YouVersion Logo
Search Icon

ỌLU NDI-OZI 3

3
1Ma Pita na Jọn nārigo n'ulo uku Chineke n'oge hour ekpere, bù oge hour nke-iteghete. 2Anēbute kwa otù nwoke nke dara ngwurọ site n'afọ nne-ya, onye ha nātọb͕ọ kwa-ubọchi na nso ọnu-uzọ ahu nke ulo uku Chineke nke anākpọ Ọnu-uzọ Ọma, iriọ onyinye-ebere n'aka ndi nābà nime ulo uku Chineke; 3onye, mb͕e ọ huru Pita na Jọn ka ha gaje ibà n'ulo uku Chineke, ọ kpe ekpere inata onyinye-ebere. 4Ma Pita, ka ya na Jọn nēlegide ya anya, ọ si, Le ayi anya. 5O we riba ha ama, nēle anya inata ihe n'aka-ha. 6Ma Pita siri, Ọ dighi ọla-ọcha na ọla-edo m'nwere; ma ihe m'nwere, nke ahu ka m'nēnye gi. N'aha Jisus Kraist Onye Nazaret, je ije. 7O we jide ya n'aka-nri, palie ya: ngwa ngwa ukwu-ya abua na nkwonkwo-ukwu-ya we nwe ume. 8O we wulie elu, guzo, je kwa ije; o we so ha ba n'ulo uku Chineke, nēje ije, nāwuli kwa, nēto kwa Chineke. 9Ndi-Ju nile we hu ya ka ọ nēje ije nēto kwa Chineke; 10ha we mata ya, na ọ bu onye ahu nke nọduru n'Ọnu-uzọ-ama Ọma nke ulo uku Chineke inata onyinye-ebere: o we b͕a ha ghari nke-uku, ibobo nwubiga-kwa-ra ha ókè n'aru, n'ihi ihe emeworo ya-ri.
11Ma mb͕e o nējide Pita na Jọn aka, ndi-Ju nile b͕akọrọ n'ebe ha nọ n'ìbà nke anākprọ ìbà Solomon, ibobo nwuru ha n'aru nke-uku. 12Ma mb͕e Pita huru ya, ọ zara ndi-Ju, si, Ndikom nke Israel, gini mere ihe a nēju unu anya? ma-ọbu gini mere unu nēlegide ayi anya, dika ọ bu site n'ike nke aka ayi? ma-ọbu dika ayi onwe-ayi nāsọpuru Chineke ka ayi meworo ya ka ọ je ije? 13Chineke nke Abraham, na nke Aisak, na nke Jekob, Chineke nke nna-ayi-hà, nyere Onye ahu nējere Ya ozi otuto, bù Jisus; Onye unu onwe-unu rara nye, gọnari kwa n'iru Pailat, mb͕e o kpereri ikpè irapu Ya. 14Ma unu onwe-unu gọnariri Onye Nsọ na Onye Ezi Omume ahu, we riọ ka ewere amara nye unu ob͕u-madu, 15unu we b͕ue Onye ahu nke nēdubà madu na ndu; Onye Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie; Onye ayi onwe-ayi bu ndi-àmà-Ya. 16Site kwa n'okwukwe ekwere n'aha-Ya ka aha-Ya nyere nwoke a ume, onye unu nēle anya mata kwa: e, okwukwe ahu nke sitere n'aka-Ya mere ka aru-ya dizu nma n'iru unu nile. 17Ma ub͕u a, umu-nnam, amataram na unu mere ya n'amaghi-ihe, dika ndi-isi-unu me-kwa-ra. 18Ma ihe nile Chineke buru uzọ kwusa site n'ọnu ndi-amuma-Ya nile, na Kraist-Ya gāhu ahuhu, O mezuru ha otù a. 19Ya mere chègharianu, chighari-kwa-nu, ka ewe hichapu nmehie nile unu, ka oge inwe ume ndu we si n'iru Onye-nwe-ayi bia otù a; 20ka O we zite kwa Kraist ahu Onye eburu uzọ rọputara unu, bù Jisus: 21Onye elu-igwe aghaghi inara nke-ọma rue oge agēme ka ihe nile di ka ha di na mbu, bù oge nke Chineke kwuru okwu bayere ha site n'ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ ndi sitere na nmalite oge a. 22Moses kwuru n'ezie, si, Onye-nwe-ayi Chineke gēme ka Onye-amuma, Nke di ka mu onwem, biliere unu site n'etiti umu-nne-unu; Onye ahu ka unu gēge nti n'ihe nile, ka ha ra, bù nke Ọ gāgwa unu. 23Ma ọ gēru, na madu ọ bula, nke nāgaghi-ege nti Onye-amuma ahu, agēkpochapu ya n'etiti ndim. 24E, ndi-amuma nile site na Samuel na ndi soro ya n'azu, ka ha ra, bù ndi kwuru, ha kwusa-kwa-ra okwu banyere ubọchi nda. 25Unu onwe-unu bu umu ndi-amuma, na umu ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Chineke na nna-unu-hà b͕ara, mb͕e Ọ siri Abraham, Ọ bu kwa na Nkpuru-gi ka agāgọzi ab͕uru niile nke uwa. 26Unu bu ndi Chineke buru uzọ were Ya zitere, mb͕e O mere ka O bilie, bù Onye ahu nējere Ya ozi, igọzi unu, n'ichighari unu nile n'otù n'otù ka unu rapu ajọ ihe-unu.

Currently Selected:

ỌLU NDI-OZI 3: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy