YouVersion Logo
Search Icon

LUK 7

7
1Mb͕e O kwubìri okwu-Ya nile na nti ndi-Ju, O we ba na Kapanaum. 2Ma aru adighi orù otù ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise mma, onye di ya oké ọnu-ahia, ọ nọ n'ọnu ọnwu. 3Mb͕e ọ nuru ihe bayere Jisus, o we zigara Ya ndi-okenye nke ndi-Ju, nārio Ya ka Ọ bia zọputa orù-ya. 4Ma mb͕e ha biakutere Jisus, ha riọsie Ya ike, si, Ọ bu onye kwesiri ka I mere ya ihe a: 5n'ihi na ọ nāhu mba-ayi n'anya, ya onwe-ya wukwara ulo-nzukọ-ayi nye ayi. 6Jisus we so ha ga. Ma mb͕e Ọ nādighi n'ebe di anya n'ulo-ya ub͕u a, ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise we zigara Ya ufọdu ndi-enyì-ya, si Ya, Onye-nwe-ayi, esob͕ula Onwe-gi: n'ihi na erughm ka I ba n'okpuru ulom: 7n'ihi nka agughm onwem onye kwesiri ibiakute Gi: kama were okwu-ọnu kwue, agēme kwa ka aru onye nējerem ozi di ike. 8N'ihi na mu onwem bu kwa onye edoro n'okpuru ike, nēnwe ndi-agha n'okpuru mu onwem: m'we si onye a, Ga, ọ ga; m'si kwa onye ọzọ, Bia, ọ bia; m'si kwa orùm, Me nka, o me ya. 9Ma mb͕e Jisus nuru ihe ndia, o juru Ya anya n'ihi ya, o we chigharia, si ìgwè madu nke nēso Ya, Asim unu, ọ dighi mb͕e M'huru oké okwukwe di otú a, ọbuná n'Israel. 10Ndi ezitere we laghachi n'ulo-ya, hu ka aru di orù ahu nma.
11O rue, mb͕e nwa oge gasiri, na Ọ garuru obodo anākpọ Nain; ndi nēso uzọ-Ya we so Ya ga, ha na oké ìgwè madu. 12Ma mb͕e Ọ biaruru nso ọnu-uzọ-ama obodo ahu, le, anēbupu otù onye nwuru anwu, bú nwa-nwoke nke nne-ya muru nání ya, nwanyi ahu bu kwa onye di-ya nwuru: oké ìgwè nke ndi obodo ahu soro kwa ya. 13Mb͕e Onye-nwe-ayi huru ya, O we nwe ọmiko n'aru ya, si ya, Akwala ákwá. 14O we biaru nso, metu ib͕e ozu ahu aka: ndi nēbu ya we guzo. O we si, Nwa-okorọbia, gi ka M'nāsi, Bilie. 15Onye ahu nke nwuru anwu we nọlie, malite ikwu okwu. O we were ya nye nne-ya. 16Madu nile we tua egwu: ha we nye Chineke otuto, si, Onye-amuma uku ebiliwo n'etiti ayi: ha si kwa, Chineke eletawo ndi-Ya. 17Okwu a bayere Ya we pua gazue na Judia dum, na ala nile di ya gburugburu.
18Ndi nēso uzọ Jọn we kọrọ ya akukọ bayere ihe ndia nile. 19Jọn we kpọ madu abua biakute ya nime ndi nēso uzọ-ya, zigara Onye-nwe-ayi, si, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye ọzọ? 20Ma mb͕e ndikom ahu biakutere Ya, ha si, Jọn Baptist ezìwo ayi biakute Gi, si, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye ọzọ? 21N'oge hour ahu O mere ka aru ọtutu madu di ike site n'ọria na ajọ ọria di iche iche na ndi ajọ mọ; O were kwa amara me ka ọtutu ndi-ìsì hu uzọ. 22O we za, si ha, Ganu, kọrọ Jọn ihe nile unu huru na nke unu nuru; ndi-ìsì nāhu uzọ, ndi- ngwurọ nēje ije, anēme ndi-ekpenta ka ha di ọcha, ndi nti chiri nānu ihe, anēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, anēzì ndi-ob͕eye ozi ọma. 23Ngọzi nādikwara onye ahu, bú onye ọ bula nke nāgaghi-ama n'ọnyà n'arum.
24Ma mb͕e ndi-ozi Jọn lasiri, Ọ malitere igwa ìgwè madu nile okwu bayere Jọn, si, Ọ̀ bu gini ka unu puru je n'ọhia ka unu kiri? àmì nke nēme nkpatu site n'ifufe? 25Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? nwòke eyikwasiworo uwe di biali-biali? Le, ndi nēyi ezi uwe kachasi mma, ndi bi kwa n'oké oriri na oké ọṅuṅu, nọ n'ulo ndi-eze. 26Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? ònye-amuma? E, asim unu, onye kari kwa onye-amuma nke-uku. 27Nwoke a bu onye edeworo ihe n'akwukwọ nsọ bayere ya, si,
Le, Mu onwem nēziga onye-ozim n'iru Gi,
Onye gēmezi uzọ-Gi n'iru Gi.
28Asim unu, N'etiti ndi ndinyom muru ọ dighi onye ka Jọn uku: ma onye dikariri ntà n'ala-eze Chineke ka ya uku. 29Mb͕e ndi-Ju nile nuru Ya, ha na ndi-ọna-utu, ha we gua Chineke n'onye ezi omume, ebe ejiri baptism nke Jọn me ha baptism. 30Ma ndi-Farisi na ndi-iwu juru n'onwe-ha ìzù Chineke, ebe ọ nēmeghi ha baptism. 31Gini kwa ka M'gēji madu nke ọbọ a tuyere, gini kwa ka ha yiri? 32Ha yiri umu-ntakiri ndi nānọdu n'ọma-ahia, nākpọ kwa ibe-ha òkù; ndi nāsi, Ayi b͕uru unu ọ̀jà, ma unu eteghi egwú; ayi kwara ákwá, ma unu etighi mkpu ákwá. 33N'ihi na Jọn Baptist abiawo nērighi achicha nāṅughi kwa manya-vine; unu we si, O nwere mọ ọjọ. 34Nwa nke madu abiawo nēri ihe-oriri nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu; unu we si, Le, onye-ori-nke-uku, na onye-oké-ọṅu-manya, enyì ndi-ọna-utu na ndi-nmehie! 35Agukwara amam-ihe n'onye ezi omume site n'umu-ya nile.
36Otù onye n'etiti ndi-Farisi we kpere Ya ka O so ya rie ihe. O we ba n'ulo onye-Farisi ahu, we nọdu na nri. 37Ma le, otù nwanyi nke nọ n'obodo ahu, bú onye-nmehie; mb͕e ọ mara nke-ọma na Ọ nọduru na nri n'ulo onye-Farisi ahu, o we weta ite alabaster nke manu-otite di ya nime, 38we guzo n'azu n'ukwu-Ya, nākwa ákwá, we malite iwere anya-miri-ya desa ukwu-Ya abua, o were kwa agiri-isi-ya hicha ha, o we sutu ukwu-Ya ọnu nke-uku, were manu-otite ahu te ha. 39Ma mb͕e onye-Farisi nke kpọrọ Ya huru ya, o kwue n'onwe-ya, si, Nwoke a, asi na Ọ bu onye amuma, Ọ gāmara onye nwanyi a bu nke nēmetu Ya aka, na aha madu ọ bu, na ọ bu onye-nmehie. 40Jisus we za, si Ya, Saimon, enwerem okwu M'gāgwa gi. O we si, Onye-ozizí, kwue. 41Otù onye nke nēbinye madu ihe nwere madu abua ji ya ugwọ: otù onye ji ya nnù shilling na ọgu ise, ibe-ya ji kwa ya ọgu abua na iri. 42Ebe ha nēnweghi ihe ha gēji kwughachi ya ugwọ, ọ were amara b͕aghara ha abua. Ònye kwa n'etiti ha abua gāhu kari ya n'anya? 43Saimon we za, si, Ọ dim ka onye o were amara b͕aghara kari. O we si ya, I kpeziri. 44Mb͕e O chigharisiri n'ebe nwanyi ahu nọ, Ọ si Saimon, Ì huru nwanyi a? Abataram n'ulo-gi, i nyeghi m miri iji sa ukwu: ma nwanyi a were anya-miri-ya desa ukwum, were kwa agiri-isi-ya hicha ha. 45I sutughm ọnu: ma nwanyi a, site na mb͕e M'batara, ọ rapughi isutu ukwum ọnu nke-uku. 46I weghi manu tem n'isi: ma nwanyi a were manu-otite tem n'ukwu. 47N'ihi nka asim i, Ab͕agharaworo ya nmehie-ya, nke di ọtutu; n'ihi na ọ hurum n'anya nke-uku: ma onye ab͕aghara ihe ntà, onye ahu nāhu n'anya nke-ntà. 48O we si nwayi ahu, Ab͕agharaworo gi nmehie nile gi. 49Ndi ha na Ya nọduru na nri we malite isirita onwe-ha, Ònye bu Onye a, Nke nāb͕aghara kwa nmehie? 50O we si nwanyi ahu, Okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo.

Currently Selected:

LUK 7: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy