YouVersion Logo
Search Icon

LUK 8

8
1O we rue mb͕e nwa oge gasiri, na Ya onwe-ya nāgaghari n'obodo na obodo ntà di iche iche, nēkwusa nēzikwa ozi ọma ala-eze Chineke, Ya na ndi-ozi iri na abua ahu, 2na ndinyom ufọdu ndi emereri ka aru-ha di ike site n'ichupu ndi-mọ ọjọ na igwọ nriaria, Meri nke akpọrọ Magdalini, onye mọ ọjọ asa siwori nime ya puta, 3na Joana nwunye Kuza onye Herod tiyere ihe-ya n'aka, na Susana, na ọtutu ndi ọzọ, ndi nēweputa ihe ha nwere ime ezi ha.
4Ma mb͕e oké ìgwè madu nēzukọ, mb͕e ndi si n'obodo nile nābiakute kwa Ya, O we kwue okwu site n'ilu: 5Ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru-ya: mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n'akuku uzọ; ewe zọkwasi ha ukwu, anu-ufe nke elu-igwe we tuturie ha. 6Nkpuru ọzọ we da n'elu oké nkume; mb͕e ha puru ome, ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi ala miri. 7Nkpuru ọzọ we da n'etiti ogwu; ogwu ahu we so ha pue, kpab͕ue ha. 8Nkpuru ọzọ we da n'ezi ala, ha we pue, we mia nkpuru ọgu ise ọgu ise. Mb͕e O nēkwu okwu ndia, O tie nkpu, si, Onye nwere nti inu ihe, ya nu.
9Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya ihe ilu a gābu. 10O we si, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze Chineke: ma ndi fọduru ka anāgwa okwu n'ilu; ka ha ghara ihu n'ọhuhu, ghara kwa inuta n'ọnunu. 11Ma ilu ahu bu nka: Nkpuru ahu bu okwu Chineke. 12Ndi nọ n'akuku uzọ ahu bu ndi nuru; mb͕e ahu ekwensu bia, we napu okwu ahu n'obi-ha, ka ha ghara ikwere, ewe zọputa ha. 13Ndi nọ kwa n'oké nkume ahu bu ndi were ọṅù nara okwu ahu mb͕e ọ bula ha nuru ya; ma ndia enweghi nkpọrọgwu, ndi kwere na nwa oge, ma n'oge ọnwunwa ha wezuga onwe-ha. 14Nkpuru nke dara n'etiti ogwu ahu, ndia bu ndi nuru, ma mb͕e ha nāga n'uzọ-ha ncheb͕u na àkù na ihe-utọ nke ndu anākpab͕u ha, ha amighi ezi nkpuru. 15Nkpuru nke di n'ala ọma ahu, ndia bu ndi were ezi obi di nma jisie okwu ahu ike, mb͕e ha nuru ya, ha were kwa ntachi-obi mia nkpuru.
16Ma ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ muyere oriọna, nēkpuchi ya n'ihe, ma-ọbu dọba ya n'okpuru ihe-ndina; kama ọ nādọba ya n'elu ihe-idọba-oriọna, ka ndi nke nābà nime we hu ìhè-ya. 17N'ihi na ọ dighi ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-eme ka ọ puta ìhè; ọ dighi kwa ihe di nzuzo, nke anāgaghi-ama, me kwa ka ọ puta ìhè. 18Ya mere, lezienu anya otú unu si anu: n'ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye; onye ọ bula nēnweghi kwa, ọbuná ihe ọ nēchè na o nwere ka agānapu ya.
19Ma nne-Ya na umu-nne-Ya biakutere Ya, ma ha apughi ibiaru Ya nso n'ihi ìgwè madu ahu. 20Ewe si Ya, Nne-gi na umu-nne-gi nēguzo n'èzí, nāchọ ihu Gi anya. 21Ma Ọ zara, si ha, Nnem na umu-nnem bu ndia ndi nānu okwu Chineke, nēme kwa ya.
22O rue n'otù nime ubọchi ahu, na Ọ batara n'ub͕ọ, Ya onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya; O we si ha, Ka ayi gabiga n'ofè ọdọ-miri a ọzọ: ha we nupu. 23Ma mb͕e ha nēje Ọ da n'ura: oké ajọ ifufe we da n'ọdọ-miri ahu; miri nēju kwa n'ub͕ọ-ha, ha we nọdu n'ọnu ọnwu. 24Ha we biakute Ya, kpọte Ya, si, Nna-ayi, Nna-ayi, ayi nāla n'iyì. O we teta, bara ifufe na ebili-miri mba: ha we da juu, ndaju we di. 25O we si ha, Òle ebe ka okwukwe-unu di? Ha we tua egwu, o ju ha anya, ha sirita onwe-ha, Ònye bu kwa Onye a, na Ọ nēnye ọbuná ifufe na miri iwu, ha nāṅa kwa Ya nti?
26Ha we rue ala ndi Gerasa, nke di na ncherita-iru Galili. 27Ma mb͕e O siri n'ub͕ọ puta rigo n'ala, otù nwoke nke si n'obodo ahu puta zutere ya, bú onye nwere ndi-mọ ọjọ; ma na mb͕e di anya ọ dighi uwe o yiri, o bighi kwa n'ulo, kama n'ebe anēlì ozu. 28Ma mb͕e ọ huru Jisus, o tisie nkpu ike, da kwa n'ala n'iru Ya, were oké olu si, Gini ka mu na Gi nwekọrọ, Jisus, Ọkpara Chineke Nke kachasi ihe nile elu? ariọm Gi, emekpalam aru. 29N'ihi na O nyere mọ ahu nādighi ọcha iwu ka o si nime nwoke ahu puta. N'ihi na ọtutu mb͕e ka ọ nējisi ya ike: anēche kwa ya nche, ewere kwa nkpọrọ na nkpọrọ-ukwu ke ya; o we nyajipu ihe eji ke ya, mọ ọjọ ahu we churu ya ba n'ọhia. 30Jisus we jua ya, si, Òle aha-gi? Ọ si, Legion; n'ihi na ọtutu ndi-mọ ọjọ bàra nime ya. 31Ha we riọ Ya ka ọ ghara inye ha iwu ka ha je ba n'abyss. 32Ma ìgwè ọtutu ezì di n'ebe ahu nāta nri n'ugwu: ha we riọ Ya ka O kwere ha ka ha ba nime ha. O we kwere ha. 33Ndi-mọ ọjọ ahu we si nime nwoke ahu puta, ba nime ìgwè ezì ahu: ìgwè ezi ahu we nuda n'ebe ahu di nkputankpu dabà n'ọdọ-miri, miri we b͕ab͕ue ha. 34Ma mb͕e ndi nāzù ha huru ihe emereri, ha b͕alaga, kọsa ya n'obodo ahu na gburugburu ya nile. 35Ha we pua ihu ihe emereri; ha we biakute Jisus, we hu nwoke ahu, nke ndi-mọ ọjọ siri nime ya puta, ka ọ nọduru ala n'ukwu Jisus, yiri uwe, uche-ya zu-kwa-ra okè: ha we tua egwu. 36Ndi huru ya we kọrọ ha otú azọputara onye ahu ndi-mọ ọjọ ji. 37Ọra nile nke ala ndi Gerasa di ya gburugburu we kpere Ya ka O si n'ebe ha nọ la; n'ihi na ha nātu oké egwu: O we ba nime ub͕ọ, laghachi. 38Ma nwoke nke ndi-mọ ọjọ siri nime ya puta nāriọ Ya ka ya na Ya biri: ma O zilagara ya, si, 39Laghachi n'ulo-gi, kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke meworo gi. O we je, nēkwusa n'obodo ahu dum ihe Jisus mere ya, ka ha ra.
40Ma mb͕e Jisus laghachiri, ìgwè madu ahu nara Ya nke-ọma; n'ihi na ha nile nēle anya Ya. 41Ma le, otù nwoke, aha-ya bu Jeairọs, biara, ya onwe-ya bu kwa onye-isi ulo-nzukọ: o we da n'ala n'ukwu Jisus, we riọ Ya ka Ọ bia n'ulo-ya; 42n'ihi na o nwere nwa-nwanyi ọ muru nání ya, nke b͕ara ihe ra ka arọ iri na abua, nwata ahu nānwu kwa anwu. Ma mb͕e Ọ nēje ìgwè madu nile nākpab͕u Ya.
43Otù nwanyi nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, nke mefusiri ihe dum o ji biri n'aru ndi-dibia, ma ọ dighi onye ọ bula nwere ike ime ka aru-ya di ike, 44nwanyi ahu we bia n'azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka: ngwa ngwa orùrù-ọbara-ya we guzo. 45Jisus we si, Ònye bu onye ahu nke meturum aka? Ma mb͕e madu nile di nāgo, Pita na ndi ya na ha yikọ si, Nna-ayi, ìgwè madu ndia nādagide Gi nākpab͕u kwa Gi. 46Ma Jisus siri, Madu meturum aka: n'ihi na Mu onwem mara na ike esiwori n'arum puta. 47Ma mb͕e nwanyi ahu huru na o zoghi ezo, o were ima-aru-jijiji bia, we da n'iru Ya, kọ n'iru ndi-Ju ahu nile ihe mere o ji metu Ya aka, na otú esi me ka aru di ya ike ngwa ngwa. 48Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo.
49Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, otù onye si n'ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu bia, si, Nwa-gi nwayi anwuruwo; esob͕u-kwa-la Onye-ozizí a ọzọ. 50Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ za ya, si, Atula egwu: kwere nání, agāzọputa kwa ya. 51Ma mb͕e Ọ biaruru ulo ahu, O kweghi onye ọ bula so Ya ba, ma-ọbughi Pita, na Jọn, na Jemes, na nna nwata-nwayi ahu na nne-ya. 52Ma madu nile nākwa ákwá, nēti kwa aka n'obi n'ihi ya: ma Ọ siri, Unu akwala ákwá; n'ihi na ọ nwughi anwu, kama ọ nāraru ura. 53Ha we chìa Ya ọchì, ebe ha matara na ọ nwuru anwu. 54Ma Ya onwe-ya jidere ya n'aka, we kpọ, si, Nwata-nwanyi, bilie. 55Mọ-ya we lata, o wè bilie ngwa ngwa: O we si ka enye ya ihe-oriri. 56Ibobo we nwubiga ndi muru ya ókè n'aru: ma O nyere ha iwu ka ha ghara igwa onye ọ bula ihe emereri.

Currently Selected:

LUK 8: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy