ABÙ ỌMA 133
133
Abú Nrigo; nke Devid.
1Le, ka o si di nma, ka o si di kwa utọ nke-uku,
Bú nbikọ nke umu-nne, ọbuná ibikọ n'otù!
2Ọ di ka ezi manu ahu nke dikwasi n'isi,
Nke nērùda n'afu-ọnu,
Bú afu-ọnu Eron;
Nke nēruda n'ọnu uwe-nwuda-ya nile;
3Dika igirigi Heamon,
Nke nādakwasi n'ugwu nile nke Zaion:
N'ihi na n'ebe ahu ka Jehova nyere ngọzi ahu iwu,
Bú ndu rue mb͕e ebighi-ebi.
Currently Selected:
ABÙ ỌMA 133: IGBOB
Highlight
Copy
Compare
Share
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.