Ịgbagharà Ndị N'emerụ Anyị AhụIhe Nhụchatụ

Mweghachí Mmekọrịta
Uche gị ọ ná-atụgharị na ụfọdụ mmekọrịta n'ihi na ha dị ezigbo mgbaji ma na-egbu gị mgbu n'obi?
O nwerè ike isiri mmadụ ike inwe mmụọ ọñụ mgbe uche onye ahụ jupụtara n'ihe ndị n'akpagbu ya. E nwerè mmejọ ndị na-abịa n'etiti anyị na ndị ọzọ nwere ike imebi mmekọrịta anyị na Chineke anyị dị nsọ. Òfùfè anyị kwesịrị ịdị ọcha ma dị enweghị ụta. Mgbaghara anyị n’ime Kraịst emeela ka anyị nwee ike ịbịaru Chineke nso, ma Ọ chọrọ ka anyị dị ka Ọkpara Ya. Jizọs na-akwalite anyị ka anyị na ndị ọzọ 'dighachí' ná mma. Idịghachì ná mma bụ iweghachì mmekọrịta ahụ n'usoro kwesịrị ekwesị. Anyị anaghị enye Kraịst ụgwụ mgbe mmekọrịta anyị adịghị mma. Site ná mgbaghara anyị nwerè ike imezi mmekọrịta anyị ma jiri ime uche dị ọcha bịakwute Chineke n'òfùfè. Ọ bụ ezie na onye nke ọzọ nwerè ike ọ gaghị achọ ka e mee ka anyị na ya dịghachi ná mma, anyị ka ji ụgwọ ime ihe niile anyị nwerè ike ime iji mee ka anyị na ya dịghachi ná mma.
Mgbe anyị na-ebi ndụ otú a, anyị na-asọpụrụ Kraịst, ma òfùfè anyị nà-efe Chineke adị mmepe na dị enweghị ogbachi ọbụla. Ka anyị na-eto ma na-adịkwu ka Kraịst, anyị ga-achọpụta na a pụrụ nnọọ “ileghara” ọtụtụ mmejọ anya. Anyị na-ahọrọ ịghara iwe iwe (lee Ilu 19:11). Anyị na-agbaghara ndị ọzọ, na-aghọta na anyị na ndị ọzọ na-emerụ ibe anyị ahụ́ n’amaghị ama. Nke a bụ nzaghachi amara nye ọtụtụ mmehie, nke nwere ike ịkwụsị esemokwu na-enweghị isi ma gbochie mmekọrịta mebiri emebi. Àgwà ntozu okè dị otú ahụ na-atọhapụ anyị ka anyị na Chineke na ndị ọzọ n'enwe mmekọrịta n'enweghị mgbochi.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Mà ànyị nà-agabiga mmerụ ahụ nke mmetụta-uche ma ọ bụ mmerụ ahụ nke anụ ahụ, mgbaghara bụ isi nkụme nke ebim ndụ Ndị Nke Kraịst. Jizọs Kraịst nwerè ahụmịhe nke mkpaso àgwà niile n'ezighị ezi na mmeso ọjọọ niile, ọbụnadi ruo n'ókè nke ọnwụ na-ezighị ezi. N'agbanyeghị nke a, na awa ikpeazụ Ya, Ọ gbaghaara onye ohi na-akwa Ya emo nọ n'obe nke ọzọ nakwa ndị gbụrụ Ya.
More