Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iso Jizọs Ọnụ N'ekwuchitere AnyịIhe Nhụchatụ

Following Jesus Our Mediator

ỤBỌCHỊ 6 NKE 7

Jizọs Na Ndị Nrụrụ-Aka

A na-akpọ ndị ọrụ gọọmenti rụrụ arụ asị, ndị ha na-emegbu n'atukwá ha egwù. Mana Jizọs n'esetipú aka nzọpụta nye ndị n'emegbu na ndị a na-emegbu emegbu.

Site n'akwụkwọ Africa Study Bible nke akpọrọ “Nzute Na-agbanwe Ndụ”:

Zakịọs chọrọ ịhụ onye Jizọs bụ̀. O merè mgbalị dị mkpa site n’ịgba ọsọ n’ihu ma rịgoro n’elu osisi nanị ka o wee hụ Jizọs nke ọma. Zakịọs gaarà enwe afọ ojuju nanị ilere Jizọs anya. Otú ọ dị, Jizọs nyerè Zakịọs ahụmahụ bara uru karịa.

Mgbe Zakịọs zuterè Jizọs n'Onwe Ya, ọ pụghịkwa ịga n'ihu n'azụmahịa ịnara ụtụ dị ka ọ na-emebu. Na mbụ, ọ na-aghọgbu ndị mmadụ, mana ugbu a ọ ma na ya aghaghị ịkwụsị ịghọgbu ndị mmadụ ma kwụghachi ihe o zurù. Zakịọs kwetarà na akwụwaghị aka ọtọ ya bụ ihe kpatara ịda ogbenye gbara ya gburugburu. O nwerè mmetụta ọhụrụ n'ebe ndị obodo ya nọ.

Zakịọs bụ ihe atụ nke onye chọsiri ike ịmata Jizọs. N'aka nke ya, Jizọs gosiri ya ụzọ ndụ ọhụrụ. Zakịọs nabatarà ya nke ọma site n'ịgbanwe ụkpụrụ na omume ya. Ọ bụrụ na anyị achigharịkwuté Jizọs, ndụ anyị gà-agbanwe.

Ozi sitere n’akụkọ Zakịọs bụkwa na ozi ọma ahụ nwerè ike iru onye ọ bụla, ọbụna ndị rụrụ arụ ma ndị n'emegbu ndị ọzọ. Ma ị bụ̀ onye a kacha eleda anya na ọha mmadụ, onye mkpọrọ, onye na-ere ọgwụ ọjọọ, ma ọ bụ̀ onye ka ihe niile ndị a njọ, onyinye nzọpụta Jizọs na ụzọ ndụ ọhụrụ dị chere gị.

Tụgharịa Uche Ma Ọ Bụ Kparịta Ụka

Jizọs họọrọ ịbụ ọbịa Zakịọs n’agbanyeghị na ndị mmadụ kwuru na O kwesịghị ime ya. Gịnị merè Jizọs jirì gaa n’ụlọ onye ajọ omume?

N’ihi gịnị ka Zakịọs ji chọọ ịhụ Jizọs n’agbanyeghị omume rụrụ arụ o n'eme?

Gịnị si na nleta Jizọs pụta ná ndụ Zakịọs na n’obodo ya?

Jizọs Ò metụtalá ndụ gị? Ọ bụrụ ezie, kedụ mmetụta nke ahụ na-enwe n'obodo gị?

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Following Jesus Our Mediator

Onye arịrịọ kpurú ìsì ná-etí mkpu n'akụkụ okporo ụzọ, nwaanyị ná-emé omume rụrụ arụ nke ọha mmadụ nweré nkwanye ùgwù ledarà anya dị ka onye ruru unyi, onye ọrụ gọọmenti rụrụ arụ nke mmadụ nile kpọrọ asị —olee otú ndị a siteré n'akụkụ ọha mmadụ e lepụrụ anya gà-esi nwee olileanya na ha gà-emekata bịakwute Chineke dị nsọ nso? Dabere ná nghọta-ime ndị sitere n’akwụkwọ Luk n’ime Baịbụl Ọmụmụ Afrika, gbasoo Jizọs ka Ọ nà-edozi nkewa na mgbawa dị n’etiti Chineke na ndị e kewapụrụ ekewapụ̀.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Oasis International Ltd maka inye anyị atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://Oasisinternationalpublishing.com