YouVersion Logo
Search Icon

ỌLU NDI-OZI 2

2
1Mb͕e ubọchi Pentikọst nēzu okè, ha nile we nọkọ n'otù ebe. 2Na mberede ùzù, dika nke oké ifufe nke nēfesi ike, we site n'elu-igwe, o we juputa ulo ahu dum ebe ha nānọdu ala. 3Ewe me ka ha hu ire, dika nke ọku, nēkesa onwe-ha; o we nọkwasi ha nile n'otù n'otù. 4Ha nile we juputa na Mọ Nsọ, ha we malite ikwu okwu n'asusu di iche, dika Mọ ahu nēnye ha ike ikwuwa okwu.
5Ma ndi-Ju ufọdu bi na Jerusalem, ndi nātu egwu Chineke, ndi si na mba nile di n'okpuru elu-igwe bia. 6Ma mb͕e ùzù ahu putura, ọra madu b͕akọrọ, o we b͕a ha ghari, n'ihi na onye ọ bula n'etiti ha nānu ka ha nēkwu okwu n'asusu nke aka ya. 7Ibobo we nwua ha nile n'aru, o ju-kwa-ra ha anya, ha si, Le, ndia nile ndi nēkwu okwu, hà abughi ndi Galili? 8Àyi onwe-ayi si kwa aṅa nu n'otù n'asusu nke aka ayi, nke amuru ayi nime ya? 9Ndi Patia na ndi Midia na ndi Ilam, na ndi bi na Mesọ-pọtemia, ndi bi kwa nime Judia na Kapa-dọsia, nime Pọntọs na Esia, 10nime Frijia na Pamafilia, nime Ijipt na akuku Libia di Sairini nso, na ndi-ọbìa si na Rom bia, ma ndi-Ju ma ndi nēso uzọ ndi-Ju, 11ndi Krit na ndi Arebia, ayi nānu ka ha nēkwu okwu n'asusu-ayi bayere oké ọlu nile nke Chineke. 12Ibobo we nwua ha nile n'aru, ha nwe-kwa-ra obi abua, nāsirita ibe-ha, Isi ihe a bu gini? 13Ma ndi ọzọ nēme ha ihe-ọchì, si, Ha ṅujuworo manya-vine ọchu afọ.
14Ma Pita guzoro, ya na ndi-ozi iri na otù ahu, we welie olu-ya elu, gwawa ha okwu, si, Ndikom nke Judia, na unu nile ndi bi na Jerusalem, maranu nka, ge-kwa-nu nti n'okwum. 15N'ihi na manya abàghi ndia n'anya, dika unu onwe-unu nēchè; ebe ọ bu oge hour nke-atọ n'ututu; 16kama nka bu nke ekwuworo site n'ọnu Joel onye-amuma, si,
17Ọ gēru kwa na mb͕e ikpe-azu, ka Chineke kwuru,
M'gāwusa ufọdu nime Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu:
Umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma,
Umu-okorọbia-unu gāhu kwa ọhù,
Ndi-okenye-unu gārọ kwa nrọ:
18E, n'aru ndi-orùm ndikom na n'aru ndi-orùm ndinyom
Ka M'gāwusa ufọdu nime Mọ nkem na mb͕e ahu; ha gēbu kwa amuma.
19M'gēnye kwa ọlu-ebube n'elu-igwe di n'elu,
Na ihe-iriba-ama n'elu ala di n'okpuru ya;
Ọbara, na ọku, na alulu anwuru-ọku:
20Anyanwu gāb͕anwe ghọ ọchichiri,
Ọnwa gāb͕anwe kwa ghọ ọbara,
Tutu ubọchi Onye-nwe-ayi abia,
Bú oké ubọchi ahu nke nāputa ìhè:
21O gēru kwa, na onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya.
22Ndikom nke Israel, nurunu okwu ndia: Jisus Onye Nazaret, bú Nwoke Nke Chineke gosiworo unu site n'ọlu di ike na ọlu-ebube na ihe-iriba-ama, nke Chineke mere site n'aka-Ya n'etiti unu, dika unu onwe-unu matara: 23Onye a, ebe ewere Ya nye site n'ìzù akara àkà nke Chineke na ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere n'obe b͕u kwa site n'aka ndi nāmaghi iwu-ayi: 24Onye Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie, mb͕e Ọ tọpusiri ihe-nb͕u nke ọnwu: n'ihi na ọnwu apughi ijide Ya. 25N'ihi na Devid nēkwu okwu bayere Ya, si,
Anamahuri Onye-nwe-ayi n'irum mb͕e nile;
N'ihi na Ọ nọ n'aka-nrim, ka aghara ime ka M'me nkpatu:
26N'ihi nka ọ tọrọ obim utọ, obi nātọ kwa irem utọ nke-uku;
Ọzọ kwa, anu-arum gēbi kwa n'olile-anya:
27N'ihi na I gaghi-arapu nkpuru-obim nime Hedis,
I gaghi-enye kwa Onye nke Gi di ọcha n'obi ka Ọ hu ire-uré.
28I mere ka M'mara uzọ ndu;
I gēji iru-Gi me ka M'juputa n'ọṅù.
29Umu-nnam, o ziri ezi iwere nkwuwa-okwu gwa unu okwu bayere nna uku ayi Devid, na ọ nwuru, eli kwa ya, ílì-ya di kwa n'etiti ayi rue ubọchi ta. 30Ya mere ebe ọ bu onye-amuma, mata kwa na Chineke ṅuru ya-ri iyi, na Ọ gēwere otù Onye nime ndi bu nkpuru si ya n'afọ puta me ka Ọ nọkwasi oche-eze-ya; 31ebe o buru uzọ hu nka a o kwuru okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke Kraist ahu, na arapughi Ya nime Hedis, anu-aru-Ya ahughi kwa ire-uré. 32Jisus nka ka Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie, nke ayi onwe-ayi nile bu ndi-àmà-ya. 33Ya mere, ebe eweliri Ya elu site n'aka-nri Chineke, ebe Ọ nata-kwa-ra n'aka Nna-Ya nkwà ahu, bú Mọ Nsọ, Ọ wusara nka unu onwe-unu nāhu nānu kwa. 34N'ihi na Devid arigoghi n'elu-igwe: ma ya onwe-ya si,
Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim,
35Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi nke ukwu-Gi abua.
36Ya mere ka ulo Israel nile mazue, na Chineke mere Ya ka Ọ buru Onye-nwe-ayi na Kraist-ayi, bú Jisus ahu Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe.
37Ma mb͕e ha nuru nke a, ewe dua ha nime obi-ha, ha we si Pita na ndi-ozi fọduru, Umu-nna-ayi, gini ka ayi gēme? 38Pita we si ha, Chègharianu, ka eme kwa unu nile baptism n'otù n'otù n'aha Jisus Kraist, ka ewe b͕aghara nmehie nile unu; unu gānata kwa onyinye a, bú Mọ Nsọ. 39N'ihi na unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n'ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi Chinike-ayi gākpọtara Onwe-ya. 40O ji kwa ọtutu okwu ọzọ kwusie okwu ike, nāriọ kwa ha, si, Zọputanu onwe-unu n'ọb͕ọ a di nb͕agọ. 41Ya mere ndi nāra okwu-ya nke-ọma, emere ha baptism: n'ubọchi ahu ewe tukwasiri ha ihe ra ka nnù madu asa na ọgu iri. 42Ha we nānọgidesi ike n'ozizí ndi-ozi na nnwekọ, n'inyawa-achicha-ha na ekpere-ha.
43Madu nile we tua egwu n'otù n'otù: eme-kwa-ra ọtutu ọlu-ebube na ihe-iriba-ama site n'aka ndi-ozi. 44Ndi nile ndi kwere na Kraist nọkọ-kwa-ra, ha nwekọ-kwa-ra ihe nile; 45ha we re ihe nile ha natara na ihe nile ha nwere, we kesa ha nye madu nile, dika nkpà diri onye ọ bula. 46Ha ji kwa otù obi nānọgidesi ike n'ulo uku Chineke kwa-ubọchi, ha nānyawa kwa achicha n'ulo-ha, we nara ihe-oriri-ha n'obi utọ na obi nke aghughọ nādighi ya, 47ha nēto Chineke, ihe-ha nātọ kwa ndi-Ju dum utọ. Onye-nwe-ayi nātukwasi-kwa-ra ha kwa-ubọchi ndi anāzọputa.

Currently Selected:

ỌLU NDI-OZI 2: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy