Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Bie Ndụ Sité Na Mmụọ Nsọ: Ihe Òfùfè Gasị Siteré Na John PiperIhe Nhụchatụ

Live By The Spirit: Devotions With John Piper

ỤBỌCHỊ 4 NKE 7

Mmụọ Nsọ Na-eme Ka Anyị Dị Nchekwa

N'ime Ya...gị...ka eji Mmụọ Nsọ e kwerè na nkwa chekwaa, Onye bụ mmesi-obi-ike maka ihe-nketa-anyị ruo mgbe anyị ga-enweta ya n'ezie, ná mbuli elu nke ebube Ya. —Ndị Efesọs 1:13-14

Ihe na-agụsi Chineke agụụ ike maka ndị Ya bụ ka anyị nọrọ ná nchekwa obi n’ịhụnanya Ya na n’ike Ya. Ihe ọ bụla ọzọ ná ndụ a nwerè ike ghara ịdị n’otu—ahụ́ike anyị, ezinụlọ anyị, ọrụ anyị, agụmakwụkwọ anyị, obodo anyị, ụwa anyị. N'ọkwa ọbụla n'ime ihe ndị a, o nwere ike ịdị gị ka ị nọ n'ụlọelu nke ogo ya dị iri anọ ebe ikuku n'enweghị atụ n'efe. Ọ na-dịka ikuku ọ ga-ebupú gị n'ihi na i nweghi nguzo sịrị ike, ihe ọbụla ị jidere aka ná dịka ọ dịghị anọgide.

Ebe ọ bụ na Chineke na-eme ihe niile maka otuto Ya, bụrụkwa na ikwere na Okwu Ya na-ebuli otuto ahụ elu, Chineke na-eme ihe dị mkpa iji chekwaará Onwe Ya mbuli-elu ebube Ya ruo mgbe ebighị ebi: Ọ na-eji Mmụọ Nsọ kùchie onye kwere ekwe, wee na-ekwe nkwa na anyị ga-abata n'ime ihe-nketa-anyị n'eto ebube Ya.

Chineke ji obi Ya niile kpebisie ike inwe ndị mmadụ bụ ndị nke Ya, ndị na-adị ndụ ebighị ebi maka otuto nke ebube Ya nke na Ọ gaghị ekwe ka ọdịnihu ebighị ebi anyị daberé n’ike anụ ahụ anyị nke ịchọ ime ihe ma ọ bụ ịdị ike ime ihe. Ọ na-ezite Mmụọ Nsọ Ya ka Ọ bata na ndụ anyị wee mee ka anyị nọrọ ná nchekwa ruo mgbe ebighị ebi.

Chineke na-ezite Mmụọ Nsọ ka Ọ bụrụ Onye nchekwa iji machie okwukwe anyị, dị ka akarà na-egosi na anyị bụ ụmụ Ya, na dịka akarà nchekwa iji gbochie ike mbibi. Isi ihe bụ̀ na Chineke chọrọ ka anyị nọrọ ná ntụkwasị obi na nchekwa nke ịhụnanya na ike Ya.

Na Ndị Efesọs 1:14, Chineke na-ekwu, sị: “Agụụ M nwerè n’ebe ndị kwere na M nọ bụ ka ha nọrọ ná nchekwa nke ịhụnanya M. Ahọpụtawo M ha tupu a tọọ ntọala nke ụwa. Emeelarị M ha kemgbe ka ha bụrụ ụmụ M rue mgbe ebighi ebi. Ejiwo M ọbara nke Ọkpara M gbapụta ha. Etinyewokwa M Mmụọ M n'ime ha ka Ọ buru akarà na ihe-nkwenye. Ya merè, ha ga-anata ihe-nketa M kwerè na nkwa wee too ebube nke amara M rue mgbe ebighi-ebi.

M na-agwa unu ihe a na Ndị Efesọs 1 nʼihi na achọrọ M ka unu nọrọ ná nchekwa nke ịhụnanya M na ike M. Anaghị M ekwe unu nkwa ndụ dị mfe. N'ezie site na ọtụtụ mkpagbu ka unu ga-eji banye n'Alaeze (Ọrụ Ndịozi 14:22). Ka M kwuo ya ọzọ: Ahọpụtawo M gị. A kawo M gị akarà tupu ụwa adị; agbapụtawo M gị; Ejiwo M Mmụọ M kùchie gị. Ihe-nketa-gị dị adị n'eche gị, n’ihi na eji M obi M niile n'eme ka ebube nke amara M n'ime nzọpụta gị, towanye.”

Mụtakwụọ Ihe: "http://www.desiringgod.org/messages/sealed-by-the-spirit-to-the-day-of-redemption

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Live By The Spirit: Devotions With John Piper

Ihe Ọgụgụ Asaa Nke Òfùfè Siteré N'aka John Piper Gbasara Mmụọ Nsọ

More

Ọ ga-amasị anyị ikele John Piper na ndị Desiring God maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http//www.desiringgod.org/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara