Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịgbagharà Ndị N'emerụ Anyị AhụIhe Nhụchatụ

Forgiving Those Who Wound Us

ỤBỌCHỊ 5 NKE 7

Ihe Ndabere Nke Mgbaghara

Mgbe ị na-ahụ mmejọ nke ndị ọzọ, gịnị ka ị na-eme?

Ọtụtụ n’ime anyị kà na-ebugharí ọnya ime mmụọ ndị anyị natara n’aka ndị ọzọ. Ndị ahụ merụrụ anyị ahụ́ nwerè ike ịkwu okwu nke n'esighi n'ime obi ha bụ “Ewela iwe” wee gaa n'ihu. Ma eleghị anya, ha merè ka à ga-asị na ọ dịghị ihe na-emerụ ahụ merenụ. Ọ̀ nà-esiri gị ike ichefu ihe ndị a arụtụrụ aka? Ị̀ nà-ezere ndị mejọrọ gị? N'aka nke ọzọ, ikekwe ndị ọzọ agbanarịgo gị n'ihi ihe ọjọọ i merè ha.

N'ilu a, Jizọs kpọrọ ohu ahụ onye ọjọọ n'ihi na, mgbe ọ natasịrị mgbaghara, ọ zaghachighị n'ụdị esi meere ya. Kama nke ahụ, o ji ọkwa dị elu jide ndị ji ya ụgwọ karịa ka osi jide onwe ya. Ka anyị na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ a, obi anyị na-eti mkpu n'asi, “Ezighi ezi!” Anyị na-ahụ ikpe ya na-ezighị ezi nke ọma: ya bụ́ ohu kwesịrị ịgbaghara ndị ji ya ụgwọ.

Anyị na-amata ma chọọ izi ezi n’ihi amara niile nke Chineke na-enye anyị. Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi ndị ọzọ omume ná mmejọ ha? Akwụkwọ Nsọ na-adọ anyị aka ná ntị n'ebe a banyere iburu enweghị mgbaghara n'ime obi anyị. N’ebe a, anyị na-ahụ kpọmkwem otú Chineke chọrọ ka anyị si meghachi ndị ọzọ omume n'omume ojọọ ha—Ọ na-atụ anya ka anyị gbaghara. N'ihi gịnị ka Chineke ji tụọ anya nke a? Atụmanya Ya dabeere n'ịhụnanya mgbaghara Ya n'ebe anyị nọ. Anyị na-ejikarị ọkwa dị iche na-ekpe ndị ọzọ ikpe karịa ka anyị si ekpe onwe anyị ikpe.

Anyị na-ahụ mmehie ndị ọzọ n’ebe anyị nọ dị ka ihe dị njọ karịa ajọ omume anyị, ma ọ bụ anyị na-atụ anya ka ha mee ebere karịa ka anyị onwe anyị dị njikere ime. Àgwà dị otú ahụ n'ebe anyị nọ bụ ihe Chineke machibidoro iwu. Kama, Ọ chọrọ ka anyị cheta ebere Ya ma mee otú Ọ si anyị mee. N'ikpeazụ, mmehie anyị merè ndị ọzọ bụ mmehie megide Chineke. O kere onye ọ bụla n’ime anyị ma chọọ ka anyị na-ahụ ibe anyị ka ndị bara ezigbote uru nke ego n'enweghị ike izụtanwụ, ọbụnadị itinye mkpa nke ndị ọzọ n'ihu tupu anyị emebe nke anyị (Ndị Filipaị 2: 1-4). O doziwo n'ụzọ doro anya ụdị mgbaghara anyị kwesiri ịdị n'eme—onyinye nke nzọpụta nke anyị.

Kedụ kà ị ga-esi gbanwee? Depụta ụfọdụ ụzọ Chineke si gbaghara gị. Tulee n'uche gị nnukwu ịhụnanya Chineke nwerè n'ebe i nọ: n'ime Kraist ka O nyerè ụzọ nke adịghị akwu ụgwọ ka eji gbaghara gị, ọbụnadị na ị juru Ya (Ndị Rọm 5:8). Malite ịgbaghara ndị ọzọ, ná abụghị dabere na mmetụta, kama dabere na onyinye nke akwụghi ụgwọ na nke ebere nke Chineke nyere gị.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Forgiving Those Who Wound Us

Mà ànyị nà-agabiga mmerụ ahụ nke mmetụta-uche ma ọ bụ mmerụ ahụ nke anụ ahụ, mgbaghara bụ isi nkụme nke ebim ndụ Ndị Nke Kraịst. Jizọs Kraịst nwerè ahụmịhe nke mkpaso àgwà niile n'ezighị ezi na mmeso ọjọọ niile, ọbụnadi ruo n'ókè nke ọnwụ na-ezighị ezi. N'agbanyeghị nke a, na awa ikpeazụ Ya, Ọ gbaghaara onye ohi na-akwa Ya emo nọ n'obe nke ọzọ nakwa ndị gbụrụ Ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Joni and Friends, International na Tyndale House Publishers, ndị mepụtara Beyond Suffering Bible, maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ọzi ndị ọzọ, biko gaa na: www.beyondsufferingbible.com/