Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iso Jizọs Ọnụ N'ekwuchitere AnyịIhe Nhụchatụ

Following Jesus Our Mediator

ỤBỌCHỊ 2 NKE 7

Jizọs Na Ndị Ogbenye

Ịda ogbenye na-enwe ọtụtụ ụdị, nke mmụọ yana ihe onwunwe. Jizọs nyeerè ndị nọ n’ụdị ịda ogbenye ọ bụla aka.

Site naAfrica Study Bible ndetu á pụrụ iji wee mee ihe akpọrọ “Ịda Ogbenye Nke Mmụọ”:

Ọtụtụ ndị ogbenye gbakọrọ ka ha nụ ozi Jizọs n’elu ugwu. Ha maarà na ha chọrọ enyemaka kwa ụbọchị ka ha wee dị ndụ. Jizọs nwerè mmasị ha ma kwe ha nkwa Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-enye ha ọṅụ, ọgwụgwọ, na ngọzi zuru ezu nke Chineke. Iji nweta ya, ha aghaghị ịghọta mkpa ha nwerè maka ya. Jizọs ji ndị ogbenye gosi mkpa ọ dị onye ọ bụla ịbịakwute Chineke mgbe ha matarà ịda ogbenye nke ha.

Ndị n'enweghị ka-orà ha na-enwekarị mmụọ dị ala na obere mkpali ime ihe ọ bụla. Ha na-enwe nkụda mmụọ, o nwekwarà ike ha agaghị ahụ ihe mere ha gà-eji na-adị ndụ. Ọbụna nke ka njọ, ndị dị otú ahụ na-eche na ha apụghị itinye olileanya ha n'usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ọha mmadụ. Ụwa na ikpe na-ezighị ezi ya emebiwo mmụọ ha site n'ịda ogbenye. N'oge obi nkoropụ nke a, naanị Alaeze Chineke na-enye olileanya maka mweghachi.

Ala-eze Chineke abụghị naanị maka onye ogbenye ma ọ bụ onye bara ọgaranya, kama ọ bụ maka onye ọ bụla nke ghọtara mkpa alaeze Chineke dị. Ọ bụrụ na anyị darà ogbenye, anyị ekwesịghị iledà ihe ọmụma mbụ anyị nwerè banyere ịda ogbenye anya mgbe ọ na-enye anyị ohere ịghọta ogo anyị chọrọ Chineke n’ezie. Ọ bụ nghọta nke mkpa nke anyị, merè ka anyị keta alaeze nke eluigwe dịka nke anyị.

Tụgharịa Uche Ma Ọ Bụ Kparịta Ụka

N'ụzọ dị aṅaa ka ị nwetarà ịda ogbenye ma ọ bụ ikpe na-ezighị ezi na ndụ gị? Olee otú ahụmahụ ndị a si metụta ndụ gị na ụzọ i si ebi?

Gịnị merè o ji dị ịrịba ama na Alaeze Chineke abụghị naanị maka ndị ọgaranya, ma ọ bụ naanị makà ndị nwere àbamúrù ná ndụ?

Olee otú ikpe na-ezighị ezi nke ụwa a na ọnọdụ ịda ogbenye gà-esi nyere anyị aka ịghọta na Chineke dị anyị mkpa?

N’ụzọ ndị dị aṅaa ka okwu Jizọs si bụrụ ozi ọma nye ndị n'ime anyị na-eche ikpe na-ezighị ezi ihu?

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Following Jesus Our Mediator

Onye arịrịọ kpurú ìsì ná-etí mkpu n'akụkụ okporo ụzọ, nwaanyị ná-emé omume rụrụ arụ nke ọha mmadụ nweré nkwanye ùgwù ledarà anya dị ka onye ruru unyi, onye ọrụ gọọmenti rụrụ arụ nke mmadụ nile kpọrọ asị —olee otú ndị a siteré n'akụkụ ọha mmadụ e lepụrụ anya gà-esi nwee olileanya na ha gà-emekata bịakwute Chineke dị nsọ nso? Dabere ná nghọta-ime ndị sitere n’akwụkwọ Luk n’ime Baịbụl Ọmụmụ Afrika, gbasoo Jizọs ka Ọ nà-edozi nkewa na mgbawa dị n’etiti Chineke na ndị e kewapụrụ ekewapụ̀.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Oasis International Ltd maka inye anyị atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://Oasisinternationalpublishing.com