Ịnọdụ̀ Jụụ N'oké Nkịtị: Ụbọchị Asaa Nke Ịnọ N'eme Nchere N'ime Nkwa ChinekeIhe Nhụchatụ

ỤBỌCHỊ NKE ANỌ
ỊNỌDỤ̀ JỤỤ N'OKÉ NKỊTỊ: N'IME UCHE CHINEKE
Ọtụtụ n’ime anyị na-echè na ihe niile kwesịrị ịrụ ọrụ nke ọma ọ bụrụ na anyị na-eme uche Chineke. Ọ dịghị mgbe Chineke kwerè anyị nkwa ụzọ ịdị harịị. Otú ọ dị, Ọ na-ekwe nkwa na Ya gà-anọnyere anyị ma debe anyị n'ime uche Ya. Kà anyị na-aga n’ụzọ Chineke, ọtụtụ n’ime anyị nà-agbarù ihu n'ihi mmegide na-abịakwute anyị n’ihi na anyị na-atụ anya na Chineke gà-eme ihe nile otú masịrị anyị. Ozugbo nrụgide nke mbụ nke ahụ erughị ala dakwasịrị anyị, anyị na-amalite inwe obi abụọ banyere olu Chineke na Uche Ya maka ndụ anyị.
Mgbe ụfọdụ, anyị n'enwe ahụ erughị ala na nsogbu dị iche iche n'ihi anyị si n'oge Chineke pụọ, mana mgbe ụfọdụ, ha na-abịa n'ihi ha so bụrụ uche Chineke maka anyị. Mgbe anyị na-erube isi n’olu Chineke, obere ihe mgbochi-ụzọ ndị a nà-akụziri anyị ma n'ewusi anyị ike mgbe anyị nọ n’ebe kasị dị nchebe anyị pụrụ ịnọ; n'ime Uche Chineke.
Ọ bụrụ na anyị elee anya n’otu n’ime akụkọ kacha mma Akwụkwọ Nsọ kwurù banyere ịdị n’ime uche Chineke, anyị gà-elebà anya na njem Josef na Meri merè iji mupụta Ọkpara Chineke n’ụwa a. Ka ha na-achọ ebe a gà-amụ nwa Chineke, ọ gà-abụrịrị na ha kperè ekpere ma rịọ Chineke ka O duo ha ma nye ha ebe pụrụ iche maka ọmụmụ Jizọs. Mgbe ekpere ha yirì kà azaghị ya, m nà-echè mà hà cherè na Chineke agbahapụla ha n’ime nkwa ahụ O kwerè ha. Ọ gà-abụ na oge ahụ obi abụọ banyere nkwa Chineke kwerè ha bara ha n'ime uche ruo nwa mgbe; ọtụtụ n'ime anyị gà-enwekwa ụdị echiche ahụ. Ọbụna n'ụdị ihe a cherè ha ihu, Josef na Meri garà n’ihu n’okwukwe; ha ahapụghị ihe ha kwesịrị ime nanị n’ihi na ọ dịghị ka nkwa ahụ ha nataworò.
Ọ bụrụ na ị na-eje ije n’ụzọ n'adịghị ka nke Chineke kwesịrị isi wee mee ka nkwa Ya mezuo na ndụ gị, nọgide na-ekpe ekpere ma n'atụkwasị Chineke obi, ọbụna na "ebe ndị ahụ dị jụụ". Adalà mbà ma ọ bụ nwee obi abụọ banyere nzube Chineke na ndụ gị n'ihi na ọ na-emejupụta n'uche Ya, ọ bụghị uche nke gị. Kpee ekpere taa maka “ebe jụụ gị ị ká dị,” kwe nkwa na i gà-emeghari ahụ ma ọ bụ zọpụ ije naanị n'ime Uche Ya na naanị kà Uche Ya si wee tụọ.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Enwerè oge anyị n'anata nkwa n'aka Chineke, mana anyị anaghị ahụ ndụ anyị ka ọ dabarà na nkwa ahụ Chineke kwerè anyị. Ma ọ bụ̀ na e nwerè oge anyị na-eru n'okporo ụzọ chéré ihu n'ọtụtụ ebe na ndụ anyị, anyị a n'eche ka Chineke kwubie okwu ntụzịaka n'ime ndụ anyị, mana nke ahụ emeghị. Ihe òfùfè a nke ụbọchị asaa gà-agwa obi gị okwu gbasara otù ị gà-esi n'eme ihe n'uche Chineke mgbe ọ dị ka Chineke Ọ gbachirì nkịtị.
More