Iso Jizọs Ọnụ N'ekwuchitere AnyịIhe Nhụchatụ

Jizọs Ọnụ N'ekwuchitere Anyị
N’ime izu a, anyị ahụla kà Jizọs na-esetipú aka ọma Ya nye ndị ogbenye, ndị a na-emegbu emegbu, ndị na-atụ ụjọ, ndị mmehie, na ndị niile ọha mmadụ na-akpagbu. N'ime omume kachasị elu nke nkwuchite, ọnwụ Ya, na mbilite n’ọnwụ Ya, O bukwasịrị Onwe Ya ntaramahụhụ maka mmehie anyị nile ka anyị na Chineke dị ná mma otu ugboro na mgbe nile.
Site na Africa Study Bible mmụta ihe a kpọrọ “Jizọs, Ọnụ N'ekwuchitere Ụmụ Mmadụ”:
Nkwuchite bụ ihe ewuberè n'omenala ndị Afrịka dịka ngwaọrụ siri ike maka idozi esemokwu. Na omenala, a na-ahazi ọtụtụ alụmdi na nwunye n'Afrịka n'ihu ndị aka-ebe. Ndị a bụ ndị di na nwunye ahụ gà-agakwuru ma ọ bụrụ na ha enwee nsogbu chọrọ enyemaka. Ọ bụrụ na obodo abụọ ana-ese okwu taa, ndị okenye si n’akụkụ obodo abụọ ahụ na-ezukọ n’ihu ndị ọzọ ka ha kpaa nkata udo. Mgbe mba dị iche iche na-alụ agha, Òtù Mba Ụwa na-ezipụ ndị ozi udo ka ha gbalịa ịkwụsị agha ahụ. Ndị aka-ebe, ndị nnọchiteanya na ndị ozi udo niile na-arụ ọrụ nke ndị nkwuchite. Ha na-agbazi n'etiti ndị otù na-ese okwu iji nyere ha aka weghachi udo na mmeko.
Kraịst bịara dịka onye nkwuchite—onye nkwuchite zuru oke. O nweghị mmehie, aka Ya dị ọcha na mpụ ọbụ́ n'anyị merè. Ma dị ka onye nkwuchite n’etiti ndị dị ike na ndị na-enweghị ike, O weerè ọnọdụ anyị.
Kraịst kwụrụ ụgwọ kacha elu wee kwe nkwa na onye ọbụla kwere na Ya agaghị enweta ntaramahụhụ ahụ. Kama, onye kwere na Ya gà-enweta ndụ ebighị ebi. Site na Kraịst, ma ọ bụ nanị site n’aka Ya ka ndị mmadụ na Chineke pụrụ idi n’udo. “N'ihi na e nwerè otu Chineke na otu onye nkwuchite nke pụrụ ime ka Chineke na mmadụ dị ná mma—nwoke ahụ bụ́ Kraịst Jizọs. O nyere ndụ Ya ka O wee zụta nnwere onwe maka onye ọ bụla” (1 Timoti 2:5-6).
Tụgharịa Uche Ma Ọ Bụ Kparịta Ụka
Gịnị merè Jizọs ịbụ Onye Nkwuchite anyị jirì dị anyị mkpa?
Jizọs jerè ozi dị ka Onye Nkwuchite zuru oke, na-anata ntaramahụhụ kwesịrị anyị maka mmehie anyị. Gịnị merè i ji chee na Jizọs dị njikere imere anyị ihe a?
Gị na Chineke ọdị n'udo? Ọ bụrụ na ọ bụghị, gịnị bụ naanị ụzọ gị na Ya gà-esi dị ná mma?
Ọ bụrụ na ị tụkwasịghị obi gị na Jizọs, Onye Nkwuchite Ukwu nke mmadụ, ekwela ka ụbọchị ọzọ gafee mà ịchọtaghị onye ga-eso gị kpee ekpere gbasara nke a.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Onye arịrịọ kpurú ìsì ná-etí mkpu n'akụkụ okporo ụzọ, nwaanyị ná-emé omume rụrụ arụ nke ọha mmadụ nweré nkwanye ùgwù ledarà anya dị ka onye ruru unyi, onye ọrụ gọọmenti rụrụ arụ nke mmadụ nile kpọrọ asị —olee otú ndị a siteré n'akụkụ ọha mmadụ e lepụrụ anya gà-esi nwee olileanya na ha gà-emekata bịakwute Chineke dị nsọ nso? Dabere ná nghọta-ime ndị sitere n’akwụkwọ Luk n’ime Baịbụl Ọmụmụ Afrika, gbasoo Jizọs ka Ọ nà-edozi nkewa na mgbawa dị n’etiti Chineke na ndị e kewapụrụ ekewapụ̀.
More