Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịgbagharà Ndị N'emerụ Anyị AhụIhe Nhụchatụ

Forgiving Those Who Wound Us

ỤBỌCHỊ 2 NKE 7

Mbim Ndụ Nke Mgbaghara

Kà Jizọs kụzichara ndị na-eso ụzọ Ya ikpe ekpere, O nyerè ha nghọta-ime dị mkpa banyere otú ha ga-esi na-ejekọ ọnụ n’ụwa a tiwara etiwa. O gosiri ha otú Nna nke eluigwe si ele mmekọrịta ha na ibe ha anya, ma gosi ha ụzọ ha ga-esi na-eje ije n’ìhè nke amara Ya.

Ọ bụghị naanị na Nna anyị na-enye anyị nri anyị na-eri kwa ụbọchị, kamakwa Ọ na-enye ọzụzụ kwa ụbọchị. Mgbaghara mmehie kà Akwụkwọ Nsọ na-ekwu n’ime ebe a bụ maka mkpọkọta ajọ omume niile a n'eme kwa ụbọchị, mmejọ, na ihe mgbu so n'ime nke ibi ndụ okwukwe anyị n’ime ụwa dara ada. Nna anyị na-achọkwa ime anyị ndị na-eso ụzọ nke ndụ a. Ọ bụrụ na obi anyị esisie ike n’ebe ndị ọzọ nọ ma anyị akwụsị ịgbaghara mmehie (n’ihi na ha na-eme anyị ihe mwụte ọtụtụ ugboro), Nna anyị dị mma idobe anyị n’okpuru ntaramahụhụ Ya ruo mgbe anyị mụtara ịgbaghara mmehie. Ọ na-adị obiọma n'irụtụrụ anyị aka maka mpakọ anyị ma na-echetara anyị mmejọ nke anyị.

Ije ije ná mgbaghara pụtara na anyị na-adị ngwa ịkwere na anyị emehiewọ ndị ọzọ ma na-achọ mgbaghara ha ozugbo anyị nwerè ike. Ma, ọ pụtakwara na anyị dị njikere ma dị nkwere ịgbaghara ndị mehiere anyị. A na-eme kà mgbaghara dị otù ahụ kwe omume mgbe anyị tụlere ihe Nna gbagharawororị anyị n'ime Kraịst (Ndị Efesọs 4:32). Mkparị na mmerụ ahụ anyị na-enweta site n'aka ndị ọzọ dị ntakịrị ma e jiri ya tụnyere ahụhụ Kraịst tarà n'ihi mmehiè anyị megiderè Ya.

Ibi ndụ nke mgbaghara na-enyere anyị aka ileghara obere mmejọ anya wee nwee mmekọrịta ndị nwere ike ịkwado esemokwu dị mma maka mmehie dị njọ nke mmadụ. Ụzọ ndụ dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka ịhụ ụwa jupụtara n’ikpe na-ezighị ezi otú Nna anyị si ele ya anya—ụwa nke Onye Nzọpụta dị mkpa. Mgbe ahụ, anyị nwerè ike isonye na nnukwu atụmatụ Ya ịgbapụta ụwa site n'igosipụta eziokwu nke oziọma n'ime ndụ anyị.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Forgiving Those Who Wound Us

Mà ànyị nà-agabiga mmerụ ahụ nke mmetụta-uche ma ọ bụ mmerụ ahụ nke anụ ahụ, mgbaghara bụ isi nkụme nke ebim ndụ Ndị Nke Kraịst. Jizọs Kraịst nwerè ahụmịhe nke mkpaso àgwà niile n'ezighị ezi na mmeso ọjọọ niile, ọbụnadi ruo n'ókè nke ọnwụ na-ezighị ezi. N'agbanyeghị nke a, na awa ikpeazụ Ya, Ọ gbaghaara onye ohi na-akwa Ya emo nọ n'obe nke ọzọ nakwa ndị gbụrụ Ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Joni and Friends, International na Tyndale House Publishers, ndị mepụtara Beyond Suffering Bible, maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ọzi ndị ọzọ, biko gaa na: www.beyondsufferingbible.com/