Ịgbagharà Ndị N'emerụ Anyị AhụIhe Nhụchatụ

“Uwe” Nke Ndị Kraịst
Anyị na-ahụ ndị na-eyi uwe nke ụlọ ọrụ dị iche iche. Ndị na-arụ ọrụ ígwè, ndị na-esi nri, ndị na-eje ozi, ndị ọrụ ụlọ ọgwụ, ndị uwe ojii na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ na-eyi uwe njirimara ọrụ ha. N'ezie, ụlọ ọrụ jupụtara bụ́ ndị dị ná-enye ma n'edebe uwe ọrụ ocha. Ọ̀ dị ihe dị ka “uwe njirimara ọrụ nke Ndị Kraịst”? Ekwuwe, ọ bụghị n'iyi uwe, kama n'ezi nlekọta-anya anyị na ibe anyị! Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume ebe a ka anyị 'yikwasị' onwe anyị uwe, nke na-egosi ebumnobi na nzube. Anyị gà n'eji ejiji kà ibe anyị n’ụzọ á kara aka. Anyị ga-eyiwe onwe anyị ebere, obiọma, ịdị umeala n'obi, ịdị nwayọọ na ndidi. Maka gịnị? Nke a bụ n'ihi na n'okpuru ihe ndị ahu eyikwasịrị, bụ ndị mmadụ nwere mmejọ. Mmejọ ndị ahụ na-abịa n'ụdị dị iche iche. Ya merè, Chineke na-akwadebe anyị site na ndepụta nke àgwà ndị ekwesịrị iji mara Onye Kraịst, ma Ya enyekwa anyị ngwá ọrụ omume dị mkpa iji na-edozi mmejọ ndị ahụ—mgbaghara.
Mgbaghara bụ omume kwa ụbọchị nke ndị kwere ekwe tozuru etozu. Chineke ahọrọla anyị ka anyị bụrụ ndị dị nsọ. Ịdị nsọ pụtara ‘ịbụ ndị edebere iche’ ma ọ bụ ‘ndị raara onwe ha nye’ maka otu nzube—ịdị ka Kraịst. Ka Akwụkwọ Nsọ n'ekwu ebe a, edebere anyị iche igosipụta ịhụnanya Chineke n'ebe ibe anyị nọ. Otú ọ dị, Chineke maarà na anyị niile nwere mmejọ. Chineke na-achị emezighị emezi ndị ahụ, Ọ na-atụkwá anya ka anyị nabata ezughị okè nke ibe anyị! Atụmatụ Chineke bụ iwechapụ ntụpọ dị n'ahụ ndị kwere ekwe (ime ka ha dị nsọ, ime ka ha bụrụ ndị raara onwe ha nye) site na mmekọrịta ha na ibe ha. Mgbe anyị na-agbaghara, anyị na-eme dị ka Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst. Mmejọ anyị, na mmejọ nke ndị ọzọ, na-aghọ ohere iji gosipụta àgwà ọma nke mgbaghara.
Ị̀ dị njikere ikwupụta mmejọ gị (lee Jemis 5:16)? Ị̀ dị njikere iyi uwe nke ebere, obiọma, ịdị umeala n'obi, ịdị nwayọọ, na ndidi? Ị̀ dị njikere ịdị ka Kraịst ná ịgbaghara ndị mejọrọ gị?
Mgbaghara kwesịrị ị bụ akara nkwekọ nke ndị kwere ekwe. N'ezie, anyị na-erite uru nke-onwe site n'ibi ndụ n'usoro mgbaghara. Ma a na-arụkwa ezi ihe ká ukwuu kà anyị na-agbaghara ibe anyị: Chineke na-enwete otuto, ma a na-ebụli Kraịst elu ma mee Ya ka Ọ dị ìhè nye ndị ụwa na-ekiri. Anyị dị ka Kraịst!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Mà ànyị nà-agabiga mmerụ ahụ nke mmetụta-uche ma ọ bụ mmerụ ahụ nke anụ ahụ, mgbaghara bụ isi nkụme nke ebim ndụ Ndị Nke Kraịst. Jizọs Kraịst nwerè ahụmịhe nke mkpaso àgwà niile n'ezighị ezi na mmeso ọjọọ niile, ọbụnadi ruo n'ókè nke ọnwụ na-ezighị ezi. N'agbanyeghị nke a, na awa ikpeazụ Ya, Ọ gbaghaara onye ohi na-akwa Ya emo nọ n'obe nke ọzọ nakwa ndị gbụrụ Ya.
More