Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịnọdụ̀ Jụụ N'oké Nkịtị: Ụbọchị Asaa Nke Ịnọ N'eme Nchere N'ime Nkwa ChinekeIhe Nhụchatụ

Sitting in the Still: 7 Days to Waiting Inside of God’s Promise

ỤBỌCHỊ 7 NKE 7

ỤBỌCHỊ NKE ASAA

ỊNỌDỤ̀ JỤỤ N'OKÉ NKỊTỊ: NNÁRÁ IKIKE ISI N'IHE MGBU PỤỌ

Gịnị na-eme mgbe “ebe jụụ gị ahụ ịnọ” enweghị udo ka o kwesịrị? Kedụ ihe na-eme mgbe i n'enweghị ike ịpụ n'ebe n'adịghị mma? Ma ọ̀ bụ̀ alụmdi na nwunye gbará ụká, ọrụ na-adịghị enye gị obi ụtọ, ọbụbụenyi i na-achọghị, nsogbu ụmụaka, ma ọ bụ mmejọ siteré n'ebe i na-eje ụka. Ihe ndị a niile bụ ọnwụnwa anyị na-agabiga ma ọnwụnwa ndị Chineke achọghị ka anyị ji ọsọ wee gbapụ na ha.

Ọtụtụ n’ime anyị na-agabiga ọnwụnwa, anyị chọkwarà ịgbanarị ha ozugbo. Mana, Chineke anaghị ekwe ka anyị mee otù ahụ mgbe niile. Ọbụna n'ime ọnwụnwa ndị ahụ, anyị enweghị ikike ịpụ. Anyị gà-ekpe ekpere ma chere ka Chineke jiri ntụzịaka Ya za anyị. Mgbe Chineke azaghị, nke ahụ abụghị ikike na ohere nye anyị isi n'ime ọnwụnwa ndị ahụ gbapụ.

Ọ dịghị onye n'ime anyị nwere mmasị ita ahụhụ nke mere na anyị na-achọ ma n'echè ka Chineke kwapụ anyị ozugbo n'ime ọnwụnwa ndị ahụ ma ha bịa. Ọ bụ uche anyị na Chineke anọghị n'ebe ndị ahụ n'ara ahụ, mana ọ bụ ebe ndị ahụ ka anyị kachasị ahụ ma n'ezute Ya. Oge ndị m kacha dị Chineke nso bụ̀ n'ebe ndị ahụ n'ara ahụ m nọgiderè na ha wee na-achọsi ihu Chineke ike, jiri obi m niile. Ee, anyị pụrụ isi na ọnwụnwa ahụ anyị na-agabiga gbapụ site ịhapụ ndị ụka ahụ, mmekọrịta ahụ ma ọ bụ ọrụ ahụ n'adịghị mma, mana anyị mee otù ahụ, anyị pụrụ ifunahù ngwaọrụ dị anyị mkpa maka ọdịnihu anyị.

Ọ bụrụ na Chineke ekwuwo nkwa n'ime ndụ gị. Cheta na e nwerè ngwaọrụ gasị dị mkpa ka i nweta iji mejupụta na rụpụta nkwa ahụ. Ọ bụrụ na gị enwee ndidi na ngabiga ọnwụnwa na nrụgide, i gà-apụta ju eju na bàrá àbàrá n'akụkụ nke ọzọ nke ahụmịhe ndị ahụ. Kwe ka Chineke kụnye n'ime gị ihe ndị dị mkpa iji mezuo nkwa gị. Nọrọ jụụ ruo mgbe Chineke gà-eduzi gị. Ọ bụrụ na ị nọ n'ebe na-adịghị mma na-echere nduzi Chineke, nọgide n'ekpe ekpere ma dị nkwesị ntụkwasị obi nye Chineke, na-atụ anya n'ụzọ dị ike na Ọ gà-adọpụta gị n'oge Ya.

Kà anyị na-abịa na njedebe atụmatụ ihe ọgụgụ a, n'agbanyeghị "ebe dị jụụ" Chineke merè ka i nọrọ, kwe onwe gị nkwa na i gà-anọsị ike ebe ahụ wee chere olu Ya. Echegbulà onwe gị, adabalà n'aka olu nke na-abụghị nke Ya, adaberekwalà ná nghọta gị, n’ihi na, mgbe oge rurù, Ọ gà-ekwu okwu.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Sitting in the Still: 7 Days to Waiting Inside of God’s Promise

Enwerè oge anyị n'anata nkwa n'aka Chineke, mana anyị anaghị ahụ ndụ anyị ka ọ dabarà na nkwa ahụ Chineke kwerè anyị. Ma ọ bụ̀ na e nwerè oge anyị na-eru n'okporo ụzọ chéré ihu n'ọtụtụ ebe na ndụ anyị, anyị a n'eche ka Chineke kwubie okwu ntụzịaka n'ime ndụ anyị, mana nke ahụ emeghị. Ihe òfùfè a nke ụbọchị asaa gà-agwa obi gị okwu gbasara otù ị gà-esi n'eme ihe n'uche Chineke mgbe ọ dị ka Chineke Ọ gbachirì nkịtị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Jessica Hardrick maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://jessicahardrick.com/