Ịnọdụ̀ Jụụ N'oké Nkịtị: Ụbọchị Asaa Nke Ịnọ N'eme Nchere N'ime Nkwa ChinekeIhe Nhụchatụ

ỤBỌCHỊ NKE ATỌ
ỊNỌDỤ̀ JỤỤ N'OKÉ NKỊTỊ: CHINEKE NỌ EBE A
Ọtụtụ n’ime anyị abanyela n’ọnọdụ ihe ya nyiri omume. Ebe anyị na-apụghị ịhụ ụzọ mgbapụ. Mà ànyị nwetarà nchọpụta ahụ́ ike n'adịghị mma, nchụpụ n'ọrụ, ma ọ bụ ọnwụ nke onye anyị hụrụ n’anya, ọ pụrụ isi ike ịhụ ma ọ bụ chọta Chineke n’oge ndị a. Oge ndị a bụ oge ọ na-adị anyị ka anyị nọ n'ọ́nyà, ebe ọ na-adị anyị ka akwagiderè azụ anyị na mgbidi ma ọ dịghị ụzọ ọbụla dịnụ anyị nwere ike isi gbapụ.
N’ime Akwụkwọ Nsọ, anyị na-ahụ kà Jekọb na-eme mgbapụ ọsọ n'ọnọdụ o kerè. E lekwasị anya n’omume ya, mmadụ nwere ike ịsị na Jekọb erughị eru inweta ihu ọma Chineke n’ebe ọ nọ, dị ka ọ bụụrụ onye aghụghọ, ọbụna ihe ụfọdụ ga-akpọ onye n'adịghị eme ihe n’eziokwu. Eji m n’aka na Jekọb cherè na Chineke anọghị ya nso ma ọ bụ duru ya n'aga njem ya. Ka Jekob dina n'ala n'ebe mmadụ na anụmanụ n'adịghị, enweghị olileanya, ma n'agba ọsọ n'ihi ihe ọjọọ niile o merè, Chineke bịakwutere ya. N'ime ọgbaghara niile ahụ dapụtara n'aka Jekọb, eji m n'aka na ọ tụghị anya izute Chineke n'ebe ahụ ọ tọgbọ. Ma ọbụna n'ime ọnọdụ ọjọọ ya, Chineke bịakwuterè ya wee si n'ime nro kasie ya obi ma nye ya nkwenye siri ike nke ọnịnọ Ya ọbụna n'oge ndụ ya kachasị gbaa itirì.
Tupu nleta a sitere n’aka Chineke, o gaarà adị Jekọb ka ọ nọ naanị ya, ụjọ gakwarà atụ ya, ya adịkwa ya ka ya furù efu. O nwekwarà ike ichè na o nweghị uru ịrịọ Chineke maka enyemaka ma ọ bụ amara. Dị nnọọ ka Jekọb, anyị na ewezụga onwe anyị n'ebe Chineke nọ mgbe anyị n'echè na anyị erughị eru ma ọ bụ na Chineke mejọrọ anyị. Oziọma dịnụ bụ̀ na n'agbanyeghị oge ndụ ma ọ bụ ọnọdụ anyị kachasị gbaa itirì, Chineke adịghị ahapụ anyị, ọbụna mgbe ọ dị ka Ọ gbachiri nkịtị n'ihe gasị nke ndụ anyị.
Ozugbo Jekọb chọpụtara na Chineke kà nọnyeere ya, o nwerè obi ike ịga n’ihu n’ụzọ ya, ebe ọ ma na Chineke gà-eso ya wee chebe ya. Nke a nwere ike ịbụ mmalite nke mmekọrịta ya na Chineke. O nwerè ike ịbụ na Jekọb maarà banyere Chineke site na mmekọrịta nna ya na Chineke ma ọ ka gà-enweta ma guzobe mmekọrịta nke ya onwe ya na Chineke. Site n'etiti na ngabiga esemokwu na oge ọgbaghara, n'oge dị jụụ, ọ chọtara ezi mmekọrịta ya na Chineke.
Ọ bụrụ na ị nọ ụbọchị taa n'ọnọdụ dị gị ka ihe n'ekweghị omume, wepụta oge kwụsịtụ, kpee ekpere, chọọkwa Chineke n’ebe ahụ ị nọ, Ọ nọ n’ebe ahụ. N'agbanyeghị na o nwerè ike ọdịghị azịza ị ga-anụ ngwa ngwa n'olu ma ọ bụ n'aka Chineke, gaa n'ihu n'achọ Ya, Ọ nọ n'ebe ahụ, ma n'oge Ya, Ọ ga-ekpughe Onwe Ya gosi gị. Chineke adịghị ahapụ anyị, Ọ nọkwa na-echere anyị ka anyị nabata òkù Ya ka anyị na Ya mee njeghari nke ndụ. Dị nnọọ ka Jekọb ghọtarà na ọ dị ya mkpa ịga n'ihu nà Chineke ma n'eje ije nà nchebe Ya, Chineke na-echere anyị ime otu ihe ahụ n'ọnọdụ anyị. Ị̀ gà-anabata ọkpụkpọ-òkù Ya?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Enwerè oge anyị n'anata nkwa n'aka Chineke, mana anyị anaghị ahụ ndụ anyị ka ọ dabarà na nkwa ahụ Chineke kwerè anyị. Ma ọ bụ̀ na e nwerè oge anyị na-eru n'okporo ụzọ chéré ihu n'ọtụtụ ebe na ndụ anyị, anyị a n'eche ka Chineke kwubie okwu ntụzịaka n'ime ndụ anyị, mana nke ahụ emeghị. Ihe òfùfè a nke ụbọchị asaa gà-agwa obi gị okwu gbasara otù ị gà-esi n'eme ihe n'uche Chineke mgbe ọ dị ka Chineke Ọ gbachirì nkịtị.
More