Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịgbagharà Ndị N'emerụ Anyị AhụIhe Nhụchatụ

Forgiving Those Who Wound Us

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

Ịma Nma Nke Mgbaghara

Mgbaghara nke Akwụkwọ Nsọ na-ekwu kpọmkwem ma na arụtụsi aka ike banyere mmerụ ahụ nke onwe-onye, n’agbanyeghị otú ha siri mie emi ma ọ bụ otú ha siri dịbà ime n’oge anyị gara aga. Mgbe anyị na eleba anya na mmejọ ndị gara aga, ọ dị mkpa ịkpọ aha mmehie ndị ahụ nke ọma. N'ime otù a, anyị na-achọpụta ma na-ekwupụta ihe bụ nsogbu e kwesịrị ileba anya. N'ime Akwụkwọ Nsọ, okwu ahụ bụ "nkwupụta" pụtara "ikwenye" n'okwu ana-ekwu maka ya. Mgbe anyị kwụpụtara mmehie n'ụzọ ziri ezi, anyị n'ekwete n'ihe Chineke kwuru bụ nsogbu dị n'etiti anyị na ndị ọzọ.

Jekob nyerè ụmụ ya ndikom ezigbo ndụmọdụ; ọ gwara ha kpọmkwem ihe ha ga-ekwu, sị: “Biko, gbaghara ụmụnna gị maka oké ihe ọjọọ ha merè gị—maka mmehie ha n'ikpasi gị àgwà n’ụzọ jọgburu onwe ya.” A pụkwara ịsụgharị okwu ahụ bụ́ “oké ihe ọjọọ” dị ka “ihe rụrụ arụ.” N'oge nkwụpụta, anyị nwerè ike ịdị na-akpa àgwà ka mmehie anyị ma ọ bụ mmehie nke ndị ọzọ ha adịghị njọ otù e si kwesi ile ha anya. Àgwà ụmụnna Josef merè n’ebe ọ nọ bụ nnọọ ihe rụrụ arụ. Josef maarà n'onwe ya otú ajọ omume ha dịrùrù ná njọ. Nke ahụ bụ ibu arọ ụmụnna ya bù n’afọ ahụ niile, ibu arọ nke mere ka ha tụọ Josef egwù nke ukwuu—nke kwesịrị ekwesị! Ikpe marà ha n'ihe ọjọọ ha merè megide nwoke ahụ bụ́ onyeikpe ha ugbu a. N'agbanyeghị nke a, mgbe ha kwụpụtara ihe ọjọọ ha merè, Josef ọ̀ kpara àgwà site n'imeghachikwarà ha ihe ọjọọ karịa? Mba! Josef kwarà akwa! Ọ hụrụ na nzube Chineke nọ n'arụkwa ọrụ site n’omume ọjọọ nke ụmụnna ya. Ya merè, o jiri nwee ike ịgbaghara ma kasie ụmụnna ya obi, meekwa ka ya na ha dịghachi ná mma.

1 Jọn 1:9 kwuru sị, “Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, Ọ dị ikwesị ntụkwasị obi na dị ezi omume ịgbaghara anyị mmehie anyị na ịsachapụ anyị ajọ omume anyị niile.” Leenụ́ ịma mma nke mgbaghara! Mgbaghara pụrụ ịlaghachi azụ na mmejọ ndị miri emi nke ọtụtụ afọ gara aga, ọbụna ịtọhapụ ndị mmadụ n'agbụ nke ibu arọ ha bù kemgbe ha bụ nwata.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Forgiving Those Who Wound Us

Mà ànyị nà-agabiga mmerụ ahụ nke mmetụta-uche ma ọ bụ mmerụ ahụ nke anụ ahụ, mgbaghara bụ isi nkụme nke ebim ndụ Ndị Nke Kraịst. Jizọs Kraịst nwerè ahụmịhe nke mkpaso àgwà niile n'ezighị ezi na mmeso ọjọọ niile, ọbụnadi ruo n'ókè nke ọnwụ na-ezighị ezi. N'agbanyeghị nke a, na awa ikpeazụ Ya, Ọ gbaghaara onye ohi na-akwa Ya emo nọ n'obe nke ọzọ nakwa ndị gbụrụ Ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Joni and Friends, International na Tyndale House Publishers, ndị mepụtara Beyond Suffering Bible, maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ọzi ndị ọzọ, biko gaa na: www.beyondsufferingbible.com/