nke ọnwụ Ya dịka ọ dịghị ihe ọ bụ (Ndị Hibru 12:2)?
N’ihi ọñụ e deberè n’ihu anyị ná mbilite n’ọnwụ, anyị na-atachi obi wee dìé ihe niile maka Kraịst. Jizọs ekweghị nkwa na ụmụ mmadụ gà-akụrụ ndị na-erubere Ya isi aka ná ndụ a. Ọñụ anyị na-esi n’olileanya a n'apụghị ịkwa aka nke Ndị Rom 8:11, o sighí na nchigharí na ngabiga nke ihe ndụ anyị. “Ọ bụrụ na Mmụọ nke Onye ahụ kpọlitere Jizọs n’ọnwụ bi n’ime unu, Onye ahụ nke mere ka Kraịst Jizọs si na ndị nwụrụ anwụ dị ndụ, ga-enye ahụ unu nke na-anwụ anwụ, ndụ.”
Ọ bụrụ na i kwerè n'ezie na Chineke nọnyeere gị, na Ọ chọghị imegide gị, na Ọ ga-enye ahụ gị ndụ site na Mmụọ Nsọ Ya nke bi n'ime gị, na ihe ọ bụla dị mma nke ị gbahapụrụ ma ọ bụ funahú maka nje ozi nke Alaeze Ya n'ụwa a, bụ̀ nke a gà-akwughachi gị ụgwọ ya narị kwa narị na mbilite n'ọnwụ nke ndị ezi omume (Mak 10:28–30), na ị gà na-acha dị ka anyanwụ n’Alaeze Nna gị, mgbe ahụ i gà-enwe ike n'apụghị igwụ agwụ iji n'aga n'ihu n'arụ ọrụ ọma ahụ Chineke kpọrọ gị ka i rụọra Ya n'agbanyeghị ma a kuurù gị aka ma ọ bụ a gbachirì gị nkịtị.
Mụtakwụọ Ihe: "http://www.desiringgod.org/messages/the-spirit-will-give-life-to-your-mortal-bodies
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ihe Ọgụgụ Asaa Nke Òfùfè Siteré N'aka John Piper Gbasara Mmụọ Nsọ
More