Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịnọdụ̀ Jụụ N'oké Nkịtị: Ụbọchị Asaa Nke Ịnọ N'eme Nchere N'ime Nkwa ChinekeIhe Nhụchatụ

Sitting in the Still: 7 Days to Waiting Inside of God’s Promise

ỤBỌCHỊ 5 NKE 7

ỤBỌCHỊ NKE ISE

ỊNỌDỤ̀ JỤỤ N'OKÉ NKỊTỊ: INÁ ECHERÉ NZUBE

E terè Devid mmanụ ịbụ eze n’agbata afọ 16-19, mana ọ dị afọ 30 tupu ya enwee ike ịchị Izrel. N’agbata afọ 23 na 30, Devid gabigarà ntaramahụhụ iwe eze Sọl na ọtụtụ ihe isi ike ndị ọzọ, ma ọ nọgidere n'ikwesị ntụkwasị obi ma chere nzube Chineke kwerè ya ná nkwa.

N’alaeze Chineke, anyị adịghị enweta ihe anyị chọrọ mgbe niile, ma ọ bụ̀ mgbe anyị chọrọ ya. Ime nchere bụ akụkụ dị mkpa nke ndụ a kpọrọ anyị ka anyị na-etolite n'ime Kraịst. Ime nchere na-akwadebe anyị maka nzube, na-ewusi okwukwe anyị ike, ma na-akụziri anyị nnọgidesi ike.

Chineke maarà na dị ka Eze, nkà, ntachi obi, na ihe ọmụma gà-adị Devid mkpa iji n'eme ndú nke ọma. E kwerè m na Chineke nyerè Devid ma tinye n'ime ya ọtụtụ ihe ndị dị ya mkpa iji chịa ọchịchị ka eze n'ime afọ ndị ahụ ọ nọ n'ata ahụhụ ma n'eme nchere.

Ọ gà-adịkwa mkpa ka e mee gị njikere maka nzube e kenyerè ndụ gị. Ọ bụ ezie na ị nwerè ike ịdị njikere ịbanye n'ime ọkpụkpọ òkù gị, mana Chineke maarà ihe ọkpụkpọ gị gụnyerè, ya merè tinye okwukwe gị na Ya. Mgbe ị na-echè na Chineke akpọwo gị maka ihe ma ị ghọtaghị ihe kpatara na oge gị erubeghị, cheta na O nwerè ike na-azụ gị dị ka Ọ zụrụ Devid. Na-erube isi, dị nkwesị ntụkwasị obi, nwee ndidi, na bụrụ onye a hụrụ na-arụsi ọrụ ike tupu nzube ndụ gị ahụ abịa. Chineke mgbe nile nwerè atụmatụ ka mma karịa nke anyị nwerè; kpee ekpere taa ka obi gị dị nyefe nye atụmatụ Ya ahụ na Uche Ya Zuru Oke.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Sitting in the Still: 7 Days to Waiting Inside of God’s Promise

Enwerè oge anyị n'anata nkwa n'aka Chineke, mana anyị anaghị ahụ ndụ anyị ka ọ dabarà na nkwa ahụ Chineke kwerè anyị. Ma ọ bụ̀ na e nwerè oge anyị na-eru n'okporo ụzọ chéré ihu n'ọtụtụ ebe na ndụ anyị, anyị a n'eche ka Chineke kwubie okwu ntụzịaka n'ime ndụ anyị, mana nke ahụ emeghị. Ihe òfùfè a nke ụbọchị asaa gà-agwa obi gị okwu gbasara otù ị gà-esi n'eme ihe n'uche Chineke mgbe ọ dị ka Chineke Ọ gbachirì nkịtị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Jessica Hardrick maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://jessicahardrick.com/