Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịgbagharà Ndị N'emerụ Anyị AhụIhe Nhụchatụ

Forgiving Those Who Wound Us

ỤBỌCHỊ 4 NKE 7

Onyinye Nke Mgbaghara

Ọtụtụ n'ime anyị na-ebi n'esemokwu a na-edozibeghị, nkwurịta okwu mebiri emebi, na "okwu" na-aga n'ihu n'etiti onwe anyị na ndị ọzọ. Ma enwere olileanya dị ukwuu! Chineke ahaziela ụlọ ụka ka ọ bụrụ ọgbakọ ndị kwere ekwe ná-ebikọ n’udo. Dika Akwụkwọ Nsọ n'ekwu ebe a, e nyerè ndị kwere ekwe ntụziaka ka ha “dị obiọma . . . dị obi nrọ̀, dị mgbaghara.” Iwu nke enyerè ka adị obiọma na dị obi nrọ̀ ka e kwụsiri ike site na iwu nke enyerè ka agbaghara. Mgbaghara bụ onyinye anyị na-enye ndị ọzọ, ụdị ndụ ịchụ-aja nke anyị na-ahapụ ndị ọzọ na ụgwọ nke mmejọ ha n'ebe anyị nọ. Ebe Chineke nyerè Ọkpara Ya ka Ọ kpuchie mmehie anyị niile, anyị nwerè ike ịgbaghara ndị ọzọ; Chineke akwụọlarị ụgwọ ọnụ ahịa ahụ. Anyị na-enweta onyinye ịchụ-aja nke Chineke n’ime Kraịst mgbe anyị na-agbaghara ndị ọzọ.

Adịghị ahụ ihe mkpali maka nke ọganihu ịhụnanya a n'ime obi onwe anyị. Kama, ihe mkpali a sitere n'aka Chineke na site n'ihe O merè iji gbaghara anyị n'ime Kraịst. A ga-akwụ ụgwọ n'ihi na e meela ezigbo ihe ọjọọ. Otú ọ dị, mgbe anyị na-ahapụ ụgwọ maka mmejọ e merè megide anyị, anyị na-atụkwasị obi na amara Chineke ga-akwụ ụgwọ ahụ. Nke a nwerè mmetụta ntọhapụ na ndụ anyị. Ọ na-edobe anyị inwe nnwere onwe n'ime Kraịst na anyị na ndị ọzọ ịnwe nkwekọ dị ụtọ! Chee nnọọ echiche maka nnwere onwe na ihu ọma anyị ga-enweta ma ọ bụrụ na e ji mgbaghara zuru oke na nke nnwere onwe márá mmekọrịta anyị niile. A na-edobe nkwekọrịta anyị dịka ndị kwere ekwe site n'obiọma, obi dị nrọ̀, na mmekọrịta nke mgbaghara mmehie.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Forgiving Those Who Wound Us

Mà ànyị nà-agabiga mmerụ ahụ nke mmetụta-uche ma ọ bụ mmerụ ahụ nke anụ ahụ, mgbaghara bụ isi nkụme nke ebim ndụ Ndị Nke Kraịst. Jizọs Kraịst nwerè ahụmịhe nke mkpaso àgwà niile n'ezighị ezi na mmeso ọjọọ niile, ọbụnadi ruo n'ókè nke ọnwụ na-ezighị ezi. N'agbanyeghị nke a, na awa ikpeazụ Ya, Ọ gbaghaara onye ohi na-akwa Ya emo nọ n'obe nke ọzọ nakwa ndị gbụrụ Ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Joni and Friends, International na Tyndale House Publishers, ndị mepụtara Beyond Suffering Bible, maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ọzi ndị ọzọ, biko gaa na: www.beyondsufferingbible.com/