Ịnọdụ̀ Jụụ N'oké Nkịtị: Ụbọchị Asaa Nke Ịnọ N'eme Nchere N'ime Nkwa ChinekeIhe Nhụchatụ

ỤBỌCHỊ NKE ABỤỌ
ỊNỌDỤ JỤỤ N'OKÉ NKỊTỊ: IHE Ị GA-EME, MGBE CHINEKE GBACHIRÌ NKỊTỊ.
E nweela oge m nụrụ kà Chineke na-ekwu okwu, mechaa m banye n'ọnọdụ na-echere ntụziaka Ya ọzọ, ma anụghị m ihe ọbụla n'ọnụ Ya ruo ogologo oge. E nwekwarà oge mgbe Chineke kwerè m nkwa, ọ bịa na mmezù tupu m nwee ohere inomi ya n'uche m ma ọ bụ dị njikere ịnabata ya. E nwere nzube maka oge ndị dị otú a na oge ndị o werelà ọtụtụ afọ ka m wee banye n'ime nkwa Chineke kwerè makà ndụ m.
Echetara m oge m ka n'eto eto ma abanyebeghị m na alụmdi na nwunye. Ọ dịghị onye n'akụ aka n'ụzọ m n'oge a, a tọgbọrọ m chakọọ n'enweghị mmasị ma mmekọrịta onye ọbụla. Amaarà m na e burù amụma alụmdi na nwunye n'isi m ọtụtụ afọ gara aga, ya merè m ji jigidesie nkwa ahụ ike n'obi m, buru ya n'eje ma n'eme ihe ọ bụla m n'eme. Ọ dịghị mgbe m nwerè obi abụọ banyere atụmatụ Chineke maka ndụ m, mana a tọrọ m anya n'ala wee n'achọ nkwa a Chineke kwerè m. Mgbe ụfọdụ, m na-atụ egwu nke ukwuu na m ga-efunahu uche Chineke maka ndụ m site n'okpúkpá na mmekọrịta m n'adịghị enwe. M na-echegbu onwe m na o nwere ike bụrụ na m chụpụrụ onye n'arịọ m alụmdi na nwunye ngwa ngwa, ọbụna na ọ dị m ka onye ahụ ọ dịghị mma maka m. Achọghị ifunahù nkwa Chineke maka ndụ m, ya merè m jiri gaa n'ihu n'ike n'eme ọchịchọ n'ime ngbachi nkịtị Ya.
Ama m na ọtụtụ nhọrọ ndị m merè n'oge ahụ iji "nyere Chineke aka" merè ka mmezù nkwa Chineke maka m nọọ ogologo oge karịa ka o kwesịrị. Emerè m nhọrọ nke mere ka m nweta obi mgbawa karịa ka Chineke zuberè maka m na njem a. Dị ka Sera, echere m na enyemaka m dị Chineke mkpa. Kama inweta ahụmahụ zuru ezu nke “ebe ndị ahụ dị jụụ” Chineke deberè m, agbalịrị m inyere Chineke aka ma mee ka ụzọ nkwa ahụ si abịa ná mmezù dị osiiso.
N'ileghachi anya azụ, ahụrụ m ebe “ebe ndị ahụ dị jụụ gasị” kwadeberè m maka ebe m nọ ugbu a. Ebe ndị ahụ dị jụụ kụziiri m okwukwe na ntachi obi ma mee ka m nweta ihe ụfọdụ m kwesịrị ịgafe iji ruo ebe m nọ ugbu a. Anọ m na alụmdi na nwunye afọ asaa ugbu a, ma n'ime obi m, amaarà m na ebe a bụ ebe Chineke karà akà nye m.
Gịnị ka ị na-eme n'etiti oge nke Chineke itinye nkwa Ya n'ime obi gị ma ọ bụ ikwusa ya n'elu ndụ gị na gị ịbanyezì n'ezie n'ime ya? Ị gà akwụsịtụ. Ị gà akwado. Ị gà echere. Ị gà-ekwe ka Chineke rụọ ọrụ site n'ime gị pụta ezi gị. Chineke maarà ihe ndị ga-adị gị mkpa maka ebe ị na-aga, ekwenyere m na ọ bụ "ebe ndị ahụ dị jụụ" ka Ọ na-akwado gị. Anyị n'echè na Chineke echefuola anyị, mana ọ bụ n'oge ndị ahụ dị jụụ ka Ọ n'arụ ọrụ Ya kacha mkpa maka anyị.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Enwerè oge anyị n'anata nkwa n'aka Chineke, mana anyị anaghị ahụ ndụ anyị ka ọ dabarà na nkwa ahụ Chineke kwerè anyị. Ma ọ bụ̀ na e nwerè oge anyị na-eru n'okporo ụzọ chéré ihu n'ọtụtụ ebe na ndụ anyị, anyị a n'eche ka Chineke kwubie okwu ntụzịaka n'ime ndụ anyị, mana nke ahụ emeghị. Ihe òfùfè a nke ụbọchị asaa gà-agwa obi gị okwu gbasara otù ị gà-esi n'eme ihe n'uche Chineke mgbe ọ dị ka Chineke Ọ gbachirì nkịtị.
More