Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iso Jizọs Ọnụ N'ekwuchitere AnyịIhe Nhụchatụ

Following Jesus Our Mediator

ỤBỌCHỊ 3 NKE 7

Jizọs Na Ndị Mmehie

Ọ dịghị mgbe Jizọs weerè onye ọ bụla dị ka onye mmehie nke ana apụghị ịgbagharà. Ọ nabatarà ọbụna ndị obodo ledarà anya.

Site na Africa Study Bible nke isi mmalite ya bụ "Ísì nke Mgbaghara":

Anyị niile adịghị ebi ndụ kà Chineke gwarà anyị ka anyị bie. Mmehie anyị na-ewute ndị ọzọ, mgbe ụfọdụ nke ukwuu. Ezi ndị kwere ekwe na-achọsi ike ka Chineke na ndị ha mejọrọ gbaghara ha.

N’akụkọ a, otu nwanyị onye mmehie chọsiri ike inweta mgbaghara nke mere na ọ bara n’ụlọ otu onye ndú okpukpe dị ukwuu. A kpọghị ya, o rughị eru ịbata n'ụdị ebe ahụ, anabataghị ya. N’ịdị umeala n’obi, ọ dara n’ala n’ihu Jizọs. Ọ kwara ákwá. Anya mmiri ya dakwasịrị n’ụkwụ Jizọs, o wee susuo ụkwụ Ya ọnụ, werekwa ntutu isi ya hichapụ anya mmiri ya dị n'ukwu Jizọs. Ka ọ na-awụsa mmanụ na-esi ísì ụtọ dị oké ọnụ n’ụkwụ Ya, ísì mmanụ ahu jupụtara n’ime ụlọ ahụ nile.

Ndị ọzọ nwerè ike ịgbaghara anyị ma ọ bụ ghara ịgbaghara anyị mgbe anyị mejọrọ ha. Ma mgbe anyị tụdara onwe anyị n’ịdị umeala n’obi n’ụkwụ Jizọs jiri obi tiwara etiwa n’ihi mmehie anyị, Ọ dịghị akwapụ anyị. Ọ sịrị anyị: “A gbagharawo unu mmehie unu.”

Tụgharịa Uche Ma Kparịta Ụka

Nwaanyị a akọrọ akụkọ ya biri ndụ mmehie dị ukwuu ma mee ihe ọjọọ dị ukwuu n’anya Chineke. Gịnị merè i ji chee na Jizọs gbaghaarà ya?

Ọ̀ nà-adị gị ka i rughị eru ka a kpọọ gị nwa Chineke? Gịnị kpatara nke a?

Ọ bụrụ na gị ekwupụta mmehie gị, Jizọs Ọ gà-agbaghara gị? Gịnị ka akụkọ a na-akụziri anyị banyere njikere Chineke dị ịgbagharà anyị?

Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume ná mgbaghara ahụ?

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Following Jesus Our Mediator

Onye arịrịọ kpurú ìsì ná-etí mkpu n'akụkụ okporo ụzọ, nwaanyị ná-emé omume rụrụ arụ nke ọha mmadụ nweré nkwanye ùgwù ledarà anya dị ka onye ruru unyi, onye ọrụ gọọmenti rụrụ arụ nke mmadụ nile kpọrọ asị —olee otú ndị a siteré n'akụkụ ọha mmadụ e lepụrụ anya gà-esi nwee olileanya na ha gà-emekata bịakwute Chineke dị nsọ nso? Dabere ná nghọta-ime ndị sitere n’akwụkwọ Luk n’ime Baịbụl Ọmụmụ Afrika, gbasoo Jizọs ka Ọ nà-edozi nkewa na mgbawa dị n’etiti Chineke na ndị e kewapụrụ ekewapụ̀.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Oasis International Ltd maka inye anyị atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://Oasisinternationalpublishing.com