Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iso Jizọs Ọnụ N'ekwuchitere AnyịIhe Nhụchatụ

Following Jesus Our Mediator

ỤBỌCHỊ 4 NKE 7

Jizọs Na Ndị Na-atụ Egwù

Ọ dịghị egwù dị ukwuu nke na Jizọs enweghị ike inyere anyị aka iche ya ihu. Ọ dịghị ọchịchịrị miri emi nke na ìhè Ya apụghị iba na ya wee gbasaa ya.

Site na Africa Study Bible ihe mmụta a kpọrọ “Ìhè nke Ndụ”:

N'ọtụtụ ebe, mmalite nke abalị na-ebute egwù na ụjọ nke ihe ọjọọ ná-ejegharị. A na-eme ọtụtụ ihe ọjọọ na mpụ n'okpuru ọchịchịrị. Ọrụ amuusú na ịgba afa ọjọọ, izu ohi na igbu ọchụ, omume rụrụ arụ na ịṅụbiga mmanya ókè na-ewerekarị ọnọdụ n'oge ochịchịrị. Ndị na-egbu ọchụ na ndị na-agba ọsọ abalị na ndị na-ajụ ese na-ezo n’ọchịchịrị. Ndị mmadụ ejighị n'aka ihe dị na ndò nke ọchịchịrị, n'ihi ya, ha na-atụ anya chi ọbụbọ.

Ma n'ebe Jizọs nọ, ọ dịghị onye kwesịrị ịtụ egwù ọchịchịrị n'ihi na mgbe ị họọrọ iso Ya, ị gaghị agakwa ije n'ọchịchịrị kama n'ọṅụ nke ìhè Ya. N’ezie, a kpọrọ Ya Ìhè nke Ụwa n’Oziọma Jọn. Onye ọ bụla nke chọrọ ka ọnụnọ Kraịst pụta ìhè—Onye na-enye olileanya na ntụzi aka ná ndụ—aghaghị isonyerè Kraịst site n’okwukwe. Nke a bụ nanị ụzọ a gà-esi ‘jupụta n’ìhè, n’enweghị akụkụ gbara ọchịchịrị . . . ná-egbukepụ egbukepụ, dị ka a gà-asị na ide mmiri ìhè na-ejupụta gị n'ìhè" (Luk 11:36). Ikwe ka Jizọs, Ìhè nke Ụwa, mejupụta ndụ gị, bụ̀ nanị ụzọ ị gà-esi zere ịbụ ndị a na-atụgharị n’ọchịchịrị nke ụwa na ihe ụtọ ya gasị dị aghụghọ.

Tụgharịa Uche Ma Ọ Bụ Kparịta Ụka

1 Jọn 1:5 kwuru, sị: “Chineke bụ Ìhè, ọchịchịrị adịghịkwa n’ime Ya ma ọlị.” Gịnị merè o ji dị mkpa na a na-akpọ Jizọs Ìhè nke Ụwa, na ọ dịghịkwa ọchịchịrị dị n'ime Ya?

Kedụ otú ị gà-esi kọwaa ọdịiche dị n'etiti ibi ndụ n'ọchịchịrị na ibi ndụ n'ìhè? Kedụ ndụ ị chọrọ ibi?

Olee ihe egwù ma ọ bụ akụkụ ọchịchịrị dị na ndụ gị nke na-egbochi ìhè nke ndụ Ya ka ọ ghara ịcha? Ị gà-arịọ Ya ka Ọ bịa mụnye ìhè na-eme ka ọ dị ọcha n'akụkụ niile gbara ọchịchịrị nke ndụ gị?

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Following Jesus Our Mediator

Onye arịrịọ kpurú ìsì ná-etí mkpu n'akụkụ okporo ụzọ, nwaanyị ná-emé omume rụrụ arụ nke ọha mmadụ nweré nkwanye ùgwù ledarà anya dị ka onye ruru unyi, onye ọrụ gọọmenti rụrụ arụ nke mmadụ nile kpọrọ asị —olee otú ndị a siteré n'akụkụ ọha mmadụ e lepụrụ anya gà-esi nwee olileanya na ha gà-emekata bịakwute Chineke dị nsọ nso? Dabere ná nghọta-ime ndị sitere n’akwụkwọ Luk n’ime Baịbụl Ọmụmụ Afrika, gbasoo Jizọs ka Ọ nà-edozi nkewa na mgbawa dị n’etiti Chineke na ndị e kewapụrụ ekewapụ̀.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Oasis International Ltd maka inye anyị atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://Oasisinternationalpublishing.com