Iso Jizọs Ọnụ N'ekwuchitere AnyịIhe Nhụchatụ

Jizọs Na Ndị N'ata Ahụhụ
Nhụjuanya, dị ka ịda ogbenye, nwerè ike ịdị n'ụdị dị iche iche. Jizọs ṅara ntị ná ndị na-ata ahụhụ n’ụzọ anụ aru ma ọ bụ n’ụzọ ime mmụọ wee zaghachi arịrịọ ha.
Site na Africa Study Bible ilu na akụkọ gasị a kpọrọ “Àdím Ìsì Nke Na A Pụrụ Ịhụ Ụzọ”:
E nwerè okwu na-ewu ewu n’ọtụtụ omenala Afrịka, karịsịa n’etiti ndị Mendi nke Sierra Leone, si na “Nwatakịrị nke na-ebekarị ákwá na-enweta enyemaka nke nne karịa.”
Onye arịrịọ ahụ kpurú ìsì nke nọ n’ụzọ Jeriko enweghị ike ịgbakwute Jizọs n'ọsọ, mana o nwerè ike ịdọta uche Jizọs site n’iji olu ya mee ihe. O tiri mkpu—o wee dọta uche Jizọs dị ka nwa ahụ na-eti mkpu sì enweta mgbaru-ọsọ na enyemaka nke ndị mụrụ ya.
Ịkpọku Jizọs n’okwukwe, n’agbanyeghị ọnọdụ gị, gà-adọta uche Ya. N'ebe a ka azịza ekpere gị gà-amalite. Ị kwesịghị ịta ahụhụ na nkịtị ma ọ bụ burú ibu naanị gị; Jizọs nọ nso ma naanị ihe ịga eme bụ ịkpọku aha Ya n'ekpere.
Tụgharịa Uche Ma Ọ Bụ Kparịta Ụka
Ó yirì site n'ihe onye ìsì ahụ merè kà ọ mataworị onye Jizọs bụ̀. Gịnị ka ọ nụrụ banyere Jizọs?
Ìgwè mmadụ ahụ kpọrọ Ya “Jizọs Onye Nazaret,” ma onye ìsì ahụ kpọrọ Ya “Jizọs, Ọkpara Devid.” Gịnị ka aha abụọ a dị iche iche na-agwa anyị gbasara Jizọs?
Gịnị merè i ji chee na Jizọs jụrụ nwoke ahụ kpurú ìsì ihe ọ chọrọ mgbe o doro anya ihe yabụ nwoke n'achọ?
Ò nwerè ọnọdụ ịta ahụhụ na ndụ gị chọrọ enyemaka Jizọs ugbu a? Gwa Ya banyere ya n'ekpere.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Onye arịrịọ kpurú ìsì ná-etí mkpu n'akụkụ okporo ụzọ, nwaanyị ná-emé omume rụrụ arụ nke ọha mmadụ nweré nkwanye ùgwù ledarà anya dị ka onye ruru unyi, onye ọrụ gọọmenti rụrụ arụ nke mmadụ nile kpọrọ asị —olee otú ndị a siteré n'akụkụ ọha mmadụ e lepụrụ anya gà-esi nwee olileanya na ha gà-emekata bịakwute Chineke dị nsọ nso? Dabere ná nghọta-ime ndị sitere n’akwụkwọ Luk n’ime Baịbụl Ọmụmụ Afrika, gbasoo Jizọs ka Ọ nà-edozi nkewa na mgbawa dị n’etiti Chineke na ndị e kewapụrụ ekewapụ̀.
More