Ịgbagharà Ndị N'emerụ Anyị AhụIhe Nhụchatụ

Ihichapụ Ndekọ Nke Mmejọ
Kwa ụbọchị anyị na-edebe ahụmịhe maka ncheta n'ọdịnihu—n'itunanya ka ọ bụrụ maka ọñụ anyị. Ma mgbe ụfọdụ ihe ọjọọ na-eme nke ná-enwe mmetụta na-adịgide adịgide ná ndụ anyị. Mgbe ụfọdụ nkwarụ na-eme n'ihi nhọrọ adịghị mma nke onye ọzọ. Onye ọkwọ ụgbọ ala bụ́ onye aṅụrụma nwerè ike isi n'ihe mberede ụgbọ ala pụta n'enweghị ihe ọbụla mere ya ma na-ahapụ onye njem ọ kwọrọ n'ime nkwarụ anụ ahụ ma ọ bụ nke uche ná-emetụta dị ka ọ ga agba onye ahụ ara. Mmadụ nwerè ike iweterè ndị ọzọ nsogbu dị ukwuu n’ihi n’akpachapụghị anya ya ma ọ bụ ịchọ ọdịmma naanị nke onwe ya. Olee otú anyị ga-esi malite iche echiche banyere ịgbaghara ụdị ihe ọjọọ ahụ?
Mgbaghara gụnyerè ịkpachara anya hapụ ajọ omume na mmehie nke ndị ọzọ. Ị họrọ ịghara icheta mmejọ nke ndị ọzọ. Abụ Ọma 103:8-12 na-egosipụta nkpachapụ anya Chineke n'igbaghara mmehie. “Ọ gaghị na-ebo anyị ebubo mgbe niile” (ọ bụ ezie na O ruru eru ime otú ahụ), na “O wepụwo mmehie anyị n'ebe dị anya n'ebe anyị nọ dị ka ọwụwa anyanwụ si dị anya n'ebe ọdịda anyanwụ nọ." Nke a bụ ebe dị anya ebighị ebi; ihu abụọ ndịa adịghị ezute. Chineke kpachaarà anya na-ewepụ mmehie anyị n’ihu Ya ma ghara icheta ha ọzọ! Olee otú anyị ga-esi na-eme ụdị ngbaghara mmehie a? Naanị ịhụnanya nke Mmụọ Nsọ nyerè anyị nwerè ike ịgbanwe obi anyị nke ọma ka anyị ghara idebe “ndekọ nke mmejọ ọ bụla” (1 Ndị Kọrịnt 13:5). Ụdị mgbaghara a bụ nke amara Chineke na-eme n’ime obi anyị ma bụrụ nke ezi ịhụnanya maka ndị ọzọ na-akpalite.
Ọ na-esiri anyị ike ịgbaghara ndị ọzọ mgbe anyị na-eche naanị maka ahụhụ na ihe isi ike anyị. Tụlee, kama nke ahụ, otú Chineke si mesoo mmejọ ndị ahụ omume: “N’ihi na otú a ka Chineke si hụ ụwa n’anya: O nyerè Ọkpara Ọ mụrụ naanị Ya, ka ndị niile nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka ha nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16). Ịhụnanya Chineke nwerè n’ebe anyị nọ merè ka O jiri Ọkpara Ya chụọ àjà iji gbaghara anyị mmehie. Ànyị kwesịrị ịgbaghara otú ahụ? Ee! Ma ọ bụghị n'ike nke anyị! Anyị ga na-echeta ihe ndị mere na ndụ anyị. Ụfọdụ ihe anyị na-apụghị 'ichezọ' n'ezie. Mà ànyị nà-edebe “ihe ndekọ” nke ihe ọjọọ ndị ọzọ? Ànyị nà-echeta ma ọ bụ na-atụgharị omume ndị ahu na-adịghị mma mgbe ọ bụla anyị hụrụ onye ahụ?
Mgbaghara nké Chineke adịghị ehichapụ ihe ndị anyị na-echeta, ma ọ na-enye anyị ohere ihichapụ ihe ndekọ nke ihe ọjọọ ma anyị aná ebi n'ime mmekọrịta e weghachiri eweghachi. Ka oge na-aga, na site na Mmụọ Chineke, anyị ga-achọpụta na ịhụnanya anọchiwo echiche ọjọọ anyị banyere, na mmetụta anyị nwerè n’ebe, ndị mejọrọ anyị nọ.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Mà ànyị nà-agabiga mmerụ ahụ nke mmetụta-uche ma ọ bụ mmerụ ahụ nke anụ ahụ, mgbaghara bụ isi nkụme nke ebim ndụ Ndị Nke Kraịst. Jizọs Kraịst nwerè ahụmịhe nke mkpaso àgwà niile n'ezighị ezi na mmeso ọjọọ niile, ọbụnadi ruo n'ókè nke ọnwụ na-ezighị ezi. N'agbanyeghị nke a, na awa ikpeazụ Ya, Ọ gbaghaara onye ohi na-akwa Ya emo nọ n'obe nke ọzọ nakwa ndị gbụrụ Ya.
More