Ịnọdụ̀ Jụụ N'oké Nkịtị: Ụbọchị Asaa Nke Ịnọ N'eme Nchere N'ime Nkwa ChinekeIhe Nhụchatụ

ỤBỌCHỊ NKE MBỤ
INỌDỤ JỤỤ N'OKÉ NKỊTỊ: N'EBE GASỊ Ọ DỊ KA AZỊZA ADỊGHỊ
Ka anyị nà-amalite, anyị ga-eleba anya n'otu onye natara nkwa Chineke nke ọma tupu ha enwee ike ịnụ ụtọ ya. Akụkọ banyere Sera na Ebraham na-enye m ntachi obi na-aga n'ihu mgbe ọ dị m ka nkwa gasị Chineke kwerè m dị anya na mmezù.
Chineke na-enyekarị anyị nkwa ndị ahụ tupu Ya enye usoro anyị ga-esi rute na habụ nkwa. Chineke gwara Sera na ọ ga-amụ nwa n’agadi ya, ma Chineke agwaghị ya afọ ole ọ ga-adị tupu ya amụọ yabụ nwa. Chineke arịọghịkwa Sera ka o nyere Ya aka imezu nkwa O kwere ya. Ka oge na-aga, Sera na Ebraham ahụghị ma ọ bụ nụ ihe ọ bụla sitere n’aka Chineke gbasara nkwa ahụ O kwere ha. Ha maliterè iche na Chineke chọrọ enyemaka ha iji mezuo nkwa O kwere ha. Ugboro ole ka anyị kpara àgwà ka ha?
Chineke na-enye anyị ebe anyị na-eje tupu O nye anyị ntuziaka maka irute ebe ahụ. Ị lee anya, ọ bụ iji nye anyị olileanya, kà anyị na-anọdụ ala n'ebe ndị ọ na-adị ka ọ dịghị ihe na-eme. Ụdị ebe ndị ahụ dị mkpa n'ihi na ọ bụ ebe ndị ahụ ka a na-egosipụta ma na-ewusi okwukwe anyị ike. Anyị na-amụta ihe site na ngabiga anyị gasị, n'amụta nrubeisi, ndidi, na ntachi obi n'ebe ndị ahụ dị jụụ anyị nọ n'echere Chineke.
Ọ dị oke mkpa ka anyị nọgide n'ikwesị ntụkwasị obi n'ebe gasị ndị ahụ dị jụụ kama ịgbalị ime ka usoro nche anyị dị ngwa ngwa site n'ime ihe ọbụla iji nyere Chineke aka ka nkwa Ya bịa na mmezu na ndụ anyị. Anyị ekwesịghịkwa ime mkpebi n’ụzọ mmetụta-uche, ma ọ bụ gaa n’ihu n’ihe anyị cherè na Chineke ga-achọ ka anyị mee.
N’ebe ndị dị òtù ahụ anyị nọ, ka anyị na-amụta ịmata olu Chineke, na ịdị jụụ. Ọ bụrụ na anyị agaa n'ihu mee ihe n’anụghị Chineke, anyị nwere ike imebi nkwa Chineke kwere anyị ma ọ bụ mee ka oge o ji abịa na mmezu tee aka. Sera na Ebraham kpebirì ime ihe ná anụghị Chineke. Ha efunaghị nkwa Chineke kwere ha, mana ha gbakwunyerè nsogbu n'adịghị mkpa na ndụ ha ma na ndụ ndị ozo.
Ọtụtụ oge, n'ihi ọchịchọ anyị irute nkwa Chineke kwerè anyị ngwa ngwa, anyị na-ekpebi inyere Chineke aka dịka Ebraham na Sera, n'etinye nsogbu n'ekwesịghị ịdị ebe ahụ na nkwa ọma Chineke kwere anyị. Emebilà nkwa Chineke kwerè gị site n'ịjụ ichere Chineke n'ebe ndị ahụ dị jụụ. Kwe ka Chineke rụchaa ọrụ Ya n'ime gị. Nweta ihe niile Chineke nwerè maka gị site n'inwe obi ụtọ naanị na njigide nkwa Ya. Esila ebe ahụ pụọ, enwela obi abụọ, emela mkpesa, ma ọ bụ mee atụmatụ ọbụla nke uche gị, naanị nọrọ jụụ wee chere. Atụmatụ Chineke n'aga n'ihu maka mmezù nkwa Ya gasị na ndụ gị.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Enwerè oge anyị n'anata nkwa n'aka Chineke, mana anyị anaghị ahụ ndụ anyị ka ọ dabarà na nkwa ahụ Chineke kwerè anyị. Ma ọ bụ̀ na e nwerè oge anyị na-eru n'okporo ụzọ chéré ihu n'ọtụtụ ebe na ndụ anyị, anyị a n'eche ka Chineke kwubie okwu ntụzịaka n'ime ndụ anyị, mana nke ahụ emeghị. Ihe òfùfè a nke ụbọchị asaa gà-agwa obi gị okwu gbasara otù ị gà-esi n'eme ihe n'uche Chineke mgbe ọ dị ka Chineke Ọ gbachirì nkịtị.
More