Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iso Jizọs Ọnụ N'ekwuchitere AnyịIhe Nhụchatụ

Following Jesus Our Mediator

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

Nje Ozi Jizọs

N’oge a ná ndụ Jizọs, akụkọ banyere Ya nọ na-agbasa n’ógbè ahụ, ndị bi n’obodo Ya bụ́ Nazaret chọkwara ịma gbasara Ya. Iji zaa ajụjụ ha, Jizọs, mgbe O rurù ịgụ Akwụkwọ Nsọ n’ụlọ nzukọ, megherè mpịakọta akwụkwọ Aịzaya ma gụọ otu amụma oge ochie banyere Onwe Ya na ozi Ọ bịara ijé. Ọ bịara izi 'Ozi Ọma' nye ndị ogbenye, ndị a dọọrọ n’agha, ndị ìsì, na ndị a na-emegbu emegbu. Chineke hụrụ ọbụna ndị a na-ekewapu ekewapu n'anya wee malite atụmatụ ịzọpụta ha— atụmatụ nke ga-emecha mezuo n'ọnwụ na mbilite n'ọnwụ nke Jizọs ọnụ n'ekwuchitere anyị.

Site na Africa Study Bible Ilu na Isi Akụkọ Gasị aha ha bụ̀ "Eziokwu Gasị N'adịghị Nfe":

Ndị Nazaret tụgharịrị megide Jizọs n’ihi na ha cherè na Jizọs na-ama ha ikpe site n’izò aka Ya banyere ndị Jentaịlụ ndị natara amara Chineke karịa ndị Juu (Luk 4:23-28). Ilu Igbo na ndịda-ọwụwa anyanwụ Naijiria na-ekwu, sị, “Mgbe a na-ekwu okwu gbasara ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, agadi nwaanyị anaghị anọkwatá”.

Mgbe ndị mmadụ nụrụ eziokwu gbasara onwe ha, ahụ́ anaghị eru ha ala. Ozi nke na-eme ka ndị mmadụ ghara ịma jijiji eleghị anya enweghị eziokwu nke metụtara ndị na-ege ya ntị.

Ka ị na-agụ Oziọma n'Akwụkwọ Nsọ, ị ​​pụrụ ịhụ okwu ndị siri ike na ihe ndị na-egbu mgbu ihu. Isi ihe bụ ịgụ na ịge ntị ka obi gị ghere oghe maka ozi Kraịst.

Tụgharịa Uche Ma Ọ Bụ Kparịta Ụka

Olee otú Jizọs sì kọwaa ozi Ya?

N'ụzọ dị aṅaa ka ị gà-esi tinye ozi Ya n'ọrụ ná ndụ gị?

N’agbanyeghị ozi Jizọs n'eje iji wèté Oziọma, ndị obodo Ya jụrụ Ya. Gịnị merè i ji chee na n’agbanyeghị na okwu ọma Ya tụrụ ha n’anya, eziokwu O kwuru kpasurù ha iwe?

Ị̀ mà onye na-ekwusa Oziọma Jizọs n’ezie? Gịnị ka ị gà-amụta n'aka ha?

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Following Jesus Our Mediator

Onye arịrịọ kpurú ìsì ná-etí mkpu n'akụkụ okporo ụzọ, nwaanyị ná-emé omume rụrụ arụ nke ọha mmadụ nweré nkwanye ùgwù ledarà anya dị ka onye ruru unyi, onye ọrụ gọọmenti rụrụ arụ nke mmadụ nile kpọrọ asị —olee otú ndị a siteré n'akụkụ ọha mmadụ e lepụrụ anya gà-esi nwee olileanya na ha gà-emekata bịakwute Chineke dị nsọ nso? Dabere ná nghọta-ime ndị sitere n’akwụkwọ Luk n’ime Baịbụl Ọmụmụ Afrika, gbasoo Jizọs ka Ọ nà-edozi nkewa na mgbawa dị n’etiti Chineke na ndị e kewapụrụ ekewapụ̀.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Oasis International Ltd maka inye anyị atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://Oasisinternationalpublishing.com