Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịnọdụ̀ Jụụ N'oké Nkịtị: Ụbọchị Asaa Nke Ịnọ N'eme Nchere N'ime Nkwa ChinekeIhe Nhụchatụ

Sitting in the Still: 7 Days to Waiting Inside of God’s Promise

ỤBỌCHỊ 6 NKE 7

ỤBỌCHỊ NKE ISII

ỊNỌDỤ̀ JỤỤ N'OKÉ NKỊTỊ: IFUNAHÙ NZUBE CHI MAKA NDỤ

N’Agba Ochie, anyị na-ahụ Sọl ná-emé ihe n'aka ya mgbe Samuel abịakwuteghị ya n'oge e nyerè ya ka ọ bịa. Kama ichere Chineke, Sọl nupụụrụ Chineke isi wee funahụ Alaeze ya dum.

Ihe Chineke si anyị mee nwerè ike ịdị ka ò sigburù onwe ya n'ike n'ihi na ọtụtụ mgbe ọ na-adị ka Ọ hapụrụ̀ anyị ka anyị nọrọ naanị anyị. Mana, oge ndị ahụ na-abụkarị oge Ọ na-anwale nrubeisi na ikwesị ntụkwasị obi anyị. Ka anyị na-achọ ma na-echere olu Chineke, anyị kwesịrị ịmụta ịnọdụ ala n'okporo ụzọ ndụ anyị, agaghị aka ekpe ma ọ bụ aka nri, ruo mgbe Chineke ga-agwa anyị ebe anyị gà-aga. Dị ka anyị na-ahụ n’ebe Sọl nọ, nke a dị oké mkpa! Ịgá n'ihu enweghị nduzi Chineke pụrụ imebi nkwa ahụ O kwerè anyị. Ọ pụkwarà ime ka anyị laa ọtụtụ afọ nke ndụ anyị n'iyi ebe anyị na-awagharị na mpụga nke nzube Chineke maka ndụ anyị.

Sọl bụ onye ndú, ọtụtụ ndị dabeerè na nduzi ya; mà mmejọ na njehie ya gà-eduhiekwa ọtụtụ ndị. Ịnọ n'okpuru nrụgide nke ndị ọgbọ anyị na ndị ọzọ ná-ekwú okwu uche ha banyere ndụ anyị pụkwarà ịkpata njehie anyị. Nke a nwedịrị ike ime ka anyị funahú ịnụ olu Chineke ma Ọ n'ekwu okwu ma ọ bụ gaa n'ihu anụghị n'ọnụ Chineke.

Ekwerè m na Chineke chọrọ ka anyị bie ndụ mara mma, Ọ na-ezitekwa nkwa Ya na ndụ anyị iji hụ na anyị dị ndụ, ndụ O zuberè, ndụ nke na-emetụ ndị ọzọ aka ọma ma na-agọzi anyị. Mana mgbe anyị na-agbaso ntụziaka anyị ma ọ bụ ntụziaka nke ndị ọzọ, anyị na-efunahú ihe Chineke nwerè maka anyị.

Ee, a gà-enwe oge mgbe anyị na-agaghị anụ n'ọnụ Chineke ma ọ bụ nweta azịza ozugbo sitere n'aka Ya, mana efunahụlà nzube Chineke nwerè maka gị site n'ịgbaso ntụziaka gị ma ọ bụ ntụziaka nke ndị ọzọ. Gosi na ịbụ onye-kwesịrị-ntụkwasị-obi, atụrụ nke ga-agbaso naanị olu Onye n'azụ ya ka atụrụ. Ọ bụrụ na ị na-echere mmezù nkwa Chineke na ndụ gị mana mkpọtụ dị gị gburugburu ekweghị ka inwe ezumike ma ọ bụ n'adachi gị ntị, chọta "ebe dị jụụ" iji mee nchere, ebe Chineke nwere ike ikwu okwu mgbe Ọ dị njikere. Kwe Chineke nkwa taa na ị gaghị emeghari ma ọ bụ zọpụ ije anụghị n'olu Ya.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Sitting in the Still: 7 Days to Waiting Inside of God’s Promise

Enwerè oge anyị n'anata nkwa n'aka Chineke, mana anyị anaghị ahụ ndụ anyị ka ọ dabarà na nkwa ahụ Chineke kwerè anyị. Ma ọ bụ̀ na e nwerè oge anyị na-eru n'okporo ụzọ chéré ihu n'ọtụtụ ebe na ndụ anyị, anyị a n'eche ka Chineke kwubie okwu ntụzịaka n'ime ndụ anyị, mana nke ahụ emeghị. Ihe òfùfè a nke ụbọchị asaa gà-agwa obi gị okwu gbasara otù ị gà-esi n'eme ihe n'uche Chineke mgbe ọ dị ka Chineke Ọ gbachirì nkịtị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Jessica Hardrick maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://jessicahardrick.com/